Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • CO-pgm17 p. 7-8
  • Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma
  • 2017 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NZUKỌ NDỊ PỤRỤ ICHE
  • IHE NDỊ BỊARA MGBAKỌ KWESỊRỊ ỊMA
  • Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma
    2018 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu
  • Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma
    2019 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu
  • Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma
    2020 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu
  • Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma
    2024 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu
Lee Ihe Ndị Ọzọ
2017 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu
CO-pgm17 p. 7-8

Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma

NZUKỌ NDỊ PỤRỤ ICHE

OZI BETEL Ndị nkwusa e mere baptizim bí na Naịjirịa, ndị na-agafebeghị afọ iri atọ na ise, ma nwee mmasị ije ozi na Betel, kwesịrị ịga nzukọ a ga-enwe n’ụtụtụ Fraịdee maka ndị chọrọ itinye akwụkwọ maka ozi Betel. A ga-ama ọkwa ebe a ga-enwe nzukọ a na oge ọ ga-abụ.

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA ALAEZE N’ụtụtụ Sọnde, a ga-enwe nzukọ maka ndị chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-Ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ndị ọsụ ụzọ chọrọ ijikwu oge buru ibu na-ejere Jehova ozi nwere ike ịbịa nzukọ a. Ha ga-abụ ndị nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ na afọ iri isii na ise. A ga-ama ọkwa ebe a ga-enwe nzukọ a na oge ọ ga-abụ.

IHE NDỊ BỊARA MGBAKỌ KWESỊRỊ ỊMA

BAPTIZIM Ndị a ga-eme baptizim kwesịrị ịnọrọ ọdụ n’ebe e debeere ha oche tupu a malite ikwu okwu baptizim n’ụtụtụ Satọdee. Ha ga-anọ ọdụ n’oche ndị dị n’ihu ihu n’ụlọ mgbakọ, n’ebe chere ikpo okwu ihu. Onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị iweta ákwà ọ ga-eji hichaa ahụ́ na uwe kwesịrị ekwesị ọ ga-eyi mgbe a na-eme ya baptizim.

EBE A NA-ANARA ỌGWỤ Biko, buru n’uche na ebe a bụ NAANỊ maka NDỊ E KWESỊRỊ ILEBARA ANYA NGWA NGWA.

EBE A NA-EDEBE IHE FURU EFU Ọ bụrụ na ị hụ ihe ọ bụla furu efu, wega ya n’Ebe A Na-edebe Ihe Furu Efu. Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla funahụrụ gị, gaa na ngalaba a ka ị mara ma ọ̀ dị ebe ahụ. Ị hụ nwatakịrị furu efu, biko, kpọga ya ná ngalaba a. Ma, ọ pụtaghị na ọrụ ngalaba a bụ ilekọta ụmụaka. Biko, lekọta ụmụ gị, hụkwa na gị na ha nọ.

INWETA OCHE Biko, na-echebara ndị ọzọ echiche. Cheta na ọ bụ naanị ndị gị na ha bi n’otu ụlọ, ma ọ bụ ndị gị na ha ji otu ụgbọala bịa, ma ọ bụkwanụ ndị ị na-amụrụ Baịbụl ka i nwere ike inwetara oche. Biko, edosala ihe n’elu oche ma ọ bụrụ na o nweghị onye ị na-enwetara oche ahụ.

NDỊ ATENDANTỊ Ọrụ ndị atendantị bụ inyere gị aka. Biko, na-erubere ha isi ma ha gwa gị ebe ị ga-adọwa ụgbọala, ebe ị ga-esi banye n’ala mgbakọ, ebe ị ga-esi pụọ, ebe ị ga-anọ ọdụ, na ihe ndị ọzọ

ONYINYE E mefuru nnukwu ego iji hụ na e nwere oche ga-ezu ndị bịara mgbakọ a, na ígwè okwu, na tiivi na vidio kamera, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ga-eme ka mgbakọ a tọọ gị ụtọ, ma mee ka i nwee ike ịbịarukwu Jehova nso. Ọ bụrụ na i nye onyinye si gị n’obi, a ga-eji ya kwụọ ụgwọ ihe e mefuru, jirikwa ya na-akwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile. E dewere igbe onyinye n’ebe niile n’ala mgbakọ a ka i nwee ike itinye onyinye gị na nke ọ bụla dị gị nso. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe ọ bụla i tinyere. Òtù Na-achị Isi na-ekelekwa gị maka otú i si jiri onyinye gị na-akwado ihe ndị gbasara Alaeze Chineke.

OZI AFỌ OFUFO Ọ bụrụ na ị chọrọ iwepụta onwe gị iso na-arụ ọrụ ndị a ga-arụ ná mgbakọ a, biko, jee na ngalaba a ka a gwa gị ebe ị ga-enye aka.

Ọ bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova haziri ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya