ISI NKE 24
Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere
Jehova gwara Mosis, sị: ‘Gbagote n’ugwu ka ị bịakwute m. M ga-ede iwu m ná mbadamba nkume ma nye gị ya.’ Mosis wee gbagoro n’ugwu ahụ ma nọọ ebe ahụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. Mgbe Mosis nọ n’ugwu ahụ, Jehova dere Iwu Iri ahụ ná mbadamba nkume abụọ ma were ha nye ya.
Mgbe obere oge gachara, ndị Izrel chere na Mosis ahapụla ha. Ha gwara Erọn, sị: ‘Anyị chọrọ onye ga na-edu anyị. Meere anyị chi.’ Erọn gwara ha, sị: ‘Nyenụ m ọlaedo unu.’ Ọ gbazere ọlaedo ndị ahụ ma jiri ha kpụọ ihe yiri nwa ehi. Ndị Izrel kwuru, sị: ‘Nwa ehi a bụ Chi anyị, onye dupụtara anyị n’Ijipt.’ Ha malitere ife nwa ehi ọlaedo ahụ. Ha mekwara ememme. Ihe a ha mere, ọ̀ dị njọ? Ee, ọ dị njọ maka na ha ekwela Jehova nkwa na ọ bụ naanị ya ka ha ga na-efe. Ma ugbu a, ha emezughị nkwa ahụ ha kwere.
Jehova hụrụ ihe na-emenụ ma gwa Mosis, sị: ‘Gbadaa, gakwuru ndị gị. Ha na-enupụrụ m isi ma na-efe chi ọzọ.’ Mosis si n’ugwu ahụ gbadaa, o bukwa mbadamba nkume abụọ ahụ.
Ka Mosis na-abịaru nso n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, ọ nụrụ egwú ha na-agụ. Ọ hụziri ha ka ha na-agba egwú ma na-akpọrọ nwa ehi ahụ isiala. Mosis were ezigbo iwe ma tụọ mbadamba nkume ndị ahụ n’ala, ha akụrisịa. Ọ kụriri ihe ahụ yiri nwa ehi ozugbo. Mosis jụziri Erọn, sị: ‘Gịnị ka ndị a gwara gị mere i ji mee ihe ọjọọ a?’ Erọn gwara ya, sị: ‘Ewela iwe. Ị manụ ndị a nke ọma. Ha chọrọ chi ha ga na-efe, ọ bụ ya mere m ji tụba ọlaedo ha n’ọkụ, nwa ehi a apụta.’ Erọn ekwesịghị imere ha chi ahụ. Mosis gaghachiri n’ugwu ahụ ma rịọ Jehova ka ọ gbaghara ndị Izrel.
Jehova gbaghaara ndị ji obi ha chọọ irubere ya isi. Ị̀ hụla ihe mere ndị Izrel kwesịrị iji na-eme ihe Mosis gwara ha?
“Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya, n’ihi na ihe ndị nzuzu anaghị amasị ya. Mezuo nkwa i kwere.”—Ekliziastis 5:4