Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fg ihe ọmụmụ 11 ajụjụ 1-4
  • Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?
  • Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ụkpụrụ Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ịghọta Ụkpụrụ Ya Na-egosi Ntozu Okè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ụkpụrụ Chineke Pụrụ Ịbara Gị Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
fg ihe ọmụmụ 11 ajụjụ 1-4

ISI NKE 11

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

1. Gịnị mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị?

Ebe a na-eme ihe Baịbụl kwuru: Nne na-eke nwa ya belt n’oche ụgbọala; nna na nwa ya ebe ha kpu okpu ígwè na-agba ígwè; nwaanyị dị ime na onye na-arụ ọrụ

Olee otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi enyere anyị aka ịkpachara anya mgbe niile?—ABỤ ỌMA 36:9.

Chineke ma ihe karịa anyị n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya, ihe banyere anyị na-emetụkwa ya n’obi. Ihe ọzọ bụ na o nweghị mgbe ọ chọrọ ka anyị na-eduzi onwe anyị. (Jeremaya 10:23) Anyị kwesịrị ịgakwuru ya ka o duzie anyị otú ahụ nwata kwesịrị ịgakwuru nna ya na nne ya ka ha duzie ya. (Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụ Chineke nyere iwu ndị dị na Baịbụl, o jikwa ha na-eduzi anyị.​—Gụọ 2 Timoti 3:16.

Jehova ji iwu niile o nyere anyị na-akụziri anyị otú ka mma anyị ga-esi na-ebi ndụ ugbu a. Ha na-akụzikwara anyị ihe anyị ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. Ebe ọ bụ Chineke kere anyị, anyị kwesịrị irubere ya isi.​—Gụọ Abụ Ọma 19:7, 11; Mkpughe 4:11.

2. Olee otú Okwu Chineke si eduzi anyị?

Na Baịbụl, o nwere ebe ụfọdụ Chineke nyere iwu, kwuo hoo haa ihe anyị ga-eme. (Diuterọnọmi 22:8) E nwekwara ihe ụfọdụ Chineke kwuru bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịma ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Ọ bụzi anyịnwa ga-eji ikike iche echiche anyị mara ihe anyị kwesịrị ime dabere n’ihe ahụ o kwuru. (Ilu 2:10-12) Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ndụ bụ onyinye Chineke nyere anyị. Ọ bụrụ na anyị echeta ihe a o kwuru, ọ ga-eme ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-emerụ ma anyịnwa ma ndị ọzọ ahụ́.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:28.

3. Olee iwu abụọ kacha mkpa?

Jizọs kwuru iwu abụọ kacha mkpa. Nke mbụ mere ka anyị ghọta ihe mere e ji kee ụmụ mmadụ. E kere anyị ka anyị mara Chineke, hụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi mgbe niile. Anyị kwesịrị iburu iwu mbụ a n’uche mgbe ọ bụla anyị na-eme mkpebi. (Ilu 3:6) Ọ bụrụ na mmadụ ana-erube isi n’iwu ahụ, ya na Chineke ga-adị ná mma, ọ ga-enwekwa ezigbo obi ụtọ. Onye ahụ ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.​—Gụọ Matiu 22:36-38.

Iwu nke abụọ Jizọs kwuru nwere ike inyere anyị aka ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma. (1 Ndị Kọrịnt 13:4-7) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe e kwuru n’iwu ahụ, anyị ga na-emeso ndị ọzọ ihe otú Chineke si emeso ha.​—Gụọ Matiu 7:12; 22:39, 40.

4. Olee otú iwu Chineke si abara anyị uru?

Ezinụlọ obi dị ụtọ

Iwu Chineke na-akụziri ezinụlọ otú ha ga-esi na-ahụ ibe ha n’anya ma na-emekọ ihe ọnụ. (Ndị Kọlọsi 3:12-14) Okwu Chineke na-emekwa ka ezinụlọ dịrị n’otu. O kwuru na di ekwesịghị ịhapụ nwunye ya, nwaanyị ekwesịghịkwa ịhapụ di ya.​—Gụọ Jenesis 2:24.

Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-esi ike achụọ anyị n’ọrụ, anyị ga na-enwekwa obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ na-achọkarị ka ndị na-ekwu eziokwu na ndị na-arụsi ọrụ ike na-arụrụ ha ọrụ. Ị manụ na ikwu eziokwu na ịrụsi ọrụ ike so n’iwu ndị e nyere na Baịbụl. (Ilu 10:4, 26; Ndị Hibru 13:18) Okwu Chineke gwakwara anyị ka afọ ju anyị n’ihe anyị nwere. O kwukwara na mkpa anyị kwesịrị ịbụ otú anyị na Chineke ga-esi dịrị ná mma, ọ bụghị otú anyị ga-esi akpakọba akụnụba.​—Gụọ Matiu 6:24, 25, 33; 1 Timoti 6:8-10.

Anyị mee ihe Chineke nyere n’iwu, anyị agaghị na-arịakarị ọrịa. (Ilu 14:30; 22:24, 25) Dị ka ihe atụ, Chineke nyere anyị iwu ka anyị ghara ịṅụ oké mmanya. Ọ bụrụ na anyị egee ntị n’iwu a, anyị agaghị na-arịa ọrịa ma ọ bụkwanụ na-enwe ihe mberede ịṅụ oké mmanya na-akpata. (Ilu 23:20) Jehova asịghị anyị aṅụla mmanya, kama, ọ sị anyị aṅụbigala ya ókè. (Abụ Ọma 104:15; 1 Ndị Kọrịnt 6:10) Chineke nyere anyị iwu ka anyị kpachara anya n’otú anyị si akpa àgwà nakwa n’ihe anyị na-eche n’echiche. Iwu ndị ahụ o nyere anyị na-abakwara anyị uru. (Abụ Ọma 119:97-100) Ma, isi ihe mere ezigbo Ndị Kraịst ji edebe iwu Chineke abụghị naanị ka ọ baara ha uru, kamakwa ka ha wetara Jehova otuto.​—Gụọ Matiu 5:14-16.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, isi nke 12 na 13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya