Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbv isiokwu 10
  • Joshụa 1:9—‘Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Joshụa 1:9—‘Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike’
  • Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Joshụa 1:9 Pụtara
  • Ihe Ndị Gbara Joshụa 1:9 Gburugburu
  • Ọ Chọrọ Ka Ihe Gaara Anyị nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ihe Jọshụa Chetara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Onye Na-emezu Nkwa Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
ijwbv isiokwu 10

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Joshụa 1:9​—‘Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike’

“Ọ̀ bụ na mụ agwabeghị gị ka i nwee obi ike, ka ị dịkwa ike? Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.”​—Joshụa 1:​9, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

“Ọ bụ na m agwabeghị gị kwụrụ chịm, ka obi sie gị ike? Ya mere, egwu atụla gị, obi alọla gị mmiri n’ihina Osebụrụwa Chineke gị nọnyere gị ebe ọbụla ị ga-aga.”​—Joshụa 1:​9, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Joshụa 1:9 Pụtara

Jehovaa gwara ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Joshụa ihe a iji mee ka obi sie ya ike na ‘ọ ga-enweli obi ike, ma dị ike’ n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara ya. Ọ bụrụ na Joshụa erubere Jehova isi, o kwesịghị ịtụwa ụjọ ihe echi ga-abụ n’ihi na ọ ma na Jehova ga-anọnyere ya, nyekwara ya aka. Chineke kụziiri Joshụa ihe, nyekwara ya aka imeri ndị iro ya, si otú ahụ gosi na ọ nọnyeere ya.

Olee otú Joshụa ga-esi ‘nwee obi ike ma dị ike’? Okwu Chineke e nwere n’oge ahụ nwere ike inyere ya aka inwe obi ike ma dị ike. Otu n’ime ha bụ “ihe niile dị n’Iwu Mosis ohu [Jehova] nyere [Joshụa].”b (Joshụa 1:7) Jehova gwara Joshụa ka “ọ na-agụ ya ma na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị.” (Joshụa 1:8) Ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya nyeere Joshụa aka ikpebisi ike ịna-eme uche Chineke. Joshụa kwesịkwara ịna-eme ihe ọ na-amụta n’Okwu Chineke, ya bụ, ‘ilezi anya na-eme ihe niile e dere na ya.’ Ọ bụrụ na o mee ihe a, ihe ga na-agaziri ya, ya ana-akpakwa àgwà onye ma ihe. Ọ bụkwa ihe a bụ ihe merenụ. N’agbanyeghị na e nwere oge ndị ihe siiri Joshụa ike, ndụ ya juru ya afọ, ya emeekwa ihe dị Jehova mma.​—Joshụa 23:14; 24:15.

Ihe ahụ Jehova gwara Joshụa ka na-abakwara anyị uru taa. O gosiri otú Jehova hụruru ndị niile na-efe ya n’anya n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara ha. Ọ chọrọ ka ihe na-agaziri ha otú ahụ ọ gaziiri Joshụa. Ha nwekwara ike inwe obi ike ma dị ike ka Joshụa ma ọ bụrụ na ha ana-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, na-atụgharị uche na ya, na-emekwa ihe ndị ha mụtara na ya.

Ihe Ndị Gbara Joshụa 1:9 Gburugburu

Mgbe Mosis nwụchara, Jehova gwara Joshụa na ọ bụzi ya ga na-edu ndị Izrel. (Joshụa 1:​1, 2) N’oge ahụ, ndị Izrel na-ejikere ịbanye n’Ala Nkwa, ya bụ, ala Kenan. Ma ha ga-alụso ndị iro ha siri ezigbo ike agha. Dị ka ihe atụ, Joshụa lụsoro ndị Kenan obi tara mmiri agha.c (Diuterọnọmi 9:5; 20:​17, 18) Ndị Kenan dị ọtụtụ karịa ndị Izrel, nweekwa ngwá agha dị iche iche karịa ha. (Joshụa 9:​1, 2; 17:18) Ma Joshụa katara obi mee ihe niile Jehova gwara ya. Chineke nọnyekwaara ya. N’ihi ya, ndị Izrel meriri ọtụtụ ndị iro ha naanị n’ime afọ isii.​—Joshụa 21:​43, 44.

Gụọ Joshụa isi 1 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.

a Jehova bụ aha ndị Igbo na-akpọ Chineke. Ha si n’aha ndị Hibru na-akpọ Chineke nweta ya, ya bụ, mkpụrụ okwu anọ a יהוה (YHWH). A na-akpọkwa mkpụrụ okwu Hibru anọ a Tetragramatọn. N’amaokwu a, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik kpọrọ aha a “Osebụrụwa.” Ị chọọ ịmatakwu gbasara aha a bụ́ Jehova nakwa ihe mere ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl ji wepụ ya na Baịbụl ha sụgharịrị, gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”

b O nwere ike ịbụ na akwụkwọ ndị e si n’ike mmụọ nsọ dee, ndị dị n’oge Joshụa bụ akwụkwọ ise Mosis dere, ya bụ, (Jenesis, Ọpụpụ, Levitikọs, Ọnụ ọgụgụ na Diuterọnọmi), akwụkwọ Job, nakwa otu abụ ma ọ bụ abụ abụọ dị n’akwụkwọ Abụ Ọma. Akwụkwọ ndị a dịkwa na Baịbụl anyị niile nwere taa.

c Ị chọọ ịmata ihe mere Chineke ji kwee ka a lụso ndị Kenan agha, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Mere Chineke ji Lụso ndị Kenan Agha?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Jenụwarị 1, 2010.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya