NKEBI NKE ATỌ
‘M Ga-akpọkọta Unu’—E Kwere Nkwa na A Ga-eme Ka A Maliteghachi Ife Chineke Ezigbo Ofufe
IHE NKEBI A NA-EKWU: Amụma ndị Ezikiel buru gosiri na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe
Ndị Izrel nọ ná nsogbu. Ha adịghịzi n’otu maka na ha hapụrụ ife Chineke fewe arụsị. Ha na-ata ahụhụ maka ihe ọjọọ ndị ha mere. Ha tere aha Chineke unyi, metọọkwa ezigbo ofufe ha na-efe ya. N’oge ahụ nsogbu zuru ha ahụ́, Jehova mere ka Ezikiel buo amụma ndị gosiri ihe ọma Jehova ka ga-emere ha. Jehova ji ihe atụ dị iche iche na ọhụụ ndị na-emetụ n’ahụ́ o gosiri Ezikiel gbaa ndị Izrel a dọọrọ n’agha ume nakwa onye ọ bụla ọ na-agụ agụụ ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe.