Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 83 p. 194-p. 195 para. 2
  • Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Farisii Lere Ya Ọbịa
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ị̀ Na-achọ Ịbụ Onye Mbụ Mgbe Nile?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ihe Atụ nke Oriri Agbamakwụkwọ ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ihe Atụ nke Oriri Agbamakwụkwọ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 83 p. 194-p. 195 para. 2
Ebe ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, na ndị ìsì na-abata iri nri anyasị

ISI NKE 83

Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?

LUK 14:7-24

  • JIZỌS AKỤZIERE ANYỊ ỊNA-ADỊ UMEALA N’OBI

  • NDỊ A KPỌRỌ ÒKÙ ARỊỌ KA A HAPỤ HA

Jizọs ka nọ n’ụlọ onye Farisii ahụ mgbe ọ gwọchara nwoke ahụ na-arịa ọrịa ahụ́ mmiri. Ka ọ nọ ebe ahụ, ọ hụrụ otú ndị ọzọ a kpọrọ òkù maka oriri si na-ahọrọ ebe kacha elu. N’ihi ya, o ji ohere ahụ kụzie banyere ịdị umeala n’obi.

Jizọs kwuru, sị: “Mgbe mmadụ kpọrọ gị òkù ịbịa oriri alụmdi na nwunye, anọdụla n’ebe kasị elu. Ma eleghị anya, ọ kpọrọ onye a na-akwanyere ùgwù karịa gị òkù n’oge ahụ, onye ahụ nke kpọrọ gị na ya òkù ga-abịa sị gị, ‘Ka onye a nọrọ n’ebe ahụ.’ Mgbe ahụ, ị ga-eji ihere bilie gaa nọrọ n’ebe kasị ala.”—Luk 14:8, 9.

Jizọs kwukwara, sị: “Mgbe a kpọrọ gị òkù, gaa nọdụ n’ebe kasị ala, ka ọ ga-abụ na mgbe onye ahụ kpọrọ gị òkù bịara, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, gbagoo n’ebe ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwe nsọpụrụ n’anya ndị ọbịa ibe gị niile.” Ihe Jizọs ji ihe a na-akụzi abụghị naanị ka mmadụ na-akpa àgwà ọma. O kwuru, sị: “N’ihi na onye na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.” (Luk 14:10, 11) N’eziokwu, Jizọs na-akụziri ndị niile nọ ebe ahụ ka ha dịrị umeala n’obi.

Jizọs kụzikwaara onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri ihe ọzọ. O mere ka ọ ghọta ụdị ndị o kwesịrị ịkpọ oriri, ya amasị Chineke. Ọ sịrị ya: “Mgbe ị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa rie nri ehihie ma ọ bụ nri anyasị, akpọla ndị enyi gị ma ọ bụ ụmụnne gị ma ọ bụ ndị ikwu gị ma ọ bụ ndị agbata obi gị bara ọgaranya. Ma eleghị anya, ha nwekwara ike ịkpọ gị òkù n’oge ọzọ, ọ ga-abụkwa ịkwụ gị ụgwọ. Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, ndị ìsì; ị ga-enwekwa obi ụtọ, n’ihi na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ.”—Luk 14:12-14.

O nweghị ihe o mere mmadụ ịkpọ ndị enyi ya, ndị ikwu na ibe ya, ma ọ bụ ndị agbata obi ya ka ha bịa na nke ya rie nri. Jizọs anaghịkwa ekwu na ọ dị njọ mmadụ ime otú ahụ. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ọ bụrụ na anyị akpọọ ndị nọ ná mkpa, dị ka ndị ogbenye, ndị ngwọrọ ma ọ bụ ndị ìsì oriri, Chineke ga-agọzi anyị. Jizọs gwara onye kpọrọ ya oriri, sị: “A ga-akwụ gị ụgwọ ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume.” Otu n’ime ndị a kpọrọ oriri ahụ kwenyeere Jizọs. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ga-eri ihe n’alaeze Chineke.” (Luk 14:15) Ọ ghọtara na e nweghị ihe ọma karịrị nke ahụ. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ghọtara ya otú ahụ. Ihe atụ Jizọs na-aga ime ugbu a gosiri na ọ bụ eziokwu. Jizọs sịrị:

“Otu nwoke nọ na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa maka nnukwu nri anyasị, ọ kpọkwara ọtụtụ ndị òkù. O wee zipụ ohu ya . . . ka ọ gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ òkù, sị, ‘Bịanụ, n’ihi na a kwadowo ihe niile.’ Ma ha niile malitere ịrịọ ka a hapụ ha. Onye mbụ sịrị ya, ‘Azụrụ m ubi, m ga-agarịrị hụ ya; ana m arịọ gị, ka a gụpụ m.’ Onye ọzọ sịkwara, ‘Azụrụ m ehi iri e jikọrọ abụọ abụọ, ana m agakwa ileru ha anya; ana m arịọ gị, ka a gụpụ m.’ Onye ọzọ sịkwara, ‘M ka lụrụ nwaanyị, n’ihi ya, apụghị m ịbịa.’”—Luk 14:16-20.

Ihe ndị a ha kụdoro aka jụ ịbịa erijughị afọ. Mmadụ na-ebukarị ụzọ aga ahụ ubi ma ọ bụ anụ ọ chọrọ ịzụ tupu ya azụọ ya. Ọ zụchaa ya, o kwesịghịzi ịdị ya ọkụ ọkụ ịga hụ ya ma ọ bụ leruo ya anya. Onye nke atọ a kpọrọ anaghị akwadebe ịlụ nwaanyị. Ọ lụchaala. N’ihi ya, o kwesịghị igbochi ya ịza òkù a dị mkpa a kpọrọ ya. Mgbe onye kpọrọ oriri ahụ nụrụ ihe ndị a ha kwuru, iwe were ya, ya agwa ohu ya, sị:

“Gaa ọsọ ọsọ n’okporo ámá na n’ụzọ ámá obodo, kpọbata ndị ogbenye na ndị nwere nkwarụ na ndị ìsì na ndị ngwọrọ n’ebe a.” Ohu ahụ mere ihe a o kwuru. Mgbe o mechara, a ka nwere ohere ebe ndị mmadụ ka ga-anọ. Onye ahụ kpọrọ oriri gwara ohu ya, sị: “Gaa n’okporo ụzọ na n’ebe ndị a gbara ogige, rụgide ha ka ha bata, ka ụlọ m wee ju eju. N’ihi na ana m asị unu, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ahụ a kpọrọ òkù nke ga-edetụ nri anyasị m ire.”—Luk 14:21-24.

Ihe atụ a Jizọs mere gosiri otú Jehova Chineke si zipụ Jizọs Kraịst ka ọ kpọọ ndị mmadụ ka ha soro ná ndị ga-eketa Alaeze eluigwe. Ọ bụ ndị Juu, karịchaa ndị ndú okpukpe ha, ka e bu ụzọ kpọọ. Ma, ọtụtụ n’ime ha jụrụ òkù Jizọs kpọrọ ha n’oge niile ọ na-ekwusa ozi ọma n’ụwa. Ọ bụghị naanị ha ka a kpọrọ òkù a. Ihe Jizọs kwuru mere ka o doo anya na a ga-emecha kpọọ ndị Juu ọ na-enweghị ka ọ hà ha nakwa ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. N’ikpeazụ, a ga-akpọ ndị nke atọ, ya bụ, ndị ndị Juu lere anya ka ndị na-adịghị ọcha n’anya Chineke.—Ọrụ Ndịozi 10:28-48.

N’eziokwu, ihe Jizọs na-ekwu kwadoro ihe ahụ onye ọbịa ibe ya kwuru, bụ́ onye sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ga-eri ihe n’alaeze Chineke.”

  • Olee otú Jizọs si kụziere anyị ịdị umeala n’obi?

  • Olee ụdị ndị ọ ga-abụ mmadụ kpọọ oriri, ya amasị Chineke? Gịnị mere ịkpọ ụdị ndị ahụ ga-eji mee ka onye kpọrọ oriri ahụ nwee obi ụtọ?

  • Gịnị ka Jizọs ji ihe atụ o mere gbasara ndị a kpọrọ ka ha bịa rie nri anyasị kụzie?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya