NKEBI NKE ISE
“Mụ na Ha Ga-ebi”—A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
IHE NKEBI A NA-EKWU: Ihe ndị dị n’ụlọ nsọ a hụrụ n’ọhụụ na ihe ha na-akụziri anyị banyere ife Chineke ezigbo ofufe
N’ọhụụ Jehova gosiri Ezikiel onye amụma nakwa nke o gosiri Jọn onyeozi, e nwere ihe ndị yiri nnọọ ibe ha. Ihe ndị ha hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị ezigbo ihe ndị na-enyere anyị aka ife Jehova ugbu a otú ọ chọrọ, na-emekwa ka anyị mata otú ihe ga-adị na paradaịs ma Alaeze Chineke chịwa ụwa.