Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ll akụkụ 8 p. 18-19
  • Olee Uru Ọnwụ Jizọs Baara Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Uru Ọnwụ Jizọs Baara Gị?
  • Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkebi nke 8
    Gee Chineke Ntị
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
ll akụkụ 8 p. 18-19

NKEBI NKE 8

Olee Uru Ọnwụ Jizọs Baara Gị?

Jizọs nwụrụ ka anyị wee dị ndụ. Jọn 3:16

Ebe ụmụ nwaanyị na-ele anya n’ebe e liri Jizọs ma ha ahụghị ya

Mgbe Jizọs nwụrụ, ụbọchị atọ agaa, ụfọdụ ụmụ nwaanyị gara n’ili ya, ma ha ahụghị ozu ya. Jehova akpọlitela Jizọs n’ọnwụ.

Ebe Jizọs pụtara ìhè n’ihu ndị na-eso ụzọ ya, mechaa laghachi eluigwe

Jizọs mechara mee ka ndị ozi ya hụ ya.

N’eziokwu, Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ka ọ ghọọ mmụọ dị ike, nke na-anaghị anwụ anwụ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ ya mgbe ọ na-alaghachi n’eluigwe.

  • Gịnị bụ “ụgwọ ọrụ” nke mmehie?—Ndị Rom 6:23.

  • Ọ bụ Jizọs ka anyị ga-esi n’aka ya nweta ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 5:21.

Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ma chie ya Eze nke Alaeze Chineke. Daniel 7:13, 14

Ebe Jizọs nọ n’ocheze ya dị n’eluigwe na-achị ụmụ mmadụ nọ na paradaịs

Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà ka ọ gbapụta ụmụ mmadụ. (Matiu 20:28) Chineke ji àjà ahụ Jizọs chụrụ mee ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi.

Jehova mere ka Jizọs bụrụ Eze ga-achị ụwa. Ndị ga-eso Jizọs chịa bụ otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. A ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha gaa biri n’eluigwe. Ọ bụ ha na Jizọs ga-achị n’Alaeze Chineke. Alaeze Chineke bụ ọchịchị ezi omume nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa.—Mkpughe 14:1-3.

Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Agha, mpụ, ịda ogbenye, na agụụ agaghị adịkwa. Ndị mmadụ ga-enwe ezigbo obi ụtọ.—Abụ Ọma 145:16.

  • Olee ihe ọma Alaeze Chineke ga-emere anyị?—Abụ Ọma 72.

  • Anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa.—Matiu 6:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya