Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/11 p. 1
  • Ndidi Dị Anyị Mkpa n’Ozi Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndidi Dị Anyị Mkpa n’Ozi Anyị
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ṅomie Ndidi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Mụta Ihe N’otú Jehova na Jizọs Si Enwe Ndidi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ndidi
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Na-enwe Ndidi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 6/11 p. 1

Ndidi Dị Anyị Mkpa n’Ozi Anyị

1. Olee otú Jehova sirila gosi na ya na-enwere ndị mmadụ ndidi?

1 Chineke na-enwere ụmụ mmadụ ndidi. (Ọpụ. 34:6; Ọma 106:41-45; 2 Pita 3:9) Otu n’ime ihe ndị kacha egosi na Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya ma na-enwere ha ndidi bụ ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa n’ụwa niile. Jehova enweerela ụmụ mmadụ ndidi ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ ugbu a. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka na-enyere ndị chọrọ ife ya ofufe aka ka ha bịakwute ya. (Jọn 6:44) Olee otú anyị ga-esi eṅomi Jehova n’ozi anyị?

2. Olee otú anyị si egosi na anyị na-enwere ndị bi n’ókèala anyị ndidi?

2 Ozi Ụlọ n’Ụlọ: Anyị na-eṅomi Jehova ma ọ bụrụ na anyị na-ezi ndị na-anaghị ege anyị ntị ozi ọma “n’akwụsịghị akwụsị.” (Ọrụ 5:42) Ọ bụrụ na ndị bi n’ókèala anyị anaghị ege anyị ntị, ma ọ bụkwanụ na ha na-akwa anyị emo ma na-emegide anyị, anyị na-enwere ha ndidi ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ezi ha ozi ọma. (Mak 13:12, 13) Ọ bụrụkwa na anyị ana-agba mbọ na-agara ndị nwere mmasị n’ozi anyị nletaghachi, a sịgodị na ọ na-esi ike inweta ha n’ụlọ, ọ na-egosi na anyị na-enwere ha ndidi.

3. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị nweere ndị anyị na-agara nletaghachi na ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Baịbụl ndidi?

3 Ọmụmụ Baịbụl: Onye kọrọ ihe n’ala ga-enwere ihe ọ kọrọ ndidi. Ihe onye ahụ ga-emedebe bụ ihe ndị dị ka ịgba ya mmiri na ifo ya ahịhịa, ọ bụghị onye ahụ ga-eme ka o too. (Jems 5:7) Ọ bụkwa otu ihe ahụ na-eme ma anyị na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Ha agaghị amụtacha ihe niile dị na Baịbụl otu ụbọchị ma mewe ha ozugbo. (Mak 4:28) O nwere ike siere ha ike ịhapụ ihe a kụziiri ha n’okpukpe ha na-ekpe ma ọ bụkwanụ siere ha ike ịhapụ omenala na-adịghị mma ha si na nwata mewe. Anyị ekwesịghị ịmanye ha ka ha gbanwee. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị inwere ha ndidi ka Chineke jiri mmụọ ya gbanwee obi ha.—1 Kọr. 3:6, 7.

4. Olee otú ndidi ga-esi enyere anyị aka ịgbara ndị ikwu anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova àmà?

4 Ndị Ikwu Na-abụghị Ndịàmà Jehova: Ọ bụ eziokwu na anyị ga-achọ ka ndị ikwu anyị bụrụ Ndịàmà Jehova taa na echi, anyị kwesịrị inwere ha ndidi. Anyị kwesịrị ịgwa ha ihe Baịbụl kwuru n’oge dabara adaba, kwesịkwa ịkpachara anya ka anyị ghara ịgwa ha ọtụtụ ihe n’otu mgbe. (Ekli. 3:1, 7) Ma, anyị kwesịgodịrị iji àgwà ọma anyị mee ka ha mụta Baịbụl, dịrịkwa njikere mgbe niile iji nkwanye ùgwù na obi dị nwayọọ na-akọwara ha eziokwu dị na Baịbụl. (1 Pita 3:1, 15) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-enwere ndị mmadụ ndidi n’ozi anyị, anyị ga-eme nke ọma, obi ga-adịkwa Nna anyị nke eluigwe ụtọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya