Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 8 p. 18-19
  • Ndị Enyi Josaya Na-eme Ihe Dị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Enyi Josaya Na-eme Ihe Dị Mma
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Josaya Họọrọ Ime Ihe Ziri Ezi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Josaịa Dị Umeala n’Obi Nwere Ihu Ọma Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Eze Ọma Ikpeazụ Chịrị Izrel
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 8 p. 18-19
Eze Josaya na-ege ntị n’ihe Jeremaya enyi ya na-agwa ya

ISI NKE 8

Ndị Enyi Josaya Na-eme Ihe Dị Mma

Ì chere na ime ihe dị mma siri ike?— Ọtụtụ ndị na-ekwu na o siri ike. O nwere otu nwatakịrị nwoke Baịbụl kọrọ akụkọ ya. Aha ya bụ Josaya. Ime ihe dị mma siiri ya ike. Ma, ndị enyi ya na-eme ihe dị mma. Ha nyeere ya aka, ya amalite ime ihe dị mma. Ka anyị mụọ gbasara Josaya na ndị enyi ya.

Aha papa Josaya bụ Emọn. Ọ bụ eze Juda. Ọ bụghị ezigbo mmadụ. Ọ na-efe arụsị. Mgbe ọ nwụrụ, Josaya ghọrọ eze Juda. Josaya dị naanị afọ asatọ mgbe ahụ. Ì chere na ọ bụ ajọ mmadụ ka papa ya?— Mba.

 Zefanaya onye amụma gwara ndị Juda ihe Jehova kwuru

Zefanaya gwara ndị Juda ka ha kwụsị ife arụsị

Ọ malitere mgbe ọ ka bụ nwata chọwa otú ọ ga-esi mee ihe Jehova chọrọ. Ọ bụ ya mere o ji mete naanị ndị hụrụ Jehova n’anya enyi. Ha nyekwaara ya aka ịna-eme ihe dị mma. Gịnị bụ aha ụfọdụ ndị enyi ya ahụ?

Aha otu n’ime ha bụ Zefanaya. Ọ bụ onye amụma. Ọ bụ ya gwara ndị Juda na Jehova ga-ata ha ahụhụ ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ife arụsị. Josaya gere ntị n’ihe ahụ Zefanaya gwara ndị Juda. Ọ bụ ya mere na o feghị arụsị, kama o fere Jehova.

Onye ọzọ bụ́ enyi Josaya bụ Jeremaya. Ya na Josaya bụ ọgbọ, ha tokọkwara. Ụlọ ha dịkwa nso n’ụlọ Josaya hà. Ha abụọ bụ ezigbo enyi. Ọ bụ ya mere Jeremaya ji bụọ abụ mgbe Josaya nwụrụ. Ihe ọ bụrụ n’abụ ahụ gosiri na ọnwụ Josaya wutere ya. Ha abụọ nyeere ibe ha aka ime ihe Jehova na-achọ.

Josaya na Jeremaya nyeere ibe ha aka ime ihe dị mma

Gịnị ka ị mụtara n’aka Josaya?— Josaya malitere mgbe ọ bụ nwatakịrị chọwa otú ọ ga-esi na-eme ihe dị Chineke mma. Ọ ma na ndị o kwesịrị imete enyi bụ ndị hụrụ Jehova n’anya. Jisie ike na-emete ndị hụrụ Jehova n’anya enyi ka ha nyere gị aka ịna-eme ihe dị mma.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • 2 Ihe E Mere 33:21-25; 34:1, 2; 35:25

AJỤJỤ:

  • Ònye bụ papa Josaya? Ò mere ihe dị mma?

  • Gịnị ka Josaya malitere ime mgbe ọ ka bụ nwatakịrị?

  • Olee aha mmadụ abụọ n’ime ndị enyi Josaya?

  • Olee ihe ị mụtara n’aka Josaya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya