Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 5/15 p. 21
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Mosis na Erọn—Ndị Nkwusa Nwere Obi Ike nke Okwu Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Mozis na Erọn Gosiri na Ha Nwere Ezigbo Obi Ike
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Mozis Etie Nkume Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 5/15 p. 21

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebe ọ bụ na Jehova nyere iwu ka ndị ya ghara ikpere arụsị, olee ihe mere ọ taghị Erọn ahụhụ maka nwa ehi ọlaedo ọ kpụrụ?

Mgbe Erọn kpụrụ nwa ehi ọlaedo ahụ nke e kwuru okwu ya n’Ọpụpụ isi iri atọ na abụọ, o mebiri iwu Chineke nyere banyere ikpere arụsị. (Ọpụ. 20:3-5) N’ihi ya, “Jehova wesokwara Erọn oké iwe nke na ọ fọrọ nke nta ka ọ laa ya n’iyi; ma [Mozis rịọsiri] arịrịọ ike maka Erọn n’oge ahụ.” (Diut. 9:19, 20) Arịrịọ a nwoke ezi omume bụ́ Mozis rịọsiri ike maka Erọn ọ̀ “dị ike”? (Jems 5:16) Ee. O yiri ka Jehova ọ̀ zara ekpere Mozis ma ghara ịta Erọn ahụhụ n’ihi ekpere ahụ nakwa n’ihi ihe abụọ ọzọ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ.

Otu n’ime ha nwere ike ịbụ na Erọn kwesịrị ntụkwasị obi kemgbe. Mgbe a gwara Mozis ka ọ gaa n’ihu Fero nakwa ka o si n’Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, Jehova họpụtara Erọn ka o soro Mozis ma kwuchite ọnụ ya. (Ọpụ. 4:10-16) Ha abụọ rubere isi ma gaa n’ihu eze Ijipt ọtụtụ ugboro, n’agbanyeghị na Fero obi fere azụ eleghị ha anya ọma. Mgbe ha ka nọ n’Ijipt, Erọn ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi.—Ọpụ. 4:21.

Tụleekwa ihe mere Erọn ji mee nwa ehi ọlaedo ahụ. Mozis nọrọ ụbọchị iri anọ n’Ugwu Saịnaị. Mgbe “ụmụ Izrel hụrụ na Mozis na-egbu oge nke ukwuu ịrịdata n’ugwu ahụ,” ha gwasiri Erọn okwu ike ka o meere ha arụsị. Erọn wee kpụọrọ ha nwa ehi ọlaedo. (Ọpụ. 32:1-6) Ma, ihe Erọn mechara mee gosiri na o soghị ha kpeere arụsị. Ọ ga-abụ na ọ sọrọ anya mee ihe o mere. Mgbe Mozis kpebiri ihe a ga-eme ndị kpeere arụsị, ụmụ Livaị niile, gụnyere Erọn, kwụụrụ n’akụkụ Jehova. E gburu puku mmadụ atọ ndị bu ikpere arụsị ahụ n’isi.—Ọpụ. 32:25-29.

Mozis mechara gwa ndị Izrel, sị: “Unu onwe unu emewo oké mmehie.” (Ọpụ. 32:30) Ya mere, ọ bụghị naanị Erọn ka ikpe mara maka arụsị ahụ. Jehova meere ya na ndị ọzọ ebere.

Mgbe nke a gachara, Jehova kwuru ka e mee Erọn nnukwu onye nchụàjà. Chineke gwara Mozis, sị: “Ị ga-eyiwe Erọn uwe nsọ ndị ahụ, tee ya mmanụ ma doo ya nsọ, ọ ga-abụkwa onye nchụàjà m.” (Ọpụ. 40:12, 13) Nke a na-egosi na Jehova gbaghaara Erọn mmehie ya. Obi Erọn dị n’ofufe Jehova, ọ bụghị onye nnupụisi, nke na-ekpere arụsị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya