Ụzọ Isi Zụọ Akọ na Uche Gị
“AKỌ na uche dị ọcha bụ ohiri isi kasị mma.” Okwu a meworo ochie na-emesi otu eziokwu dị mkpa ike: Mgbe anyị ṅara akọ na uche anyị ntị, anyị na-enwe udo nke ime na ịdị jụụ.
Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile na-ahọrọ ime otú ahụ. Adolf Hitler kwupụtara na ya nwere ike ịtọhapụ mmadụ site ná nchepụta efu, ma ọ bụ ihe ahụ na-eduhie eduhie, nke na-eweda n’ala, nke a maara dị ka akọ na uche. Ọchịchị ya nke ime ihe ike na-egositụ n’ụzọ na-akụda mmụọ otú ndị mmadụ dịruru obi ọjọọ mgbe ha jụrụ akọ na uche ha. N’ezie, ọtụtụ ndị omempụ na-eme ihe ike dịkwa njọ otú ahụ—bụ́ ndị na-edina mmadụ n’ike ma na-egbu ọchụ n’enweghị mmetụta ọ bụla. Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-eme ihe ndị a bụ ụmụaka. N’ihi ya akwụkwọ nke na-amụ ihe ịtụnanya a bu isiokwu nta bụ́ Children Without a Conscience.
Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ihe ka n’ọtụtụ mmadụ ga-eche echiche ime mpụ dị oké njọ, ọtụtụ enweghị nsogbu ọ bụla banyere inwe mmekọahụ rụrụ arụ, ịtụ asị, ma ọ bụ ịghọ aghụghọ. Ụkpụrụ omume na-adakpọ n’ụwa nile. N’izo aka n’oké ndapụ n’ezi ofufe ahụ, Pọl onyeozi dere na ụfọdụ ndị Kraịst ga-ekwenye na mmetụta nke ụwa, wee si otú a bụrụ “ndị e ji ígwè ọkụ daa ha n’akọ na uche nke aka ha.” (1 Timoti 4:2) Iyi egwu nke ịkpa àgwà na-ezighị ezi ka ọbụna ukwuu taa na “mgbe ikpeazụ” ndị a. (2 Timoti 3:1) Ya mere, ndị Kraịst aghaghị ijisi ike chebe akọ na uche ha. Anyị pụrụ ime nke a site n’ịzụlite ya.
Uche, Obi, na Akọ na Uche Gị
Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ana m ekwu eziokwu n’ime Kraịst, ekwughị m okwu ụgha, akọ na uche m na-esokwa m gbaa àmà n’ime Mmụọ Nsọ.” (Ndị Rom 9:1) Ya mere akọ na uche pụrụ ịbụ ihe na-agba àmà. Ọ pụrụ inyocha ụzọ e si akpa àgwà, kwadookwa ma ọ bụ katọọ ya. Onye Okike anyị etinyewo n’ime anyị ihe dị ukwuu n’echiche anyị nke ezi ihe na ihe ọjọọ. Ma, a pụrụ ịkpụzi ma zụọ akọ na uche anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’anyị inweta ezi ihe ọmụma site n’Okwu Chineke. “Ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè,” ka Pọl onyeozi na-ekwu. (Ndị Rom 12:2) Ka ị na-akụnye echiche na uche Chineke n’ime uche gị, akọ na uche gị na-amalite na-arụ ọrụ n’ụzọ Chineke karị.
Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde gburugburu ụwa aka ‘ịmara Jehova Chineke na Jisọs Kraịst.’ (Jọn 17:3) Site ná ndokwa ọmụmụ Bible ebe obibi ha na-eduzi n’efu, ha na-akụziri ndị obi ha ziri ezi ụkpụrụ Jehova Chineke banyere mmekọahụ, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, alụmdi na nwunye, mmekọrịta azụmahịa, na ọtụtụ isiokwu ndị ozọ.a (Ilu 11:1; Mak 10:6-12; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Efesọs 5:28-33) Inweta “mmazu” nke a bụ nzọụkwụ dị mkpa n’ịzụlite akọ na uche ndị Chineke. (Ndị Filipaị 1:9) N’ezie, ọbụna mgbe onye Kraịst nwetasịrị nghọta tozuru okè nke Bible, ọ ghaghị ịga n’ihu na-azụ uche ya n’Okwu Chineke mgbe nile ma ọ bụrụ na akọ na uche ya ga-anọgide na-arụ ọrụ nke ọma.—Abụ Ọma 1:1-3.
Bible na-ejikọkwa akọ na uche na obi ihe atụ ahụ, bụ́ nke na-agụnye echiche na mmetụta uche anyị. (Ndị Rom 2:15) Uche na obi aghaghị ịrụkọ ọrụ ma ọ bụrụ na akọ na uche ga-arụ ọrụ nke ọma. Nke ahụ pụtara ime ihe karịrị itinye ihe ọmụma n’uche gị. Ị ghaghịkwa ịkpụzi obi gị—mmetụta, ọchịchọ, na mmasị dị gị n’ime. Akwụkwọ Ilu si otú a jiri ụdị okwu ndị dị ka “wezụga obi gị,” “tụkwasị obi gị,” na ‘mee ka obi gị gazie agazie’ mee ihe. (Ilu 2:2; 23:19; 27:23) Otu ụzọ a ga-eji mee nke ahụ bụ site n’ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ. “M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi,” ka Abụ Ọma 77:12 na-ekwu. Ịtụgharị uche na-enyere anyị aka iru mmetụta na ebumnobi anyị ndị kasị zoo ezo.
Dị ka ihe atụ, were ya na i nwere àgwà na-adịghị ọcha dị ka ịbụ onye ụtaba riri ahụ. Dị ka ihe ka n’ọtụtụ mmadụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị maara nke ọma ihe ize ndụ ahụ ike ya. Ma, n’agbanyeghị agbamume nke ndị enyi na ezinụlọ, o siworo gị ike ịkwụsị ya. Olee otú ịtụgharị uche n’ozi Bible pụrụ isi wusie akọ na uche gị ike n’akụkụ a?
Dị ka ihe atụ, gbalịa ịtụgharị uche n’okwu Pọl onyeozi dị ná 2 Ndị Kọrint 7:1: “Ya mere ndị m hụrụ n’anya, ebe anyị nwere nkwa ndị a, ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke.” Ghọta okwu ndị a. Jụọ onwe gị, ‘Gịnị nnọọ bụ “nkwa ndị a” nke Pọl zoro aka na ha?’ Site n’ịgụ ihe ndị gbara ya gburugburu, ị ga-ahụ na amaokwu ndị bu ya ụzọ na-asị: “Sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, ka Onyenwe anyị kwuru, Unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu, bụrụkwa unu Nna, unu onwe unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ka Onyenwe anyị kwuru, Nke pụrụ ime ihe nile.”—2 Ndị Kọrint 6:17, 18.
Iwu Pọl nyere ‘ịsachapụ n’onwe anyị mmerụ nile’ na-enwekwu ike ugbu a! Dị ka ihe mkpali dị ike iji mee nke ahụ, Chineke na-ekwe nkwa ‘ịkpọbata anyị,’ ya bụ, ido anyị n’okpuru nlekọta nchebe ya. ‘M̀ ga-esoro ya nwee mmekọrịta chiri anya—dị ka nke nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị na-enwe n’ebe nna ya nọ?’ ka ị pụrụ ịjụ onwe gị. Ọ̀ bụ na echiche nke ịbụ onye Chineke na-ahụ n’anya, nke nwere amamihe ‘kpọbatara’ ma ọ bụ hụrụ n’anya adịghị adọrọ mmasị nke ukwuu? Ọ bụrụ na o yiri ka ị ghọtaghị echiche ahụ, lee otú ndị bụ́ nna na-ahụ n’anya si egosipụta ịhụnanya na mmetụta ịhụnanya n’ebe ụmụ ha nọ. Ugbu a cheedị echiche banyere ụdị nkekọ dị otú ahụ ịdị n’etiti gị na Jehova! Ka ị na-atụgharịkwu uche na ya, otú ahụ ka ọchịchọ maka ụdị mmekọrịta ahụ na-etowanye.
Ma rịba ama: Ịbịa Chineke nso n’ụzọ chiri anya ga-ekwe omume nanị ma ọ bụrụ na i ‘metụghị ihe na-adịghị ọcha aka.’ Jụọ onwe gị: ‘Ọ̀ bụ na ụtaba iri m ahụ esoghị “n’ihe na-adịghị ọcha” ndị Chineke katọrọ? Iji ya eme ihe ọ̀ ga-abụ “mmerụ nile nke ahụ,” na-ekpughe m nye ụdị nile nke ihe ize ndụ ahụ ike? Ebe Jehova bụ Chineke dị ọcha, ma ọ bụ “dị nsọ,” ọ̀ ga-akwado mụ ịma ụma na-emerụ onwe m n’ụzọ dị otú a?’ (1 Pita 1:15, 16) Rịba ama na Pọl dọkwara aka ná ntị megide ‘imerụ mmụọ mmadụ,’ ma ọ bụ echiche uche. Jụọ onwe gị: ‘Ihe iri ahụ a ọ̀ na-achị echiche m? M̀ ga-eme ihe ọ bụla iji mezuo ọchịchọ m, ikekwe na-etinye ahụ ike m, ezinụlọ m, ma ọ bụ ọbụna nguzo m n’ebe Chineke nọ n’ihe ize ndụ? Ruo ókè ha aṅaa ka m kweworo ka mụ ịbụ onye ụtaba riri ahụ mebie ndụ m?’ Iche ajụjụ ndị a na-enye nsogbu n’obi ihu pụrụ nnọọ inye gị obi ike ịkwụsị ya!
N’ezie, enyemaka na nkwado ndị ọzọ pụrụ ịdị gị mkpa iji merie ụtaba. N’agbanyeghị nke ahụ, ịtụgharị uche na Bible pụrụ ime ihe dị ukwuu iji zụọ ma wusie akọ na uche gị ike ka i wee nwere onwe gị pụọ n’ihe iri ahụ.
Mgbe Anyị Mere Ihe Na-ezighị Ezi
N’agbanyeghị mgbalị anyị nile ime ihe ziri ezi, mgbe ụfọdụ ezughị okè anyị na-emeri anyị, anyị na-emehiekwa. Mgbe ahụ akọ na uche anyị ga-enye anyị nsogbu, ma a pụrụ ịnwa anyị ịgbalị ileghara ya anya. Ma ọ bụ anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ nke ukwuu nke na anyị ga-ahapụ itinye mgbalị ọ bụla ijere Chineke ozi. Otú ọ dị, cheta ọnọdụ Eze Devid. Mgbe o sosịrị Bat-sheba kwaa iko, akọ na uche ya tiri ya ihe. Ọ na-akọwa mmekpa ahụ o nwere, sị: “Ehihie na abalị aka Gị dị arọ n’ahụ m: ume m gbanwere n’ihe ịkpọ nkụ nke ụgụrụ.” (Abụ Ọma 32:4) Ọ̀ na-egbu mgbu? Ee! Ma mwute a dị ka Chineke chọrọ kpaliri Devid ichegharị ma bụrụ onye e mere ka ya na Chineke dịghachi ná mma. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 7:10.) Arịrịọ dị mwute Devid rịọrọ maka mgbaghara na-enye ihe àmà buru ibu nke ezi nchegharị ya. N’ihi na o mere ihe kwekọrọ n’akọ na uche ya, e nyeere Devid aka ịgbanwe ma mesịa nwetaghachi ọṅụ ya.—Abụ Ọma 51.
Otu ihe ahụ pụrụ ime taa. Ụfọdụ sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible n’oge gara aga ma kwụsị mgbe ha mụtara na ndụ ha ekwekọghị n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Chineke. Ikekwe ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha bi n’alụghị di na nwunye ma ọ bụ ha bụ ohu nke àgwà ndị na-adịghị ọcha. Akọ na uche ha nyere ha nsogbu!
Ọ bụrụ na ị nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ, tụlee okwu nke Pita onyeozi n’ụbọchị Pentikọst. Mgbe o kpughere mmehie nke ndị Juu ibe ya, “e wee dụọ ha n’ime obi ha.” Kama ịda mbà, ha ṅara ntị na ndụmọdụ Pita ka ha chegharịa, ha nwetakwara ihu ọma Chineke. (Ọrụ 2:37-41) Ị pụrụ ime otu ihe ahụ! Kama ịhapụ eziokwu ahụ n’ihi na akọ na uche gị na-enye gị nsogbu, kwee ka akọ na uche gị kpalie gị ‘ichegharị ma chigharịa.’ (Ọrụ 3:19) Site ná mkpebisi ike na mgbalị, ị pụrụ ime mgbanwe ndị a chọrọ iji nweta ihu ọma Chineke.
‘Nwee Ezi Akọ na Uche’
Ma ị ka na-amalite ịmụ ụzọ Jehova ma ọ bụ na i nwewo ọtụtụ afọ nke ahụmahụ dị ka onye Kraịst tozuru okè, ndụmọdụ Pita kwesịrị ekwesị: ‘Nwee ezi akọ na uche.’ (1 Pita 3:16) Ọ bụ ihe bara uru, ọ bụghị ibu arọ. Zụọ ya site n’iji amamihe dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-azụ uche na obi gị. Ṅaa ntị n’akọ na uche gị mgbe ọ na-adọ gị aka ná ntị. Nwee udo nke uche dị n’ime nke mmadụ irubere akọ na uche ya isi pụrụ iweta.
N’ụzọ a pụrụ ikweta, ịzụ na ịkpụzi akọ na uche gị abụghị ọrụ dị mfe. Otú ọ dị, ị pụrụ ikpegara Jehova Chineke ekpere inyere gị aka. Site n’enyemaka ya, ị ga-enwe ike ijere Chineke ozi site ‘n’ezi akọ na uche na okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya.’—1 Timoti 1:5.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nwere onwe gị ịkpọtụrụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ degara ndị na-ebipụta magazin nke a akwụkwọ ma ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inwe ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.
[Foto dị na peeji nke 6]
Ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịzụ akọ na uche anyị