Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 52 p. 126-p. 127 para. 1
  • Ndị Agha Jehova Ndị Nọ n’Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Agha Jehova Ndị Nọ n’Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-ahụ Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ Ịlaịsha Hụrụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • “Kuru Nwa Gị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ihe Atụ nke Iji Onwe Onye Achụ Àjà na Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 52 p. 126-p. 127 para. 1
Ebe ndị agha Siria gbara Ịlaịsha na onye na-ejere ya ozi gburugburu

ISI NKE 52

Ndị Agha Jehova Ndị Nọ n’Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ

Ben-hedad eze Siria nọgidere na-alụso ndị Izrel agha. Ma, mgbe ọ bụla ọ biawara ọgụ, Ịlaịsha onye amụma na-agwa eze Izrel. Ihe a na-eme ka ọ ghara inweta eze Izrel. N’ihi ya, Ben-hedad kpebiri na ọ ga-anwụde Ịlaịsha. Mgbe ọ chọpụtara na Ịlaịsha nọ n’obodo Dotan, o zigara ndị agha Siria ebe ahụ ka ha jide ya.

Ndị agha Siria bịara Dotan n’abalị. Mgbe chi bọrọ, onye na-ejere Ịlaịsha ozi pụtara n’èzí hụ ìgwè ndị agha gbara obodo ha gburugburu. Ezigbo ụjọ tụrụ ya, ya etie mkpu, sị: ‘Nna m ukwu, gịnị ka anyị ga-eme?’ Ịlaịsha gwara ya, sị: “Ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.” Ozugbo Ịlaịsha gwachara ya ihe a, Jehova mere ka onye na-ejere Ịlaịsha ozi hụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha ndị na-acha ọkụ ọkụ bụ́ ndị juru n’ugwu ndị gbara obodo ahụ gburugburu.

Ebe Ịlaịsha na onye na-ejere ya ozi na-ele ndị mmụọ ozi gbara ha gburugburu

Mgbe ndị agha ahụ chọrọ ijide Ịlaịsha, o kpere ekpere, sị: ‘Jehova, biko mee ka ha kpuo ìsì.’ Ozugbo Ịlaịsha kpechara ekpere a, ndị agha ahụ amaghịzi ebe ha nọ n’agbanyeghị na ha ka na-ahụ ụzọ. Ịlaịsha gwara ha, sị: ‘Obodo a abụghị ebe unu na-aga. Soronụ m ka m duru unu gakwuru nwoke unu na-achọ.’ Ha sooro Ịlaịsha gaa Sameria, ebe eze Izrel bi.

Ndị agha ahụ mechara mata na ha nọzi na Sameria. Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ jụrụ Ịlaịsha, sị: “Ọ̀ bụ m gbuo ha?” ḷlaịsha ò ji ohere a sị ka e gbuo ndị a chọrọ igbu ya? Mba. Ịlaịsha sịrị: ‘Egbula ha. Nye ha nri ma hapụ ha ka ha laa.’ N’ihi ya, eze meere ha nnukwu oriri ma hapụ ha ka ha laa.

Ebe ndị agha Siria na-eri nri na Sameria

“Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya nke dabara n’uche ya, ọ na-anụ olu anyị.”​—1 Jọn 5:14

Ajụjụ: Olee otú Jehova si chebe Ịlaịsha na onye na-ejere ya ozi? Ì chere na Jehova ga-echebe gị otú o chebere ha?

2 Ndị Eze 6:8-24

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya