ISI NKE 27
Ha Nupụụrụ Jehova Isi
Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, Kora, Detan, Abaịram, na narị mmadụ abụọ na iri ise (250) ndị ọzọ nupụụrụ Mosis isi. Ha gwara ya, sị: ‘O zuorola unu! Gịnị mere ị ga-eji bụrụ onye ndú anyị, Erọn abụrụ nnukwu onye nchụàjà? Jehova nọnyeere anyị niile, ọ bụghị naanị gị na Erọn.’ Ihe a were Jehova iwe. O weere ya na ọ bụ ya ka ha na-enupụrụ isi.
Mosis gwara Kora na ndị òtù ya, sị: ‘Bịanụ n’ụlọikwuu echi, werekwanụ ihe e ji amụ insens na insens bịa. Jehova ga-egosi anyị onye ọ họọrọ.’
N’echi ya, Kora na narị mmadụ abụọ na iri ise (250) ahụ bịakwutere Mosis n’ụlọikwuu. Ha mụnyere insens ọkụ n’ebe ahụ ka à ga-asị na ha bụ ndị nchụàjà. Jehova gwaziri Mosis na Erọn, sị: ‘Sinụ n’ebe Kora na ndị òtù ya pụọ.’
Kora gakwuuru Mosis n’ụlọikwuu, ma Detan, Abaịram, na ndị ezinụlọ ha ekweghị aga. Jehova gwara ndị Izrel ka ha si n’ebe ụlọikwuu Kora, Detan, na Abaịram dị pụọ. Ndị Izrel si ebe ahụ pụọ ozugbo. Detan, Abaịram, na ndị ezinụlọ ha guzooro n’ihu ụlọikwuu ha. Na mberede, ala meghere loo ha niile. Ọkụ sikwa n’elu regbuo Kora na narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) nọ n’ụlọikwuu.
Jehova gwaziri Mosis, sị: ‘Nata onyeisi ebo nke ọ bụla mkpara ya ma dee ya aha ya. Ma, ị ga-ede aha Erọn na mkpara ebo Livaị. Tinye ha n’ime ụlọikwuu. Mkpara onye m họọrọ ga-awa okooko osisi.’
N’echi ya, Mosis wepụtara mkpara niile ahụ ma gosi ha ndị isi ahụ. Mkpara Erọn wara okooko osisi, mịakwa mkpụrụ almọnd chara acha. Jehova si otú a gosi na ya họọrọ Erọn ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà.
“Na-eruberenụ ndị na-eduzi unu isi, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha.”—Ndị Hibru 13:17