ISI NKE 48
A Kpọlitere Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ n’Ọnwụ
N’oge ahụ ọkọchị kọrọ n’Izrel, Jehova gwara Ịlaịja, sị: ‘Gaa Zarefat. Otu nwaanyị di ya nwụrụ nke bi ebe ahụ ga na-enye gị nri.’ Mgbe Ịlaịja ruru n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwaanyị di ya nwụrụ ebe ọ na-akpa nkụ. Nwaanyị a dara ogbenye. Ịlaịja rịọrọ ya ka o kunyetụ ya mmiri ka ọ ṅụọ. Mgbe nwaanyị ahụ gawara ikute ya, Ịlaịja gwara ya, sị: ‘Biko, wetakwara m achịcha.’ Ma, nwaanyị ahụ sịrị ya: ‘Enweghị m achịcha m ga-enye gị. Ihe m nwere bụ naanị obere ntụ ọka na obere mmanụ m ga-eji mee obere nri mụ na nwa m nwoke ga-eri.’ Ịlaịja gwara ya, sị: ‘Jehova kwuru na i meere m achịcha, ntụ ọka na mmanụ gị agaghị agwụ ruo mgbe ọzọ mmiri ga-ezo.’
Nwaanyị ahụ lawara gaa meere onye amụma Jehova achịcha. Jehova mezuru ihe o kwuru. Nwaanyị ahụ na nwa ya nwoke nwere ihe ha na-eri n’oge niile ahụ ọkọchị kọrọ. Ntụ ọka ya agwụghị, mmanụ ya agwụghịkwa.
Ma, o nweziri ihe merenụ nke gbawara nwaanyị ahụ obi. Obere nwa ya nwoke ahụ rịawara ọrịa, mechaakwa nwụọ. Ọ rịọwara Ịlaịja ka o nyere ya aka. Ịlaịja kuuru nwa ahụ gbagoo n’ọnụ ụlọ ha dị n’elu ma nyiwe ya n’àkwà. Ọ rịọziri Jehova, sị: ‘Jehova, biko, mee ka nwatakịrị a dịghachi ndụ.’ Ị̀ ma ihe mere ọ ga-eji abụ ihe ịtụnanya ma Jehova kpọlite nwa ahụ n’ọnwụ? Ọ bụ n’ihi na e nwetụbeghị onye e kwuru na a kpọlitere n’ọnwụ tupu mgbe ahụ. Ihe ọzọ bụ na nwaanyị a na nwa ya nwoke abụghịdị ndị Izrel.
Ma, Jehova mere ka nwa ahụ dịghachi ndụ, ya amalitekwa iku ume. Ịlaịja gwara nwaanyị ahụ di ya nwụrụ, sị: “Lekwa nwa gị. Ọ dịla ndụ.” Obi tọrọ nwaanyị ahụ ezigbo ụtọ, ya agwa Ịlaịja, sị: ‘Ị bụ onye nke Chineke n’eziokwu. Ihe m ji mara bụ na ị na-ekwu naanị ihe Jehova gwara gị ka i kwuo.’
“Leruonụ ugoloọma anya: Ha anaghị akụ mkpụrụ, ha anaghịkwa ewe ihe ubi. Ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ ha na-akwasa ihe. Ma Chineke na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu abaghị uru karịa nnụnụ?”—Luk 12:24