NKEBI NKE MBỤ
“Eluigwe Meghere”
IHE NKEBI A NA-EKWU: Ịmata ihe ụfọdụ na-eme n’ebe Jehova bi
E nweghị mmadụ nwere ike ịhụ Jehova Chineke onye pụrụ ime ihe niile ma dị ndụ. (Ọpụ. 33:20) Ma, Jehova mere ka Ezikiel hụ ọhụụ dị iche iche ndị gosiri ndị nọ ná nzukọ Jehova n’eluigwe. Ọhụụ ndị ahụ na-eme ka anyị na-atụ egwu Chineke. Ma, ọ na-emekwa ka obi na-atọkwu anyị ụtọ na anyị na-efe onye naanị ya bụ ezi Chineke.