ISI NKE 10
Cheta Nwunye Lọt
Lọt na nwanne nna ya aha ya bụ Ebreham biri na Kenan. Ha mechara nwee ọtụtụ anụmanụ nke na ebe ha bi abachaghị ha niile. Ebreham gwara Lọt, sị: ‘Mụ na gị agaghịzi ebi otu ebe. Biko, họrọ ebe ị ga-ebi, ị gaa n’aka ekpe, m ga-aga n’aka nri.’ Ihe a Ebreham kwuru gosiri na ọ naghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru. Ọ́ bụghị eziokwu?
Lọt hụrụ ebe mara mma n’ala ahụ. Ọ dị nso n’obodo a na-akpọ Sọdọm. Mmiri na ahịhịa ndụ juru ebe ahụ. N’ihi ya, ọ họọrọ ebe ahụ ma kpọrọ ezinụlọ ya gaa biri na ya.
Ndị Sọdọm na ndị obodo dị ya nso bụ́ Gọmọra bụ ndị ọjọọ. Ha na-eme ihe jọgburu onwe ya nke na Jehova kpebiri na ya ga-ebibi obodo ha. Ma, Chineke achọghị ibibi Lọt na ndị ezinụlọ ya. N’ihi ya, o zipụrụ ndị mmụọ ozi abụọ ka ha gaa gwa ha okwu. Ha gwara ha, sị: ‘Meenụ ọsọ ọsọ. Sinụ n’obodo a gbapụ. Jehova na-aga ibibi ya.’
Lọt ahapụghị Sọdọm ozugbo. Ọ nọ na-egbu oge. N’ihi ya, ndị mmụọ ozi ahụ jidere ya na nwunye ya na ụmụ ya nwaanyị abụọ n’aka ma kpọpụ ha n’obodo ahụ. Ndị mmụọ ozi ahụ gwara ha, sị: ‘Gbaanụ ọsọ! Gbalaganụ maka ndụ unu. Unu elekwala anya n’azụ. Unu ga-anwụ ma unu lee anya n’azụ.’
Mgbe ha ruru n’obodo a na-akpọ Zoa, Jehova mere ka sọlfọ na ọkụ si n’eluigwe zoo na Sọdọm na Gọmọra. Jehova bibiri obodo abụọ a kpamkpam. Mgbe nwunye Lọt nupụụrụ Jehova isi ma lee anya n’azụ, ọ ghọrọ ogidi nnu. Ma o nweghị ihe mere Lọt na ụmụ ya abụọ maka na ha rubeere Jehova isi. Ọ ga-abụ na obi jọrọ ha ezigbo njọ na nwunye Lọt nupụụrụ Jehova isi. Ma, obi tọrọ Lọt na ụmụ ya ụtọ na ha rubeere Jehova isi.
“Chetanụ nwunye Lọt.” —Luk 17:32