Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 83
  • Onye Farisii Lere Ya Ọbịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Farisii Lere Ya Ọbịa
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ihe Atụ nke Oriri Agbamakwụkwọ ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ihe Atụ nke Oriri Agbamakwụkwọ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ị̀ Na-achọ Ịbụ Onye Mbụ Mgbe Nile?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 83

Isi 83

Onye Farisii Lere Ya Ọbịa

JISỌS ka nọkwa n’ụlọ otu onye Farisii a ma ama, ọ ka gwọsịkwara nwoke na-arịa ọrịa ahụ mmiri. Ka ọ na-ekiri ndị ọbịa ibe ya ka ha na-ahọrọ ọnọdụ kasị mma ná nnọkọ oriri ahụ, ọ kụziri ihe banyere mmadụ iweda onwe ya ala.

Mgbe ahụ, Jisọs na-akọwa sị, “Mgbe ọ bụla mmadụ ga-akpọ gị n’oriri ọlụlụ nwunye, anọdụla n’isi ọnọdụ; ma eleghị anya ọ kpọworị otu onye ka gị ná nsọpụrụ, onye kpọrọ gị na ya wee bịa sị gị, Nye nwoke a ọnọdụ; mgbe ahụ ị ga-amalite iji ihere were ọnọdụ ikpeazụ.”

Ya mere, Jisọs nyere ndụmọdụ, sị: “Ma mgbe ọ bụla a ga-akpọ gị, gaa nọdụ n’ọnọdụ ikpeazụ; ka, mgbe onye kpọworo gị ga-abịa, ka o wee sị gị, Enyi m, rịgoo n’ọnọdụ ka elu: mgbe ahụ ị ga-enwe otuto n’ihu ndị nile gị na ha na-anọdụ ná nri.” N’ikwubi okwu ya, Jisọs na-asị: “N’ihi na onye ọ bụla nke na-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya; ọzọ, onye na-eweda onwe ya, a ga-eweli ya.”

Ihe ọzọ Jisọs mere bụ ịgwa onye Farisii ahụ nke kpọworo ya òkù okwu, na-akọwa otú e si akpọ nnọkọ oriri nke na-atọ Chineke ụtọ. “Mgbe ọ bụla i siri nri ụtụtụ ma ọ bụ nri anyasị, akpọla ndị enyi gị, ma ọ bụ ụmụnne gị, ma ọ bụ ndị ikwu gị, ma ọ bụ ndị agbata obi gị, bụ́ ndị ọgaranya; ka ha onwe ha wee ghara ịkpọghachikwa gị ma eleghị anya, e wee nyeghachi gị ihe. Kama mgbe ọ bụla i siri nri ukwu, kpọọ ndị ogbenye, ndị ọrụsị, ndị ngwụrọ, ndị ìsì: onye ngọzi [“obi ụtọ,” NW] ka ị ga-abụ; n’ihi na ha enweghị ihe inyeghachi gị.”

Inye ndị dị otú a ihe na-esiri ike nri ga-ewetara onye ahụ na-enye ya obi ụtọ n’ihi na, dị ka Jisọs kọwaara onye ahụ kpọrọ ya, “A ga-enyeghachi gị ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume.” Nkọwa nke a Jisọs nyere banyere nnọkọ oriri nke dị mma kpalitere ụdị nnọkọ oriri ọzọ n’uche nke otu onye ọzọ a kpọkwara òkù. Onye ọbịa nke a na-ekwu sị, “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị onye ga-eri nri n’alaeze Chineke.” Ma, ọ bụghị mmadụ nile ji olileanya obi ụtọ dị otú a kpọrọ ihe, dị ka Jisọs gara n’ihu igosipụta site n’otu ihe atụ.

“Otu nwoke siri nri anyasị ukwu; wee kpọọ ọtụtụ mmadụ: o wee zipụ ohu ya . . . ịsị ndị a kpọwororịị, Bịanụ; n’ihi na e doziwo ihe nile ugbu a. Ma ha nile weere otu olu malite ịrịọ ka a hapụ ha. Onye mbụ sịrị ya, Azụtara m ubi, ọ dịkwa m mkpa ịpụ gaa lee ya: arịọ m gị gụọ m n’onye rịọrọ ka a hapụ ya. Onye ọzọ sịkwara, Azụtara m ehi ọrụ iri e jikọrọ abụọ abụọ, ana m agakwa ịnwa ha: arịọ m gị gụọ m n’onye ­rịọrọ ka a hapụ ya. Onye ọzọ sịkwara, Alụrụ m nwunye, n’ihi nke a apụghị m ịbịa.”

Lee nnọọ ihe ngọpụ na-enweghị isi ndị a bụ! A na-ebu ụzọ nyochaa ubi ma ọ bụ anụ ụlọ tupu azụọ ha, ya mere ọ dịghị ihe ọ bụla ọ dị mkpa n’ezie ka e mee ngwa ngwa iji jee nyochaa ha mgbe a zụtasịworo ha. Otu aka ahụ, na mmadụ lụrụ nwunye ekwesịghị igbochi ya ịnakwere ọkpụkpọ òkù dị mkpa otú a. Ya mere mgbe ọ nụrụ arịrịọ nhapụ nile ndị ahụ, onye kpọrọ òkù ahụ were iwe wee nye ohu ya iwu, sị:

“Pụọ ọsọ ọsọ gaa n’ámá nile na ụzọ nta nile nke obodo, kubata n’ebe a ndị ogbenye na ndị ọrụsị na ndị ìsì na ndị ngwụrọ. [“Mgbe oge ụfọdụ gasịrị,” NW] ohu ahụ wee sị, Onyenwe anyị, e mewo ihe i nyere n’iwu, ọnọdụ fọdụkwara. Onyenwe ụlọ ahụ wee sị ohu ya, Pụọ gaa n’ụzọ nile na ogige nile, rụgidekwa mmadụ ka ha bata, ka ụlọ m wee jupụta. . . . Ọ dịghị otu onye n’ime ndị ikom ndị a kpọworo ga-edetụ nri anyasị m ire.”

Ọnọdụ dị aṅaa ka a kọwara n’ihe atụ ahụ? “Onyenwe ụlọ ahụ” nke na-enye ihe oriri nọchiri anya Jehova; “ohu” ahụ nke na-eje ịkpọ òkù bụ Jisọs Kraịst; “nri anyasị ukwu” ahụ bụkwa ohere nile nke ịbanye n’Alaeze eluigwe.

Ndị e bu ụzọ kpọọ òkù iso ná ndị ga-abanye n’Alaeze ahụ bụ, karịsịa ndị ọzọ nile, ndị ndú okpukpe Juu nke oge Jisọs. Otú ọ dị, ha jụrụ ọkpụkpọ òkù ahụ. Otú a, malite na Pentikọst nke 33 O.A. karịsịa, e zipụrụ ọkpụkpọ òkù nke abụọ nye ndị e wedara n’ala ná mba ndị Juu. Ma ọnụ ọgụgụ zuru ezu azaghachighị iji mezuo 144,000 ọnọdụ ndị e nwere na Alaeze eluigwe Chineke. Ya mere na 36 O.A., mgbe afọ atọ na ọkara gasịrị, e zipụrụ ọkpụkpọ òkù nke atọ nye ndị na-abụghị ndị Juu, ndị a na-ebighịkwa úgwù, nchịkọta nke ndị dị otú ahụ nọgidekwara ruo n’ụbọchị anyị. Luk 14:​1-24.

▪ Ihe mmụta dị aṅaa ka Jisọs na-enye banyere iweda onwe onye ala?

▪ Olee otú onye nwe ụlọ pụrụ isi dokwaa nnọkọ oriri nke na-adị Chineke mma, n’ihi gịnịkwa ka ọ ga-eji wetara ya obi ụtọ?

▪ Gịnị mere o ji bụrụ na ngọpụ nke ndị ahụ a kpọrọ òkù enweghị isi?

▪ Gịnị ka ilu Jisọs banyere “nri anyasị ukwu” nọchiri anya ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya