AJỤJỤ A GA-AJỤ NDỊ CHỌRỌ IME BAPTIZIM
Ihe Ikpeazụ Ndị Na-aga Ime Baptizim na Ndị Okenye Ga-atụle
Ọ na-abụkarị ná mgbakọ Ndịàmà Jehova ka a na-anọ eme ndị mmadụ baptizim. Tupu onye na-ekwu okwu baptizim emechie okwu ya, ọ ga-agwa ndị a na-aga ime baptizim ka ha bilie ọtọ zaa ajụjụ abụọ a n’olu dara ụda:
1. Ì chegharịala ná mmehie gị, nyefee Jehova onwe gị, ma na-ebi ndụ gosiri na i kwetara na o si n’aka Jizọs Kraịst azọpụta anyi? (Gịnị ka ị zara?)
2. Ị̀ ghọtara na baptizim a ga-eme gị na-egosi na ị ghọọla Onyeàmà Jehova nọ ná nzukọ Jehova? (Gịnị ka ị zara?)
Ọ bụrụ na ndị a na-aga ime baptizim azaa ee n’ajụjụ abụọ a, ọ pụtara na ha emeela “nkwupụta ihu ọha” nakwa na ha nwere okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Ọ pụtakwara na ha enyefeela Jehova onwe ha kpamkpam. (Rom 10:9, 10) Ndị chọrọ ime baptizim kwesịrị ibu ụzọ chebara ajụjụ ndị a echiche ma kpee ekpere banyere ha ka ihe ha ga-aza bụrụ ihe ha ghọtara.
Ì nyefeela Jehova onwe gị n’ekpere, kwe ya nkwa na ọ bụ naanị ya ka ị ga-efe, nakwa na ị ga-eme ka ime uche ya bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị?
Obi ò siri gị ike ugbu a na e kwesịrị ime gị baptizim?
Olee ụdị uwe mmadụ kwesịrị iyi mee baptizim? (1 Tim. 2: 9, 10; Jọn 15:19; Fil. 1:10)
Anyị kwesịrị iji ejiji na-egosi na anyị ‘na-emeru ihe n’ókè’ nakwa na anyị “nwere uche zuru okè” iji gosi na anyị “na-asọpụrụ Chineke.” N’ihi ya, ndị a na-aga ime baptizim ekwesịghị iyi uwe na-ahụ ụzọ e ji egwu mmiri bịa ime baptizim. Ha ekwesịghịkwa ịdị nkịrịka n’anya ma ọ bụ yiri uwe e dere ihe ma ọ bụ nke e sere ihe na ya. Ha kwesịrị iyi uwe kwesịrị ekwesị.
Olee otú mmadụ kwesịrị isi mee omume mgbe a na-eme ya baptizim? (Luk 3:21, 22)
Baptizim e mere Jizọs na-akụziri Ndị Kraịst ihe taa. Ọ ghọtara na baptizim bụ ihe dị mkpa, o gosikwara ya n’ihe o mere mgbe a na-eme ya baptizim. N’ihi ya, ebe a na-eme baptizim ekwesịghị ịbụ ebe a ga-anọ na-eme ihe ọchị, ebe a ga-anọ na-egwu mmiri, ma ọ bụ ebe a ga-anọ eme ihe ndị ọzọ ga-eme ka o yie ka à bịara egwuregwu. Onye e mere baptizim ọhụrụ ekwesịghịkwa ịṅụrịbiga ọṅụ ókè ka à ga-asị na ọ bụ ebe okwu biri. Ọ bụ eziokwu na baptizim bụ ihe obi ụtọ, e kwesịrị inwe obi ụtọ ahụ otú kwesịrị ekwesị.
Olee otú ịgachi ọmụmụ ihe anya ga-esi nyere gị aka ịna-eme ihe ị gwara Jehova mgbe ị na-enyefe ya onwe gị?
E mechagodị gị baptizim, gịnị mere i kwesịrị iji nọgide na-amụchi ihe anya ma na-agachi ozi ọma anya?
IHE NDỊ OKENYE KWESỊRỊ IME
Mgbe onye nkwusa a na-emebeghị baptizim kwuru na ya chọrọ ka e mee ya baptizim, e kwesịrị ịgwa ya ka ọ gụọ “Ajụjụ A Ga-ajụ Ndị Chọrọ Ime Baptizim.” Ọ dị na peeji nke 185-207 n’akwụkwọ a. E kwesịkwara ịgwa ya ka ọ gụọ “Ihe A Chọrọ Ka Onye Nkwusa A Na-emebeghị Baptizim Mee.” Ọ malitere na peeji nke 182. Ebe ahụ ga-eme ka ọ mata otú ọ ga-esi kwadebe ihe ya na ndị okenye ga-atụle. Dị ka e kwuru na mbụ, onye chọrọ ime baptizim nwere ike imepe akwụkwọ a ma jiri ya na ihe ndị o deturu n’akwụkwọ na-aza ajụjụ. Ma, ọ baghị uru ka ya na onye ọzọ tụlee ajụjụ ndị ahụ tupu ya na ndị okenye atụlee ha.
Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ime baptizim, o kwesịrị ịgwa onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ. A ga-enye ya oge ka ọ gụọ “Ajụjụ A Ga-ajụ Ndị Chọrọ Ime Baptizim.” Ọ gụchaa ha, onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ ga-ajụ ya ma o nyefeela Jehova onwe ya n’ekpere ime uche Ya. Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ya enyefeela Jehova onwe ya, onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ ga-eme ndokwa ka onye ahụ na ndị okenye abụọ tụlee “Ajụjụ A Ga-ajụ Ndị Chọrọ Ime Baptizim.” Onye ahụ na otu okenye tụlechaa otu nkebi, ya na okenye ọzọ atụlee nkebi nke ọzọ. E kwesịghị ichewe ka a maa ọkwa mgbe a ga-aga mgbakọ tupu ya na ndị okenye atụlewe ajụjụ ndị ahụ.
Ebe ọ bụ na ajụjụ ndị ahụ dị nkebi abụọ, e nwere ike iji otu awa mụọ nkebi nke ọ bụla. A ga-amụ ha iche iche. Ma o nweghị ihe o mere ma a mụọ nkebi nke ọ bụla karịa otu awa. E kwesịrị iji ekpere malite nkebi nke ọ bụla, jirikwa ekpere mechie. Ma onye chọrọ ime baptizim ma ndị okenye ha na ya na-atụle ajụjụ ndị ahụ ekwesịghị ime ka a tụlee ha ọkụ ọkụ. Ndị okenye ha na onye chọrọ ime baptizim ga-atụle ajụjụ ndị ahụ kwesịrị iji ya kpọrọ mkpa.
Ọ kacha mma ka a tụleere onye ọ bụla chọrọ ime baptizim ajụjụ nke ya iche, kama ndị niile chọrọ ime baptizim ịnọkọta ọnụ. Ọ ga-eme ka onye ahụ chọrọ ime baptizim zaa ajụjụ nke ọ bụla. Ọ ga-emekwa ka ndị okenye mara otú onye ahụ ghọtaruru ihe ndị a kụziiri ya, ha e jiri ya mata ma ò ruru eru ime baptizim. Ihe ọzọ bụ na ịtụlere onye nke ọ bụla ajụjụ nke ya iche ga-eme ka ahụ́ ruo onye ahụ ala ikwu okwu. Ma, e nwere ike ịtụlekọta nke di na nwunye ọnụ.
Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ime baptizim bụ nwaanyị, okenye ya na ya ga-atụle nkebi nke ọ bụla ga-anọ ebe ndị mmadụ ga na-ahụ ha ma ghara ịna-anụ ihe ha na-ekwu. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka onye ọzọ soro ha, ọ ga-abụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. Dị ka e kwuru na paragraf na-eso nke a, ihe ga-ekpebi ma à ga-akpọrọ ohu na-eje ozi bụ nkebi nke a ga-atụle.
N’ọgbakọ e nwere ndị okenye ole na ole, e nwere ike ịgwa ndị ohu na-eje ozi ruru eru, bụ́ ndị anya ruru ala, ka ha na ndị chọrọ ime baptizim tụlee ajụjụ ndị dị ná “Nkebi nke Mbụ: Ihe Ndị Kraịst Kweere.” Ọ bụ naanị ndị okenye ka a ga-ekenye ka ha soro ndị chọrọ ime baptizim tụlee ajụjụ ndị dị ná “Nkebi nke Abụọ: Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ.” Ọ bụrụ na ndị okenye e nwere n’ọgbakọ ebughị ibu, e nwere ike ịgwa onye nlekọta sekit ka ọ mara ma è nwere ọgbakọ nọ nso e nwere ike isi na ya kpọta ndị ga-enye aka.
Ọ bụrụ na onye ahụ na-achọ ime baptizim bụ nwatakịrị, ndị mụrụ ya bụ́ Ndịàmà Jehova ma ọ bụ otu onye n’ime ha kwesịrị ịnọ ya mgbe a na-atụlere ya nkebi ndị a. Ọ bụrụ na otu onye n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ agaghị anọli ya, ndị okenye abụọ (ma ọ bụ otu okenye na otu ohu na-eje ozi dabere ná nkebi a na-atụle) kwesịrị iso tụleere ya nkebi nke ọ bụla.
Ndị okenye ga-ejide n’aka na onye a na-aga ime baptizim ghọtara nke ọma ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi. Ha kwesịkwara ịchọpụta ma ò ji eziokwu ọ mụtara na Baịbụl kpọrọ ihe, na-emekwa ihe nzukọ Jehova kwuru. Ọ bụrụ na ọ ghọtachaghị ihe ndị ahụ, ndị okenye ga-eme ndokwa ka a mụkwuoro ya ihe ka o nwee ike ruo eruo n’ọdịnihu ime baptizim. E nwee ndị na-anaghị ejechi ozi anya ma ọ bụ ndị na-anachaghị eme ihe nzukọ Jehova kwuru, a ga-agwa ha ka ha rụọ ọrụ n’ebe ndị ahụ ka ha nwee ike iru eru n’ọdịnihu ime baptizim. Ndị okenye kwesịrị ịma otú ka mma ha ga-esi jiri ihe dị ka otu awa e mere maka nkebi nke ọ bụla ghọta nke ọma ma onye ahụ chọrọ ime baptizim ò ruru eru ka e mee ya baptizim. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike iwe obere oge ịtụle ajụjụ ụfọdụ ma wee nnukwu oge ịtụle ndị ọzọ, e kwesịrị ịtụle ajụjụ niile.
Ndị okenye ha na onye ahụ chọrọ ime baptizim tụlere nkebi ndị ahụ ga-ezukọ ma a tụlechaa nkebi nke abụọ iji kpebie ma onye ahụ ọ̀ ga-eme baptizim ma ọ bụ na ọ gaghị eme. Tupu ha ekpebie ya, ha ga-atụle otú ihe si dịrị ya, otú nghọta ya hà, nakwa ihe ndị ọzọ. Mkpa anyị bụ ka ndị a ga-eme baptizim bụrụ ndị ji obi ha niile nyefee Jehova onwe ha na ndị ghọtara ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ bụrụ na unu enyere ndị na-aga ime baptizim aka, ha ga-enwe ike ịna-ejere Chineke ozi nke ọma.
Ọ bụrụ na ndị okenye ahụ atụlechaa ma onye ahụ ò ruru eru ime baptizim, otu onye n’ime ha ma ọ bụ abụọ ga-agwa ya ihe ha kpebiri. Ọ bụrụ na o ruru eru, ya na okenye ahụ ma ọ bụ ndị okenye abụọ ahụ gwara ya na ọ ga-eme baptizim ga-atụle “Ihe Ikpeazụ Ndị Na-aga Ime Baptizim na Ndị Okenye Ga-atụle.” Ọ dị na peeji nke 206-207. Ọ bụrụ na onye chọrọ ime baptizim amụchabeghị akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị na akwụkwọ Ịhụnanya Chineke, ndị okenye ahụ kwesịrị ịgwa ya ka ọ mụchaa ha ma o mechaa baptizim. Gwa onye ahụ na a ga-edenye ụbọchị e mere ya baptizim na Kaadị Onye Nkwusa ya. Gwakwa ya na ndị okenye na-anata onye nkwusa ihe ndị a ga-ede na kaadị ahụ ka nzukọ Jehova nwee ike iji ha na-arụ ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụwa niile nakwa ka onye nkwusa nwee ike iso ọgbakọ na-eme ihe gbasara ofufe Chineke, ndị okenye ana-agbakwa ya ume. Ihe ọzọ bụ na ndị okenye ga-eme ka obi sie onye nkwusa ahụ ike na ha ga-eji ihe ọ bụla ọ gwara ha banyere onwe ya eme ihe otú Iwu Zuru Ụwa Ọnụ Ndịàmà Jehova Na-eso ma A Bịa n’Ihe Mmadụ Gwara Ha Gbasara Onwe Ya, nke dị na jw.org kwuru. Mkparịta ụka a kwesịrị iwe naanị nkeji iri ma ọ bụ ihe na-erughị ya.
Otu afọ e mechara mmadụ baptizim, ndị okenye abụọ ga-agakwuru ya gbaa ya ume ma tụọrọ ya aro ndị ga-enyere ya aka. Otu n’ime ndị okenye ahụ ga-abụ onye nlekọta ìgwè ozi ubi nwanna ahụ nọ na ya. Ọ bụrụ na onye ahụ bụ nwatakịrị, ndị mụrụ ya bụ́ Ndịàmà Jehova ma ọ bụ otu n’ime ha kwesịrị iso ná nnọkọ ahụ. E kwesịrị iji nnọkọ ahụ gbaa nwanna ahụ ume ma mee ka obi tọọ ya ụtọ. Ndị okenye ahụ ga-agwa ya ebe ndị ọ na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ha ga-atụrụ ya aro otú ọ ga-esi na-amụchi ihe anya ma na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ha ga-atụkwara ya aro otú ọ ga-esi na-enwe ofufe ezinụlọ kwa izu, na-aga ozi ọma kwa izu, na-abịachi ọmụmụ ihe anya ma na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. (Efe. 5:15, 16) Ọ bụrụ na ọ mụchabeghị akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị na akwụkwọ Ịhụnanya Chineke, ndị okenye ga-ahazi maka onye ya na ya ga-amụcha ha. Ndị okenye ga-aja ya mma n’ebe ndị ọ na-eme nke ọma, gwa ya otu ebe ma ọ bụ ebe abụọ ọ ga-arụ ọrụ na ha, ma tụọrọ ya aro otú ọ ga-esi rụọ ọrụ na ha.