ABỤ NKE 114
‘Na-enwenụ Ndidi’
Nke E Biri Ebi
(Jems 5:8)
1. Onyenw’anyị, Jehova,
Jia-ha ya dịn-sọ kpọr’ihe.
Jehova chọsir’ike
K’a kwụs’ikwutọ aha ya.
Ọ chọrọ k’e doo yan-sọ.
M’ọ n’eche k’oge ya ruo.
Ọ bụo-nye obie-bere.
Ọ hụr’anyị n’anya.
Ọ chọrọ k’a zọpụta
Ụdị ’madụ niile n’ụwa.
Ndidi ya bar’uru.
Ọ g’eme k’a zọpụt’anyị.
2. K’anyị n’efe Jehova,
K’anyị gbalịa n’enwen-didi.
Ọ g’eme k’anyị ghọta
N’iwe g’eme k’anyị mehie.
Anyị ga n’achọpụta
Àgw’ọma ’madụ nwere.
Ọ bụrụ n’anyị daam-bà,
Anyị g’ebilite.
Naanị ’mụọn-sọ Chineke
G’eme k’anyị n’enwen-didi.
Ọ g’eme k’anyị ṅomie
Ezi Chia-nyị bụ́ Jehova.
(Gụọkwa Ọpụ. 34:14; Aịza. 40:28; 1 Kọr. 13:4, 7; 1 Tim. 2:4.)