IHE NDỊ ỌZỌ A KỌWARA—NKE CH
Otú E Si Eji Akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi Amụrụ Mmadụ Baịbụl
E kpere ekpere, meekwa ezigbo nchọnchọ tupu e bipụta akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka akwụkwọ a baara gị ezigbo uru, mee ihe ndị a ma ị mụwara mmadụ ihe.
Tupu gị amụwara mmadụ ihe
1. Kwadebe nke ọma. Ka ị na-akwadebe, chee gbasara ihe bụ́ mkpa onye ị na-amụrụ Baịbụl, otú ihe si dịrị ya, nakwa ihe ndị o kweere. Chee gbasara ihe ndị nwere ike isiri ya ike nghọta ma ọ bụ ime. Cheekwa otú ihe ndị dị n’ebe a kpọrọ “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya” nwere ike isi nyere onye ị na-amụrụ ihe aka. Jirizie ya nyere ya aka mgbe unu na-amụ ihe.
Unu mụwa ihe
2. Jiri ekpere malite, jirikwa ya mechie, ọ gwụkwala ma ọ̀ bụ na onye ị na-amụrụ ihe achọghị.
3. Kpachara anya ka ị ghara ikwu ọtụtụ okwu. Lekwasị anya n’ihe ndị e dere n’ebe unu na-amụ, hapụkwa onye ị na-amụrụ ihe ka ọ na-ekwu obi ya.
4. Unu malite ịmụ nkebi nke ọ bụla, gụọ ebe e dere isi ihe a ga-amụ ná nkebi ahụ, kwuokwa isiokwu ụfọdụ dị na ya.
5. Unu mụchaa nkebi nke ọ bụla, jiri ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ ná nkebi ahụ nyere onye ị na-amụrụ ihe aka icheta eziokwu ndị ọ mụtara.
6. Ka gị na onye ị na-amụrụ ihe na-amụ isi nke ọ bụla:
a. Gụọnụ paragraf dị na ya.
b. Gụọnụ amaokwu Baịbụl niile e dere “Gụọ.”
ch. Gụọkwanụ amaokwu ndị ọzọ mgbe ọ dị mkpa.
d. Leenụ vidio niile e kwuru ka e lee (ma ọ bụrụ na i nwere ha).
e. Jụọ onye ị na-amụrụ ihe ajụjụ nke ọ bụla.
f. Gwa onye ị na-amụrụ ihe ka o lee foto ndị dị ná nkebi a kpọrọ “Mụtakwuo Ihe.” Gwakwa ya ka ọ kọwaa ha.
g. Jiri igbe bụ́ “Ihe Ị Ga-agba Mbọ Mee” nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịmata ma ọ̀ na-emekwa nke ọma. I nwere ike ịgba ya ume ka o mee nke e dere ebe ahụ, ma ọ bụ ka o jiri aka ya kpebie ihe ọzọ ọ ga-eme, ma ọ bụkwanụ ya emee ha abụọ.
gb. Jụọ onye ị na-amụrụ ihe ma è nwere isiokwu ma ọ bụ vidio dị n’ebe a kpọrọ “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya” masịrị ya mgbe ọ na-akwadebe ọmụmụ ihe ya.
gh. Gbalịa ka unu mụchaa otu isiokwu n’otu oge.
Unu mụchaa ihe
7. Na-eche gbasara onye ị na-amụrụ ihe. Rịọ Jehova ka o nyere ya aka ịna-eme nke ọma nakwa ka o nyere gị aka ịma otú ị ga-esi enyere ya aka.