Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 64 p. 152-p. 153 para. 4
  • A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Onye A Napụtara n’Ọnụ Ọdụm!
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Daniel Fere Chineke Mgbe Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Daraịọs—Eze nke Ji Ikpe Ziri Ezi Akpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 64 p. 152-p. 153 para. 4
Ebe ndị na-emere Daniel anyaụfụ hụrụ ya ka o chere ihu na windo mepere emepe na-ekpe ekpere

ISI NKE 64

A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm

Eze ọzọ chịrị Babịlọn bụ Darayọs onye Midia. Darayọs chọpụtara na Daniel pụrụ iche. O mere ya onyeisi ndị ọnụ na-eru n’okwu na Babịlọn. Ndị a ọnụ na-eru n’okwu nọ na-emere Daniel anyaụfụ ma na-achọ otú ha ga-esi gbuo ya. Ha ma na Daniel na-ekpe ekpere ugboro atọ n’ụbọchị. Ọ bụ ya mere ha ji gwa Darayọs, sị: ‘Eze, e kwesịrị ime iwu ga-ekwu na ọ bụ naanị gị ka a ga na-arịọ arịrịọ. A ga-atụba onye ọ bụla dara iwu a n’olulu ọdụm.’ Ihe a ha kwuru masịrị Darayọs, ya ekweta ka e mee iwu ahụ, bịanyekwa aka na ya.

Ozugbo Daniel nụrụ iwu ọhụrụ a e mere, ọ lara n’ụlọ ya. O mepere windo ụlọ ya, gbuo ikpere n’ala, rịọwa Jehova arịrịọ. Ndị ahụ na-emere ya anyaụfụ kwooro bata n’ụlọ ya ma hụ ka ọ na-ekpe ekpere. Ha gbaara gakwuru Darayọs, sị ya: ‘Daniel na-enupụrụ gị isi. Ọ na-arịọ Chineke ya arịrịọ ugboro atọ n’ụbọchị.’ Darayọs hụrụ Daniel n’anya, ọ chọghịkwa ka e gbuo ya. Si n’ụtụtụ ruo ná mgbede, ọ nọ na-eche ihe ọ ga-eme ka a ghara igbu Daniel. Ma, Darayọs enwedịghị ike ịgbanwe iwu ọ bịanyerela aka na ya. N’ihi ya, ọ gwara ndị na-ejere ya ozi ka ha tụba Daniel n’olulu ọdụm.

Darayọs ehighị ụra n’abalị ahụ ebe ọ na-eche banyere Daniel. N’ụtụtụ echi ya, ọ gbaara ọsọ gaa n’ọnụ olulu ahụ ma kpọọ Daniel òkù, sị: “Chineke gị ọ̀ napụtara gị?”

Darayọs nụrụ olu. Ọ bụ olu Daniel. Ọ gwara Darayọs, sị: “Mmụọ ozi Jehova mechiri ọnụ ọdụm ndị a. Ha emeghị m ihe ọ bụla.” Obi tọrọ Darayọs ezigbo ụtọ. O nyere iwu ka a kpọpụta Daniel n’olulu ọdụm ahụ. Mgbe Daniel pụtara, o nweghị ihe ọ bụla mere ya. Eze nyeziri iwu, sị: “Tụbanụ ndị ahụ boro Daniel ebubo n’olulu ọdụm ahụ.” Mgbe a tụbara ha n’olulu ahụ, ọdụm ndị ahụ dọriri ha.

Darayọs nyere ndị niile ọ na-achị iwu, sị: “Ka mmadụ niile na-atụ Chineke Daniel egwu. Ọ napụtara Daniel n’aka ọdụm.”

Ị̀ na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka Daniel?

Ebe Daniel nọ n’olulu ọdụm

“Jehova ma otú o si anapụta ndị ji obi ha niile na-efe ya n’ọnwụnwa.”​—2 Pita 2:9

Ajụjụ: Gịnị ka Daniel na-eme ugboro atọ kwa ụbọchị? Olee otú Jehova si napụta Daniel?

Daniel 6:1-28

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya