Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 56 p. 134-p. 135 para. 1
  • Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Enyi Josaya Na-eme Ihe Dị Mma
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Josaịa Dị Umeala n’Obi Nwere Ihu Ọma Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Eze Ọma Ikpeazụ Chịrị Izrel
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Josaya Họọrọ Ime Ihe Ziri Ezi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 56 p. 134-p. 135 para. 1
Ebe Shefan na-agụrụ Eze Josaya akwụkwọ mpịakọta

ISI NKE 56

Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe

Josaya ghọrọ eze Juda mgbe ọ dị afọ asatọ. N’oge ahụ, ndị Juda na-eme anwansi, na-efekwa arụsị. Mgbe Josaya dị afọ iri na isii, ọ gbalịrị mụta otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ, o bidoro ibibi arụsị na ebe ịchụàjà niile e nwere na Juda. Mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na isii, o mere ka a malite ịrụzigharị ụlọ nsọ Jehova.

Nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Hilkaya hụrụ akwụkwọ mpịakọta e dere Iwu Jehova n’ụlọ nsọ ahụ. O nwere ike ịbụ Mosis dere akwụkwọ mpịakọta ahụ. Shefan bụ́ odeakwụkwọ eze wegaara Josaya akwụkwọ mpịakọta ahụ ma malite ịgụrụ ya ihe e dere na ya. Ihe Josaya nụrụ mere ka ọ mata na ndị obodo ya na-enupụrụ Jehova isi kemgbe ọtụtụ afọ. Eze Josaya gwara Hilkaya, sị: ‘Jehova na-ewesa anyị ezigbo iwe. Gaanụ jụọ ya ihe anyị ga-eme. Ọ ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme.’ Jehova si n’ọnụ Họlda onye amụma nwaanyị gwa ha, sị: ‘Ndị Juda ahapụla m. Ha ga-ata ahụhụ, ma ọ gaghị abụ n’oge Josaya dị ndụ n’ihi na o wedara onwe ya ala.’

Ebe Hilkaya hụrụ akwụkwọ mpịakọta e dere Iwu Jehova

Mgbe Eze Josaya nụrụ ihe a, ọ gara n’ụlọ nsọ ma kpọkọta ndị Juda niile. Ọ gụpụtaara ha Iwu Jehova. Josaya na ndị obodo ya kweziri Jehova nkwa na ha ga-eji obi ha niile rubere ya isi.

O ruola ọtụtụ afọ ndị Juda na-emebeghị Ememme Ngabiga. Ma, mgbe Josaya gụtara n’Iwu ahụ na e kwesịrị ịna-eme ya n’afọ ọ bụla, ọ gwara ndị Juda, sị: ‘Anyị ga-emere Jehova Ememme Ngabiga.’ Josaya kwadebere ka a chụọrọ Jehova àjà, haziekwa ka e nwee ndị na-abụ abụ n’ụlọ nsọ. Ndị Juda niile meziri Ememme Ngabiga na Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko ruo ụbọchị asaa. Malite n’oge Samuel, e metụbeghị ụdị Ememme Ngabiga a Josaya na ndị obodo ya mere. Josaya ejighị Iwu Chineke gwuo egwu. Ịmụ banyere Jehova ọ̀ na-atọ gị ụtọ?

“Okwu gị bụ ọkụ m ji ahụ ebe m na-azọnye ụkwụ, bụrụkwa ìhè nke na-enwu n’ụzọ m.”​—Abụ Ọma 119:105

Ajụjụ: Olee ihe Eze Josaya mere mgbe a gụụrụ ya Iwu Chineke? Olee otú obi dị Jehova maka ihe Josaya mere?

2 Ndị Eze 21:26; 22:1–23:30; 2 Ihe E Mere 34:1–35:25

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya