Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 8 p. 11
  • Ụmụ Izrel Banyere n’Ala Kenan

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Izrel Banyere n’Ala Kenan
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • E ‘Sitere n’Ọrụ Ya Kpọọ Ya Onye Ezi Omume’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Rehab Ezobe Ndị Nledo
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ihe Jọshụa Chetara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 8 p. 11

Nkebi nke 8

Ụmụ Izrel Banyere n’Ala Kenan

Jọshụa bụ onye ndú ụmụ Izrel mgbe ha meriri Kenan. Jehova nyere ndị ikpe ike ịnapụta ndị ya n’aka ndị na-emegbu ha

ỌTỤTỤ narị afọ tupu ụmụ Izrel abanye n’ala Kenan, Jehova kwere nkwa inye ụmụ Ebreham ala ahụ. Mgbe Jọshụa bụ onye ndú ụmụ Izrel, ha jikeere ịbanye n’Ala Nkwa ahụ.

Chineke kpebiri na e kwesịrị ibibi ndị Kenan. Ha mere ka mmekọahụ rụrụ arụ na mwụfu ọbara jupụta ala ahụ. N’ihi ya, a ga-ebibi obodo ndị Kenan niile ụmụ Izrel meriri.

Ma tupu ụmụ Izrel abanye n’ala ahụ, Jọshụa zipụrụ mmadụ abụọ ka ha gaa lee otú ọ dị. Ha gara n’obodo Jeriko ma nọrọ n’ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Rehab. N’agbanyeghị na ọ ma na ndị nledo ahụ bụ ndị Izrel, ọ kpọbatara ha n’ụlọ ya ma chebe ha. Rehab nwere okwukwe na Chineke ndị Izrel n’ihi na ọ nụrụ ihe dị iche iche Jehova mere iji chebe ndị ya. Rehab mere ka ndị nledo ahụ ṅụọrọ ya iyi na a gaghị egbu ya na ndị ezinụlọ ya.

Mgbe ụmụ Izrel mechara banye n’ala Kenan ma gaa ibuso Jeriko agha, Jehova rụrụ ọrụ ebube, mgbidi Jeriko adaa. Ndị agha Jọshụa banyere n’obodo ahụ ma bibie ya. Ma, ha egbughị Rehab na ndị ezinụlọ ya. Mgbe ndị agha Jọshụa lụrụ agha afọ isii n’ezughị ike, Jọshụa meriri ọtụtụ obodo dị n’Ala Nkwa ahụ. E mechara keere ebo dị iche iche nke Izrel ala ndị ahụ.

Mgbe ọ fọrọ obere ka Jọshụa jechaa ozi ya, ọ kpọkọtara ụmụ Izrel. O chetaara ha ihe Jehova meere ndị nna nna ha ma gbaa ha ume ife Jehova. Ma mgbe Jọshụa na ndị okenye ha na ya jekọrọ ozi nwụchara, ụmụ Izrel hapụrụ Jehova fewe chi ụgha. Ruo ihe dị ka narị afọ atọ, o nweghị mgbe mba ahụ fere naanị Jehova. N’oge ahụ, Jehova kwere ka ndị Filistia na ndị ọzọ bụ́ ndị iro ndị Izrel na-emegbu ha. Ma mgbe ọ bụla ụmụ Izrel kpọkuru Jehova ka o nyere ha aka, ọ họpụtaara ha ndị ikpe ka ha napụta ha. Ndị ikpe niile ahụ dị iri na abụọ.

N’akwụkwọ Ndị Ikpe, e dere banyere oge e nwere ndị ikpe n’Izrel, malite n’onye nke mbụ bụ́ Ọtniel ruo n’onye ikpeazụ bụ́ Samsịn, nke bụ́ nwoke kacha ike e nwetụrụla. Otu eziokwu dị mkpa onye na-agụ akụkọ ndị na-atọ ụtọ e dere n’akwụkwọ Ndị Ikpe ga-aghọta nke ọma bụ na irubere Jehova isi na-eweta ngọzi, ma inupụrụ ya isi na-akpata nsogbu.

—O si na Jọshụa; Ndị Ikpe; Levitikọs 18:24, 25.

◼ Gịnị mere Jehova egbughị Rehab na ndị ezinụlọ ya?

◼ Olee ihe ụmụ Izrel mere mgbe Jọshụa nwụchara?

◼ Olee eziokwu dị mkpa onye na-agụ akwụkwọ Ndị Ikpe ga-aghọta?

Chaatị dị na peeji nke 11]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa ●

Ndị Ikpe ●

Rut

1 Samuel

2 Samuel

1 Ndị Eze

2 Ndị Eze

1 Ihe E Mere

2 Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Aịzaya

[Map dị na peeji nke 11]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

← Ebe ha si banye n’ala Kenan

− − Ebe ndị mbụ ụmụ Izrel meriri

FINISHIA

FILISTIA

KENAN

Jeriko

Jeruselem

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya