Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 12 p. 26-27
  • Nwa Nwanne Pọl Atụghị Ụjọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwa Nwanne Pọl Atụghị Ụjọ
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwa Nwanne Nwaanyị Pọl Zọrọ Pọl Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Geenụ M Ntị Ka M Gwa Unu Ihe Merenụ”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 12 p. 26-27
Ebe nwa nwanne Pọl na-agwa onyeisi ndị soja okwu

ISI NKE 12

Nwa Nwanne Pọl Atụghị Ụjọ

Ka anyị gụọ banyere nwa okorobịa mere ka a ghara igbu nwanne mama ya. Baịbụl ekwughị aha ya, ma ihe o mere gosiri na ụjọ atụghị ya. Ọ bụ Pọl onyeozi bụ nwanne mama nwa okorobịa a. Ị̀ ga-achọ ịma ihe nwa okorobịa a mere?—

A tụrụ Pọl mkpọrọ na Jeruselem. Ihe mere e ji tụọ ya mkpọrọ bụ na ọ na-ekwusa ozi ọma banyere Jizọs. Ụfọdụ ndị kpọrọ Pọl asị, ha wee kwuo otú ha ga-esi egbu ya. Ha sịrị: ‘Anyị ga-agakwuru onyeisi ndị soja gwa ya ka o dunye Pọl onye soja ga-akpọ ya aga ụlọikpe. Anyị ga-agazi chere ha n’ụzọ, Pọl gafetewe, anyị egbuo ya.’

Ebe nwa nwanne Pọl na-agwa Pọl na e nwere ndị chọrọ igbu ya

Nwa nwanne Pọl gwara ma Pọl ma onyeisi ndị soja na e nwere ndị chọrọ igbu Pọl

Nwa nwanne Pọl nụrụ ihe a ha kwuru. Gịnị ka o mere? Ọ gara n’ụlọ mkpọrọ, gwa Pọl ihe ahụ ọ nụrụ. Pọl gwara ya ka ọ gaa gwa ya onyeisi ndị soja ozugbo. Ì chere na ọ dịịrị ya mfe ịgwa ya onyeisi ndị soja?— Mba. Onyeisi ndị soja ahụ abụghị obere mmadụ. Ma, ụjọ atụghị nwa nwanne Pọl ịga gwa ya ihe ọ nụrụ.

Onyeisi ndị soja ma ihe ọ ga-eme ka ha ghara igbu Pọl. Ọ kpọtara ndị soja dị ihe dị ka narị ise ka ha chebe Pọl. Ọ gwara ha ka ha duru Pọl gaa Sesaria n’abalị ahụ. È mechara gbuo Pọl?— Mba. Ndị ahụ chọrọ igbu ya enweghịzi ike imetụ ya aka. Ha enweghịzi ike ime Pọl onyeozi ihe ha chọrọ ime ya.

Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ a?— Nwa nwanne Pọl atụghị onyeisi ndị soja ahụ ụjọ. Gịnwa nwekwara ike ime ka ya. Anyị ekwesịghị ịna-atụ ụjọ mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ banyere Jehova. Obi ọ̀ ga-esi gị ike ịna-agwa ndị mmadụ banyere Jehova?— Ọ bụrụ na ị tụghị ụjọ, i nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ dị ndụ.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • Ọrụ Ndịozi 23:12-24

  • Matiu 24:14; 28:18-20

  • 1 Timoti 4:16

AJỤJỤ:

  • Olee ihe ndị kpọrọ Pọl asị kwuru na ha ga-eme ya?

  • Gịnị ka nwa nwanne Pọl mere? Olee otú ihe o mere si gosi na ọ naghị atụ ụjọ?

  • Olee otú ị ga-esi na-eme ka nwa nwanne Pọl?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya