Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 39
  • Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Nupụụrụ Jehova Isi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Jiri Iguzosi Ike n’Ihe Na-edo Onwe Gị n’Okpuru Ịbụisi Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Mozis Etie Nkume Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 39
Ebe Mozis ji mkpanaka Erọn ahụ pupụtara okooko osisi

AKỤKỌ NKE 39

Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn

LEE okooko osisi na mkpụrụ almọnd chara acha ndị puru na mkpanaka ma ọ bụ n’osisi a. Ọ bụ mkpanaka Erọn. Okooko osisi na mkpụrụ osisi ndị a chara acha pupụtara na mkpanaka Erọn n’otu ụbọchị! Ka anyị hụ ihe kpatara ya.

N’oge ahụ, ụmụ Izrel awagharịwo n’ọzara ruo oge ụfọdụ. Ụfọdụ n’ime ha echeghị na Mozis kwesịrị ịbụ onye ndú ha, ha echeghịkwa na Erọn kwesịrị ịbụ nnukwu onye nchụàjà. Kora echeghị na Erọn kwesịrị ịbụ nnukwu onye nchụàjà, otú ahụkwa ka ọ dị Detan, Abaịram, na ndị ndú Izrel dị narị abụọ na iri ise. Ndị a niile bịakwutere Mozis wee sị ya: ‘Gịnị mere i ji ebuli onwe gị elu karịa anyị niile?’

Mozis gwara Kora na ndị so ya, sị: ‘Ụtụtụ echi, werenụ ihe ịgụ ọkụ, tinyekwanụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ime ha. Mgbe ahụ, bịanụ n’ụlọikwuu Jehova. Anyị ga-ahụ onye Jehova ga-ahọpụta.’

N’echi ya, Kora na narị ndị ikom abụọ na iri ise ndị so ya jere n’ụlọikwuu ahụ. Ọtụtụ ndị ọzọ bịakwara isonyere ha. Ezigbo iwe were Jehova. Mozis wee gwa ụmụ Izrel, sị: ‘Pụọnụ n’ụlọ ntu nke ndị ikom ọjọọ a. Unu emetụla ihe ọ bụla bụ nke ha aka.’ Ha gere ntị wee si n’ụlọ ntu Kora, Detan na Abaịram pụọ.

Mozis wee sị: ‘Na nke a ka unu ga-amara onye Jehova họpụtara. Ala ga-emeghe wee loo ndị ikom ndị a.’

Ngwa ngwa Mozis kwusịrị okwu, ala meghere. Ụlọ ntu Kora na ihe ya niile, na Detan na Abaịram na ndị so ha, dabara n’ime ya, ala wee kpuchie ha. Mgbe ndị Izrel nụrụ ákwá nke ndị dabara n’ime ala ahụ, ha tiri mkpu, sị: ‘Gbalaganụ! Ala nwekwara ike ilo anyị!’

Kora na narị ndị ikom abụọ na iri ise ya ka nọ ụlọikwuu ahụ nso. Jehova zitere ọkụ, o wee rechapụ ha niile. Mgbe ahụ, Jehova gwara Elieza nwa Erọn ka ọ chịrị ihe ịgụ ọkụ nke ndị ahụ nwụrụ anwụ ma were ha mee ihe a ga-eji na-ekpuchi ebe ịchụàjà. Ihe mkpuchi ebe ịchụàjà nke a ga-abụrụ ụmụ Izrel ihe ịdọ aka ná ntị na ọ dịghị onye ọzọ, ma e wezụga Erọn na ụmụ ya, kwesịrị ijere Jehova ozi dị ka ndị nchụàjà.

Ma Jehova chọrọ ime ka o doo anya na ọ bụ Erọn na ụmụ ya bụ ndị ọ họpụtara ịbụ ndị nchụàjà. N’ihi ya, ọ gwara Mozis, sị: ‘Gwa onye ndú ọ bụla nke ebo Izrel ka o weta mkpanaka ya. Maka ebo Livaị, gwa Erọn ka o weta mkpanaka ya. Debe mkpanaka ndị a n’ime ụlọikwuu n’ihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Okooko osisi ga-epu na mkpanaka nke nwoke m họpụtara ịbụ onye nchụàjà.’

N’echi ya, mgbe Mozis lere anya, okooko osisi ndị a na mkpụrụ osisi almọnd ndị chara acha epuola na mkpanaka Erọn! Ugbu a, ị̀ hụla ihe mere Jehova ji mee ka okooko osisi puo na mkpanaka Erọn?

Ọnụ Ọgụgụ 16:1-49; 17:1-11; 26:10.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya