Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 18 p. 21
  • Jizọs Rụrụ Ọrụ Ebube

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Rụrụ Ọrụ Ebube
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Ebube Jizọs—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Kraịst Ike nke Chineke”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Ọrụ Ebube Ndị Jizọs Rụrụ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ọrụ Ebube—Ihe Ndị Mere Eme Ka Hà Bụ Akụkọ Ifo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 18 p. 21

Nkebi nke 18

Jizọs Rụrụ Ọrụ Ebube

Jizọs ji ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosi ihe ọ ga-eji ike ya mee mgbe ọ ga-abụ Eze

CHINEKE nyere Jizọs ike ime ihe ndị mmadụ ọzọ na-enweghị ike ime. Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube. Ọ rụrụ ọtụtụ n’ime ha n’ihu ìgwè mmadụ dị iche iche. Ọrụ ebube ndị ahụ gosiri na ike Jizọs karịrị nke ndị iro ya nakwa na ọ ga-akwụsịli nsogbu ndị ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwebeghị ike ịkwụsị. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.

O nyere ndị mmadụ nri na mmanya. Ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ bụ ime ka mmiri ghọọ mmanya dị mma. Ugboro abụọ ka o ji naanị ogbe achịcha ole na ole na azụ̀ ole na ole zụọ ìgwè mmadụ ruru ọtụtụ puku. Ha niile rijuru afọ ma rifọ nri ahụ.

Ọ gwọrọ ọrịa. Jizọs gwọrọ “ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla ndị mmadụ nwere.” (Matiu 4:23) Jizọs gwọrọ ndị kpuru ìsì, ndị ntị chiri, ndị ekpenta, ndị akwụkwụ, ndị ngwọrọ nakwa ndị nwere nkwarụ. Ọ dịghị ụdị ọrịa ọ bụla na-ekweghị ya ngwọta.

O mere ka oké ifufe dajụọ. Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwọọrọ ụgbọ na-agafe n’Oké Osimiri Galili, oké ifufe malitere ife. Ụjọ jidere ndị na-eso ụzọ ya. Naanị ihe Jizọs mere bụ ile ifufe ahụ anya ma kwuo, sị: “Shịị! Daa jụụ!” Ebe niile wee daa jụụ. (Mak 4:37-39) N’oge ọzọ, o jere ije n’elu mmiri mgbe ajọ ifufe na-efe.—Matiu 14:24-33.

Ọ chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ. Ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị iro Chineke. Ha ka ndị mmadụ ike. Ọtụtụ ndị enwebeghị ike ime ka ndị mmụọ ọjọọ hapụ ha aka. Ma, ọtụtụ mgbe, Jizọs chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ, mee ka ha hapụ ndị ha ji. Ọ tụghị ndị mmụọ ọjọọ ụjọ, kama ọ bụ ha tụrụ ya ụjọ n’ihi na ha ma na e nyere ya ikike.

Ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ. Baịbụl kpọrọ ọnwụ “onye iro ikpeazụ.” O kwesịrị ekwesị n’ihi na ọnwụ bụ onye iro mmadụ ọ bụla na-enweghị ike imeri. (1 Kọrịnt 15:26) Ma Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ. Ọ kpọliteere otu nwaanyị di ya nwụrụ nwa ya nwoke, kpọlitekwara nne na nna na-eru uju nwa ha nwaanyị. Nke kacha pụọ iche bụ mgbe Jizọs kpọlitere ezigbo enyi ya bụ Lazarọs n’ọnwụ n’ihu ìgwè mmadụ nọ na-eru uju ọnwụ ya, ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka o ruo abalị anọ Lazarọs nwụrụ! Ọbụna ndị kacha bụrụ ndị iro Jizọs kwetara na ọ rụrụ ọrụ ebube ahụ.—Jọn 11:38-48; 12:9-11.

Gịnị mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube ahụ niile ebe ọ bụ na ndị ahụ niile o nyeere aka mechara nwụọ? Ọrụ ebube Jizọs bara ezigbo uru. O gosiri na amụma ndị na-enye obi ụtọ e buru banyere ọchịchị Eze Mesaya ga-emezucha. Anyị ekwesịghị inwe obi abụọ ma Eze Chineke họpụtara ọ̀ ga-enwe ike iwepụ ụkọ nri, ọrịa, ajọ ifufe, ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ ọnwụ. O gosila na Chineke nyere ya ike ime ihe ndị a niile.

—O si n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn.

◼ Olee otú Jizọs si gosi na ọ ga-ewepụli ụkọ nri, ọrịa, ajọ ifufe, ndị mmụọ ọjọọ, na ọnwụ?

◼ Gịnị ka ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-egosi banyere ọchịchị ọ ga-achị ụwa n’ọdịnihu?

Chaatị dị na peeji nke 21]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

Jona

Maịka

Nehọm

Habakọk

Zefanaya

Hagaị

Zekaraya

Malakaị

Matiu ●

Mak ●

Luk ●

Jọn ●

Ọrụ Ndịozi

Ndị Rom

1 Ndị Kọrịnt

2 Ndị Kọrịnt

Ndị Galeshia

Ndị Efesọs

Ndị Filipaị

Ndị Kọlọsi

1 Ndị Tesalonaịka

2 Ndị Tesalonaịka

1 Timoti

2 Timoti

Taịtọs

Faịlimọn

Ndị Hibru

Jems

1 Pita

2 Pita

1 Jọn

2 Jọn

3 Jọn

Jud

Mkpughe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya