Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/15 p. 8-9
  • Daraịọs—Eze nke Ji Ikpe Ziri Ezi Akpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Daraịọs—Eze nke Ji Ikpe Ziri Ezi Akpọrọ Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EZE NKE NWERE AKỤKỌ NA-EZUGHỊ EZU
  • DANIEL ENWETA IHU ỌMA
  • Onye A Napụtara n’Ọnụ Ọdụm!
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Daniel Fere Chineke Mgbe Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/15 p. 8-9

Daraịọs—Eze nke Ji Ikpe Ziri Ezi Akpọrọ Ihe

BANYERE ọrụ iwu ihe ndị ọ rụworo, otu eze a ma ama turu ọnụ n’otu oge, sị: “N’ime Babilọn ewuru m mgbidi siri ike n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ. Egwuru m ọwa mmiri . . . eji m bitumen na brick wuo mgbidi dị ike bụ́ nke, dị ka ugwu, a na-apụghị iwezụga n’ọnọdụ ya.” Ee, Eze Nebukadneza nke Babilọn etinyeworị aka n’ọrụ ihe owuwu sara mbara, ọ rụsiwokwa ọrụ ike ime ka isi obodo nke alaeze ukwu ya sikwuo ike. Ma obodo Babilọn abụghị ebe a na-apụghị imeri emeri dị ka o cheworo.

Ihe àmà nke a mere n’October 5, 539 T.O.A. N’ịbụ onye usuu ndị agha Midia sonyeere, onye ọchịchị Peasia bụ́ Saịrọs nke Abụọ meriri Babilọn mgbe ahụ ma gbuo onye Kaldea na-achị ya, bụ́ Belshaza. Ònye ga-aghọ onye ọchịchị mbụ nke obodo a e meriri ọhụrụ ugbu a? Onye amụma Chineke bụ́ Daniel, bụ́ onye nọ n’obodo ahụ mgbe ọ dara, dere, sị: “Daraịọs, bụ́ onye Midia, natara alaeze ahụ mgbe ọ gbara ihe ha ka [afọ iri isii na abụọ].”—Daniel 5:30, 31.

Ònye bụ Daraịọs? Ụdị onye ọchịchị dị aṅaa ka o gosịrị na ya bụ? Olee otú o si mesoo Daniel onye amụma, bụ́ onye a chụpụworo n’ala ha gaa Babilọn ruo ihe karịrị afọ 70?

EZE NKE NWERE AKỤKỌ NA-EZUGHỊ EZU

Akụkọ ihe mere eme banyere Daraịọs onye Midia ezughị ezu. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị Midia enweghị ihe ndekọ ọ bụla. Ọzọkwa, ọtụtụ narị puku nkume cuneiform ndị e gwupụtara n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-enye akụkọ na-ezughị ezu nke nwere ọtụtụ oghere. Ihe odide ochie ndị ọzọ ka dịnụ nke na-abụghị nke Bible dị ole na ole, e dekwara ha otu narị afọ ma ọ bụ karị mgbe ihe omume ndị metụtara Daraịọs gasịrị.

Ka o sina dị, ihe àmà na-enye echiche na mgbe o merisiri Akmeta, bụ́ isi obodo Midia, onye ọchịchị Peasia bụ́ Saịrọs nke Abụọ nwetara nkwado nke ndị Midia. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị Midia na Peasia lụkọrọ ọgụ ọnụ n’okpuru idu ndú ya. Banyere mmekọrịta ha, onye na-ede akwụkwọ bụ́ Robert Collins kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ The Medes and Persians, sị: “N’oge udo, ndị Midia na ndị Peasia hà nhata. E nyere ha ọkwá dị elu mgbe mgbe n’ọchịchị obodo na ọkwá idu ndú n’usuu ndị agha Peasia. Ndị ala ọzọ na-ezo aka n’ebe ndị Midia na Peasia nọ, n’egosighị ọdịiche ọ bụla n’etiti ndị e meriri emeri na ndị meririnụ.” Midia si otú ahụ jikọta onwe ya na Peasia ịghọ Alaeze Ukwu Medo-Peasia.—Daniel 5:28; 8:3, 4, 20.

N’ezie ndị Midia keere òkè gbara ọkpụrụkpụ ná nkwatu Babilọn. Akwụkwọ Nsọ na-egosi “Daraịọs nwa Ahasuerọs, onye sitere ná mkpụrụ ndị Midia” dị ka eze mbụ nke Alaeze Ukwu Medo-Peasia chịrị Babilọn. (Daniel 9:1) Ike eze ya gụnyere ikike ime iwu “dị ka iwu nke Midia na Peasia si dị, nke na-adịghị agabiga.” (Daniel 6:8) Ihe Bible na-ekwu banyere Daraịọs na-emekwa ka anyị hụperetụ ụdị mmadụ ọ bụ nakwa ezi ihe mere na e nweghị ihe ọmụma na-abụghị nke Bible banyere ya.

DANIEL ENWETA IHU ỌMA

N’oge na-adịghị anya mgbe ọ malitesịrị ịchị na Babilọn, Daraịọs doro ‘[otu narị mmadụ na iri abụọ] bụ́ ndị nọchiri anya eze, ndị ga-anọ n’alaeze ahụ nile,’ ka Bible na-ekwu, “na ido ndị isi atọ ndị isi ha, ndị Daniel bụ otu n’ime ha.” (Daniel 6:1, 2) Otú ọ dị, ọkwá dị elu nke Daniel nọ na ya na-ewekasị ndị isi ndị ọzọ ahụ ahụ. Obi abụọ adịghị ya na iguzosi ike n’ezi ihe ya mere ka nrụrụ aka kwụsị, bụ́ nke yikarịrị ka ọ na-akpasu ha iwe. Anyaụfụ aghaghịkwa imetụtawo ndị isi ahụ, ebe ọ bụ na eze nwere ihu ọma n’ebe Daniel nọ, na-echekwa echiche ime ya praịm minista.

N’ịbụ ndị nwere olileanya ịkwụsị ọnọdụ a, ndị isi abụọ ahụ na ndị ahụ nọchiri anya eze ji iwu gbaa ọnyà. Ha gara n’ihu eze ma gosi ya iwu nke ga-amachi ịrịọ “chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla arịrịọ” ma ọ bụghị nanị Daraịọs ruo ụbọchị 30, ka ọ bịanye aka na ya. Ha kwuru na e kwesịrị ịtụba onye ọ bụla mebiri iwu ahụ n’olulu ọdụm. E mere ka Daraịọs kwere na ndị isi ọchịchị nile nọ n’ọkwá dị elu ga-akwado iwu dị otú ahụ, atụmatụ ahụ yikwara ka ọ bụ ngosipụta nke nguzosi ike n’ihe ha nye eze.—Daniel 6:1-3, 6-8.

Daraịọs bịanyere aka n’iwu ahụ ma n’oge na-adịghị anya ọ hụrụ ihe si na ya pụta. Daniel ghọrọ onye mbụ mebiri iwu ahụ, ebe ọ bụ na ọ nọgidere na-ekpeku Jehova Chineke ekpere. (Tụlee Ọrụ 5:29.) A tụbara Daniel na-ekwesị ntụkwasị obi n’ime olulu ọdụm n’agbanyeghị mgbalị si n’ezi obi nke eze mere ịchọ ụzọ ịrọgharị iwu ahụ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. Daraịọs kwupụtara obi ike na Chineke Daniel nwere ikike nke ichebe ndụ onye amụma ahụ.—Daniel 6:9-17.

Mgbe ehighị ụra abalị nke ibu ọnụ gasịrị, Daraịọs ji ọsọ gaa n’olulu ọdụm ahụ. Lee obi ụtọ o nwere ịhụ na Daniel dị ndụ, na e merụghịkwa ya ahụ! Dị ka nkwụghachi ụgwọ n’ụzọ ikpe ziri ezi, eze mere ka a tụba ndị ahụ boro Daniel ebubo na ezinụlọ ha n’ime olulu ọdụm ahụ ozugbo. O nyekwara iwu na ‘n’ebe nile ọ bụla a na-achị n’alaeze ya, ka ndị mmadụ na-ama jijiji na-atụ egwu n’ihu Chineke nke Daniel.’—Daniel 6:18-27.

N’ụzọ doro anya, Daraịọs kwanyeere Chineke na okpukpe Daniel ùgwù ma nwee oké mmasị imezi ihe ahụ e mehiere. Ma, inye ndị boro Daniel ebubo ntaramahụhụ aghaghị ịkpataworị ibu iro nke ndị isi fọdụrụnụ. Ọzọkwa, nkwupụta Daraịọs nke na-enye ndị nile nọ n’alaeze ahụ dum iwu ‘ịtụ egwu n’ihu Chineke nke Daniel’ aghaghị ịkpatawo iwe dị ukwuu n’etiti ndị ndú okpukpe dị ike nke Babilọn. Ebe ọ bụ na ihe ndị a metụtara ndị odeakwụkwọ n’ezie, ọ gaghị abụ ihe mgbagwoju anya ma ọ bụrụ na a gbanwere ihe ndekọ ndị ahụ na-abụghị nke Bible iji wepụ ihe ọmụma banyere Daraịọs. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndekọ ahụ dị mkpirikpi n’akwụkwọ Daniel na-egosi Daraịọs dị ka onye ọchịchị ji ime ihe ziri ezi na ikpe ziri ezi akpọrọ ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya