Foto nke aka ekpe: Mgbe e si Swizaland bute ihe e ji gbatara ụmụnna nọ na Jamanị ọsọ enyemaka n’afọ 1946; foto nke aka nri: Ebe ụmụnna na-arụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze ala ọma jijiji kwaturu na Japan n’afọ 2011
NKEBI NKE 6
Ịkwado Alaeze Chineke—Ịrụ Ebe Anyị Na-anọ Efe Chineke na Ịgbatara Ụmụnna Ọsọ Enyemaka
KA E were ya na e nwere otu ụbọchị ị gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu, ihe ị hụrụ eju gị anya. Ụlọ Nzukọ Alaeze unu mara mma, ị na-ejikwa ya eme ọnụ. O nwekwara ike ịbụ na i so rụọ ya, ị na-echetakwa ihe ndị mere gị obi ụtọ mgbe unu na-arụ ya afọ ole na ole gara aga. Ma, o nwere ihe ọzọ mere i ji jirikwuo Ụlọ Nzukọ Alaeze unu na-eme ọnụ. Ọ bụzi ebe ụmụnna ndị gbatara ọsọ ndụ bigodị. Oké ifufe na idei mmiri kpara mkpamkpa n’obodo unu n’oge na-adịbeghị anya. Kọmitii Alaka ahazie ozugbo ka a gbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ha haziri ka e bugara ha nri, uwe, ezigbo mmiri ọṅụṅụ, na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. A haziri onyinye ndị a nke ọma. Mgbe e bugaara ụmụnna ndị a ihe ndị dị ha mkpa, ha akwụọ n’ahịrị, a na-enye ha ihe ndị ahụ. Obi dị ọtụtụ n’ime ha ụtọ mgbe ha na-ewere ihe ndị a nke na anya mmiri nọ na-agba ha.
Jizọs kwuru na otu ihe a ga-eji mara ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ga-ahụ ibe ha n’anya. (Jọn 13:34, 35) Ná nkebi a, anyị ga-eleba anya n’otú Ndịàmà Jehova si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya mgbe ha na-arụ ebe ha na-anọ efe Chineke nakwa mgbe ha na-agbatara ibe ha ọsọ enyemaka. Otú a anyị si hụ ibe anyị n’anya na-egosi na Alaeze Chineke, nke Jizọs bụ́ Eze ya, na-achị anyị.