ISI NKE 31
Joshụa na Ndị Gibiọn
Akụkọ ihe mere Jeriko bịara gazuo n’obodo ndị ọzọ dị na Kenan. Ndị eze obodo ndị a kpebiri na ha ga-ejikọ aka lụso ndị Izrel agha. Ma ndị Gibiọn kpebiri na ha ga-eme ihe dị iche. Ha yi nkịrịka uwe gakwuru Joshụa ma sị: ‘Anyị si n’obodo dị anya bịa. Anyị anụla banyere Jehova na ihe niile o meere unu n’Ijipt nakwa na Moab. Kwenụ anyị nkwa na unu agaghị alụso anyị agha, anyị ga-abụ ndị ohu unu.’
Joshụa kwetara ihe ha kwuru ma kweta na ha agaghị alụso ha agha. Mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ chọpụtara na ha esighị n’obodo dị anya bịa. Ha si Kenan. Joshụa jụrụ ndị Gibiọn, sị: ‘Gịnị mere unu ji ghaara anyị ụgha?’ Ha gwara ya, sị: ‘Ụjọ tụrụ anyị. Anyị ma na Jehova Chineke unu na-alụrụ unu agha. Biko, unu egbula anyị.’ Joshụa egbughị ha otú o kwere ha ná nkwa.
Obere oge, ndị eze ise na-achị ndị Kenan na ndị agha ha kpebiri ịlụso ndị Gibiọn agha. Mgbe Joshụa na ndị agha ya nụrụ ya, ha si n’abalị gagide ije chi abọọ ka ha nwee ike ịzọpụta ndị Gibiọn. Ha na ndị Kenan malitere ịlụ agha n’isi ụtụtụ ahụ. Ndị Kenan malitere ịgba ọsọ. Jehova mere ka akụ́ mmiri ígwé dagbuo ha ebe ọ bụla ha gbagara. Joshụa gwaziri Jehova ka o mee ka anyanwụ kwụrụ otu ebe. Gịnị mere o ji gwa Jehova ka o mee otú ahụ ebe ọ bụ na ụdị ihe a emetụbeghị? Ọ bụ n’ihi na Joshụa tụkwasịrị Jehova obi. Anyanwụ adaghị n’ụbọchị ahụ niile ruo mgbe ndị Izrel meriri ndị eze Kenan na ndị agha ha.
“Ka ‘Ee’ unu kwuru bụrụ ee, ka ‘Ee e’ unu kwuru bụrụ ee e, n’ihi na ihe gafere ihe ndị a si n’aka ajọ onye ahụ.”—Matiu 5:37