Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 2/1 p. 10-14
  • Ịmata Onye “Onye Ahụ Na-emebi Iwu” Bụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmata Onye “Onye Ahụ Na-emebi Iwu” Bụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmalite nke Onye ahụ Na-emebi Iwu
  • Ịmata Onye Onye Mmebi Iwu ahụ Bụ
  • Na-ebuli Onwe Ha Elu
  • Nnupụisi Megide Ezi Ofufe
  • Òtù Ndị Ụkọchukwu Akwụkwọ Nsọ Na-akwadoghị Ebilite
  • Ozizi Ndị Ọgọ Mmụọ
  • Usoro Ndị Popu
  • Ikpe Chineke Megide “Onye Ahụ Na-emebi Iwu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • A Ga-ekpughe Onye Ahụ Na-emebi Iwu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Kraịst Kpọrọ Mmebi Iwu Asị—Ị̀ Kpọrọ Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ikpughe “Onye Ahụ Na-emebi Iwu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 2/1 p. 10-14

Ịmata Onye “Onye Ahụ Na-emebi Iwu” Bụ

“A ga-ekpughekwa onye ahụ na-emebi iwu, onye Onyenwe anyị Jisọs (ga-egbu).”—2 NDỊ TESALONAỊKA 2:8.

1, 2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata onye onye ahụ na-emebi iwu bụ?

ANYI na-ebi n’ime ọgbọ nke mmebi iwu. Ọ bụ ihe a na-ahụ n’ụwa nile. N’ebe nile a na-atụ egwu ndị mmebi iwu na iyi egwu ha na-eweta nye ndụ na ihe onwunwe anyị. Ma n’agbanyeghị ihe a nile, e nwere onye mmebi iwu zoro ezo nke nọworo na-arụ ọrụ ruo ọtụtụ narị afọ. N’ime Bible, a kpọrọ ya “onye ahụ na-emebi iwu.”

2 Ọ dị mkpa ka anyị mara onye onye a na-emebi iwu bụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na o kpebisiri ike imebi ezi nguzo anyị nwere n’ebe Chineke nọ na olileanya anyị nke inweta ndụ ebighị ebi. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ime ka anyị gbakụta eziokwu ahụ azụ wee kwere okwu ụgha n’ọnọdụ ya, wee si otú a na-adọpụ echiche anyị site n’ife Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:23) Ọ pụtara ìhè site n’omume ya nile na onye mmebi iwu nke a na-emegide Chineke na nzube ya nile, na-emegidekwa ndị ya raara onwe ha nye.

3. Olee otú Bible si adọrọ uche anyi gaa n’ebe onye mmebi iwu ahụ nọ?

3 Bible na-akọ banyere onye mmebi iwu nke a ná 2 Ndị Tesalonaịka 2:3. N’ịbụ onye mmụọ Chineke kpaliri, Pọl onyeozi dere, sị: “Unu ekwela ka onye ọ bụla ghọgbuo unu n’ụzọ ọ bụla: n’ihi na [ụbọchị Jehova maka ibibi ajọ usoro ihe nke a] agaghị adị, ma ọ bụrụ na mwezuga ahụ ebughị ụzọ bịa, e wee kpughee onye ahụ na-emebi iwu.” N’ebe a, Pọl buru amụma na mwezuga n’ezi ofufe ga-ebilite, na otu onye na-emebi iwu ga-apụta tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. N’eziokwu, Pọl kwuru n’amaokwu 7, sị: “Ihe omimi nke mmebi iwu na-arụsi ọrụ ike ugbu a.” Ya mere, n’ime narị afọ mbụ ahụ, onye mmebi iwu nke a ama-liteworị igosipụta onwe ya.

Mmalite nke Onye ahụ Na-emebi Iwu

4. Ònye bụ nna na onye nkwado nke onye mmebi iwu ahụ?

4 Ònye malitere ma na-akwado onye nke a na-emebi iwu? Pọl zara, sị: “[Ịdị adị nke onye ahụ na-emebi iwu bụ] dị ka ịrụsi ọrụ ike nke Setan n’ike nile ọ bụla na ihe ịrịba ama dị iche iche na ọrụ ebube dị iche iche nke ụgha, na aghụghọ nile kwa nke ajọ omume n’ebe ndị na-ala n’iyi nọ; n’ihi na ha anaraghị ịhụnanya nke eziokwu nke ọma, ka e wee zọpụta ha.” (2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10) Ya mere ọ bụ Setan bụ nna na onye na-akwado onye mmebi iwu ahụ. Dịkwa nnọọ ka Setan na-emegide Jehova, nzube Ya nile, na ndị Ya, otú ahụ ka ọ dịkwa onye mmebi iwu ahụ, ma ọ̀ ghọtara ya ma ọ bụ na ọ̀ ghọtaghị.

5. Ajọ ọdịnihu dị njọ dị aṅaa na-echere onye mmebi iwu ahụ na ndị na-eso ya?

5 Ndị ahụ na-esonyere onye mmebi iwu ahụ ga-ata otu ụdị ahụhụ ahụ ọ gaje ịta—mbibi: “A ga-ekpughekwa onye ahụ na-emebi iwu, onye Onyenwe anyị Jisọs [ga-egbu] . . . werekwa ngosi nke ọnụnọ ya mee ka ọ ghara ịdị irè.” (2 Ndị Tesalonaịka 2:8) Oge ahụ maka mbibi nke onye ahụ na-emebi iwu na ndị na-akwado ya (“ndị na-ala n’iyi”) ga-abịa n’oge na-adịghị anya “n’ime mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi nke ike ya, n’ime ọkụ na-ere ere, na-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs: bú mmadụ ndị ga-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, bụ́ mbibi ebighị ebi.”—2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9.

6. Ihe ọmụma ọzọ dị aṅaa ka Pọl nyere banyere onye mmebi iwu ahụ?

6 Pọl gara n’ihu ịkọwa onye mmebi iwu nke a, na-asị: “Onye na-emegide na-ewelikwa onwe ya elu imegide ihe nile a na-akpọ Chineke ma ọ bụ nke bụ ihe a na-asọpụrụ dị ka Chineke; ya mere ọ na-anọdụ n’ụlọ nsọ nke Chineke, na-egosi onwe ya sị na ya bụ Chineke.” (2 Ndị Tesalonaịka 2:4) Ya mere Pọl na-adọ aka ná ntị na Setan gaje iguzobe otu onye nke na-emebi iwu, ihe ụgha a ga-enye ofufe, onye ga-ewere onwe ya n’ihe dị elu ọbụna karịa iwu Chineke.

Ịmata Onye Onye Mmebi Iwu ahụ Bụ

7. Gịnị mere anyị ji ekwubi na Pọl anaghị ekwu banyere otu onye, gịnịkwa ka onye mmebi iwu ahụ na-anọchi anya ya?

7 Pọl ọ̀ na-ekwu okwu banyere otu onye? Ee e, n’ihi na o kwuru na “onye” nke a pụtara ìhè n’oge Pọl, ọ gaje ịnọgidekwa na-adị adị ruo mgbe Jehova ga-ebibi ya n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Otú a, ọ nọwo na-adị adị ruo ọtụtụ narị afọ. N’ụzọ doro anya, ọ dịghị mmadụ nkịtị biworo ndụ ruo ogologo oge hà otú ahụ. Ya mere okwu ahụ bụ ‘onye mmebi iwu’ aghaghị ịnọchi anya otu òtù, ma ọ bụ ìgwè, nke ndị mmadụ.

8. Ònye bụ onye mmebi iwu ahụ, gịnịkwa bụ ụfọdụ ihe ndị e ji amata ya?

8 Olee ndị ka ha bụ? Ihe àmà na-egosi na ha bụ òtù ndị ụkọchukwu Krisendọm ndị dị mpako, na-enwekwa oké ọchịchọ, ndị guzobeworo onwe ha dị ka iwu nye onwe ha ruo ọtụtụ narị afọ ugbu a. A pụrụ ịhụta nke a site n’eziokwu ahụ bụ na e nwere ọtụtụ puku okpukpe na ịrọ òtù dị iche iche n’ime Krisendọm, nke ọ bụla na-enwe ndị ụkọchukwu nke ya, ma nke ọ bụla na-emegiderịta ndị ọzọ n’ihe gbasara ozizi ma ọ bụ omume. Ọnọdụ nkewa nke a bụ ihe àmà doro anya na ha adịghị agbaso iwu Chineke. (Tụlee Maịka 2:12; Mak 3:24; Ndị Rom 16:17; 1 Ndị Kọrint 1:10.) Otu ihe e ji mara okpukpe ndị a nile bụ na ha adịghị akuzi ozizi ndị dị na Bible, ebe ha mebiworo ụkpụrụ ahụ bụ: “Unu agabigala ihe e deworo n’akwụkwọ.”—1 Ndị Kọrint 4:6; leekwa Matiu 15:3, 9, 14.

9. Nkwenkwe ndị dị aṅaa na-adịghị n’akwụkwọ nsọ ka onye mmebi iwu ahụ jiworo dochie eziokwu dị iche iche nke Bible?

9 Ya mere, onye mmebi iwu nke a bụ onye ọtụtụ ndị mejupụtara: ndị ndú okpukpe nke Krisendọm. Aka ha nile, ma hà bụ ndị popu, ndị ụkọchukwu, ndị nna chọọchị, ma ọ bụ ndị okwuchukwu Protestant, dịcha ná mmehie nile nke okpukpe nke Krisendọm meworo. Ha ejiriwo eziokwu nile nke Chineke gbanwere okwu ụgha dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ, na-akuzi ozizi ndị ahụ na-adịghị n’akwụkwọ nsọ dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, ọkụ mmụọ, pọgatrị, na Atọ n’Ime Otu. Ha yiri ndị ndú okpukpe ahụ Jisọs gwara, sị: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ Ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. . . . Ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” (Jọn 8:44) Omume ha ekpughewokwa ha dị ka ndị mmebi iwu, n’ihi na ha na-ekere òkè n’ihe omume ndị na-emegide iwu nile nke Chineke. Nye ndị dị otú ahụ, Jisọs sịrị: “Si n’ebe m nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”—Matiu 7: 21-23.

Na-ebuli Onwe Ha Elu

10. Mmekorịta dị aṅaa ka onye mmebi iwu ahụ soworo ndị ọchịchi nwee?

10 Akụkọ ihe nnere eme na-egosi na ndị ahụ nọ n’òtù onye mmebi iwu nke a egosipụtawo ụdị mpako na nganga dị otú ahụ nke na ha apụtawo n’ezie ịgwa ndị ọchịchị ụwa ihe ha ga-eme. Site n’iji ozizi ‘ikike Chineke nyere ndị eze’ na-ezochi ihe ha bu n’uche, ndị ndú okpukpe azọrọwo na ha bụ ndị ogbugbo dị mkpa n’etiti ndị ọchịchị na Chineke. E kpubewo ndị eze na ndị ọchịchị alaeze dị iche iche okpu, chụtuokwa ndị ọzọ n’ọkwá, ha enwewokwa ike ịkpali ndị nkịtị ịkwado ma ọ bụ imegide ndị ọchịchị dị iche iche. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha asịwo, dị ka ndị isi nchụàjà ahụ bụ ndị Juu jụrụ Jisọs si kwuo: “Anyị enweghị eze ma ọ bụghị Sisa.” (Jọn 19:15) Ma, Jisọs kuziri n’ụzọ doro anya, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.”—Jọn 18:36.

11. Olee otú ndị ndú okpukpe siworo bulie onwe ha elu?

11 Iji bulie onwe ha elu ọbụna karịa ndị nkịtị, òtù onye mmebi iwu nke a amalitewo iyi ụdị uwe pụrụ iche, nke na-abụkarị uwe ojii. Ọzọkwa, ha ejiriwo ụdị ihe nile dị iche iche chọọ onwe ha mma, ya na okpueze, obe, na okpu ndị bishọp. (Tụlee Matiu 23:5, 6.) Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya enweghị ụdị uwe dị otú ahụ; ha na-eyi uwe otú ndị nkịtị na-esi eyi. Ndị ndú okpukpe ahụ anakwerewokwa ka a na-akpọ ha utu aha ndị dị ka “Father,” “Holy Father,” “Reverend,” “Most Reverend,” “His Excellency,” na “His Eminence,” bụ́ nke na-emekwa ka ha ‘na-ewelikwa onwe ha elu karịa onye ọ bụla.’ Ma, Jisọs kuziri banyere utu aha okpukpe nile, sị: “Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa.” (Matiu 23:9) N’ụzọ yiri nke ahụ, Elaịhu, mgbe ọ na-abara ndị ihu abụọ na-akasi Job obi mba, kwuru, sị: “Biko, ka m ghara ịhụ nwoke ọ bụla ihu ọma; m gaghị etukwa mmadụ aha.”—Job 32:21.

12. Ònye ka Pọl kwuru na ndị ndú okpukpe na-ejere ozi n’ezie?

12 Laa azụ n’oge Pọl, mgbe o kwuru na onye mmebi iwu ahụ amaliteworị ọrụ ya, o kwukwara banyere ndị ahụ na-egosipụta àgwà nke onye mmebi ahụ, sị: “N’ihi na mmadụ ndị dị otú a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ na-atụ ntụ, ndị na-eme onwe ha ka ha yie ndị ozi Kraịst. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya; n’ihi na Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere ọ bụghi ihe ukwu ma à sị na ndị na-ejere ya ozi na-emekwa onwe ha ka ha yie ndị na-eje ozi ezi omume; ndị ọgwụgwụ ha ga-adị ka ọrụ ha si dị.”—2 Ndị Kọrint 11:13-15.

Nnupụisi Megide Ezi Ofufe

13. Gịnị bụ mwezuga ahụ pụọ n’ezi ofufe nke Pọl buru n’amụma?

13 Pọl kwuru na onye mmebi iwu nke a ga-eso mwezuga n’ezi ofufe bilikọọ. N’eziokwu, ihe mgbaàmà mbụ Pọl nyere iji mee ka a mara òtù onye mmebi iwu nke a bụ na ‘ụbọchị Jehova [mgbe Jehova ga-ebibi ajọ usoro ihe ndị a] . . . agaghị adị ma ọ bụrụ na mwezuga ahụ ebughị ụzọ bịa.’ (2 Ndị Tesalonaịka 2:2, 3) Ma gịnị ka e bu n’uche site n’okwu ahụ bụ “mwezuga”? N’ebe a, ọ pụtaghị nnọọ ndaghachi azụ ma ọ bụ ndapụ nkịtị n’ihi ịda mbà ime mmụọ. Okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a maka nnwezuga pụọ n’ezi ofufe pụtara, gụnyere ihe ndị ọzọ, “mgbanwe ọnọdụ,” ma ọ bụ “nnupụisi.” Ọtụtụ nsụgharị dere okwu ahụ dị ka “nnupụisi.” Nsụgharị nke William Barclay dere, sị: “Ubọchị ahụ apụghị ịbịa ruokwa mgbe Oké Nnupụisi ahụ weresịrị ọnọdụ.” The Jerusalem Bible kpọrọ ya “oké nnupụisi ahụ.” Ya mere, n’ọnọdụ nke ihe Pọl na-akọwa, “mwezuga” pụtara nnupụisi megide ezi ofufe.

14. Olee mgbe mwezuga pụọ n’ezi ofufe malitere inwe ọganihu dị ngwa?

14 Olee otú mwezuga nke a, nnupụisi nke a, si bilite? Ná 2 Ndị Tesalonaịka 2:6, Pọl dere, gbasara ụbọchị ya, banyere “ihe na-egbochi” onye mmebi iwu ahụ. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ike mgbochi ndị ozi ahụ nwere. Onụnọ ha, tinyere onyinye ndị dị ike e nyere ha site ná mmụọ nsọ, gbochiri mwezuga n’ezi ofufe ịbụ ihe jupụtara n’ebe nile n’oge ahụ. (Ọrụ 2:1-4; 1 Ndị Kọrint 12:28) Ma mgbe ndị ozi ahụ nwụsịrị, n’ihe dị ka ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ ahụ, ihe mgbochi ndị ahụ apụsịwo.

Òtù Ndị Ụkọchukwu Akwụkwọ Nsọ Na-akwadoghị Ebilite

15. Ndokwa dị aṅaa ka Jisọs guzobere maka ọgbakọ ndị Kraịst?

15 Ogbakọ ahụ nke Jisọs guzobere tolitere n’ime narị afọ mbụ ahụ n’okpuru nduzi nke ndị okenye (ndị nlekọta) na ndị ohu na-eje ozi. (Matiu 20:25-27; 1 Timoti 3:1-13; Taịtọs 1:5-9) Ọ bụ n’ime ọgbakọ ka e si weta ndị a. Ha bụ ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, ndị na-enweghị ọzụzụ pụrụ iche dị ka ndị ọkà mmụta okpukpe, dị nnọọ ka Jisọs na-enweghị ọzụzụ dị otú ahụ. N’ezie, ndị iro ya chere, sị: “Onye a, ò si aṅaa mata akwụkwọ hie nne, n’ebe ọ dịghị mgbe ọ mụworo akwụkwọ?” (Jọn 7:15) N’ebe ndị ozi ahụ nọkwa, ndị ndú okpukpe chọpụtara otu ihe ahụ: “Ma mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu nke Pita na Jọn, mgbe ha ghọtakwara na ha bụ ndị na-amaghị ihe na ndị na-amụtaghị akwụkwọ hie nne, o ju ha anya; ha wee mata ha, na ha na Jisọs anọworị.”—Ọrụ 4:13.

16. Olee otú mwezuga ahụ si kpata ndapụ pụọ n’usoro ndị Kraịst nke narị afọ mbụ maka nhazi ọgbakọ?

16 Otú ọ dị, mwezuga n’ezi ofufe ahụ webatara echiche ndị a natara site n’aka ndị ndú okpukpe ndị Juu, e mesịakwa site n’aka òtù okpukpe ndị Rom na-agọ mmụọ. Ka oge na-aga, na ka isi n’ezi okwukwe na-adapụ na-ewere ọnọdụ, otu òtù ndị ụkọchukwu akwụkwọ nsọ na-akwadoghị bilitere. Onye popu nke e kpubere okpueze malitere ịchị òtù ndị kadinal, bụ́ ndị e sikwa n’etiti ọtụtụ narị ndị bishọp na ndị achịbishọp họpụtasịa, bụ́ ndị e sitere n’ịbụ ndị ụkọchukwu a zụrụ na seminari bulie gaa n’ọkwá ndị bishọp. Otú a, n’oge na-adịghị anya mgbe narị afọ mbụ gasịrị, òtù ndị ụkọchukwu bụ ihe omimi malitere ịchị achị n’ime Krisen-dọm. E meghị ka ọ̀tù nke a gbasoo ụkpụrụ nke ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nke ndị Kraịst narị afọ mbụ kama e mere ya ka ọ gbasoo ụkpụrụ nke usoro okpukpe ndị ọgọ mmụọ.

17. Ole mgbe, karịsịa, ka e mere ka ikike onye mmebi iwu ahụ siwanye ike?

17 Laarị azụ ruo narị afọ nke atọ O.A., e welawo ndị nkịtị kwere ekwe azụ gaa n’ọnọdụ nke ndị nọ n’ọkwá nke abụọ bụ́ ndị aghasa chọọchị. Onye ahụ na-emebi iwu nke wezugara onwe ya n’ezi ofufe ji nwayọọ nwayọọ weghara ike ọchịchị. E mere ka ike ọchịchị nke a siwanye ike n’oge onye ọchịchị ndị Rom bụ Constantine nọ n’ọkwá, karịsịa mgbe e nwesịrị Nzukọ nke Nicaea n’afọ 325 O.A. Mgbe ahụ e jikọtara Chọọchị na Ọchịchị ọnụ. Otú a, onye mmebi iwu ahụ—ndị ụkọchukwu Krisendọm —ghọrọ usoro ndị wezugara onwe ha n’ezi ofufe nke dịruworo ọtụtụ narị afọ bú ndị nupụrụ isi megide ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Iwu na ndokwa nile nke ha gbasoworo bụ nke ha, ọ bụghị nke Chineke.

Ozizi Ndị Ọgọ Mmụọ

18. Ozizi nkwulu ndị ọgọ mmụọ dịgasị aṅaa ka onye mmebi iwu ahụ gbasaworo?

18 Onye mmebi iwu ahụ ka na-apụta ọhụrụ gbazitekwara ozizi ndị ọgọ mmụọ. Dị ka ihe atụ, e ji otu chi dị Atọ n’Ime Otu nke bụ ihe omimi, nke a na-apụghị ịghọta aghọta, dochie anya Onye ahụ nke sịrị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: m gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m.” “Mụ onwe m bụ Jehova, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ma e wezuga nanị m ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” (Aịsaịa 42:8; 45:5) Iji ozizi nke mmadụ, ọbụna nke ndị ọgọ mmụọ, dochie anya eziokwu nile nke Chineke bụ nke gbasara ịgụnye okwu nkwulu ndị ọzọ: ife Meri dị umeala n’obi nke Bible ofufe dị ka “Nne nke Chukwu” nke Krisendọm! Otú a, ndị na-akwalite ozizi ụgha ndị dị otú ahụ, bụ́ ọ̀tù ndị ụkọchukwu, ghọrọ ndị kasị elu ‘n’ata’ ndị ahụ Setan kụrụ ịnwa ịkpagbu ezi mkpụrụ ahụ nke Kraịst kụrụ.—Matiu 13:36-39.

19. Olee otú o si bụrụ na Krisendọm etisasịwo eri ọtụtụ narị afọ, ma gịnị ka e meworo ka ọ nọgide na-adị?

19 Ka mburịta agha na nkewa dị iche iche na-ewere ọnọdụ, Krisendọm tisara gaa n’ọtụtụ narị okpukpe na ịrọ òtù okpukpe dị iche iche. Ma okpukpe ma ọ bụ ọ̀tù nke ọ bụla, e wezugakwa nanị ole na ole, jigidere nkewa nke ndị ụkọchukwu na ndị aghasa chọọchị. Otú a, onye mmebi iwu ahụ anọgidewo na-adị ruo taa. Ọ nọgidewokwa na-edo onwe ya n’ọkwá dị elu karịa ndị nkịtị, na-eyi uwe ndị pụrụ iche ma na-anara utu aha ndị dị elu. N’ụzọ doro anya, Pọl adịghị ekwubiga okwu ókè mgbe o kwuru na òtù onye mmebi iwu ahụ ga-enye onwe ya otuto, buliekwa onwe ya elu gaa n’ọnọdụ yiri nke Chineke.

Usoro Ndị Popu

20. Olee otú otu akwụkwọ ndị Katọlik si kọwaa popu?

20 Otu ihe atụ nke inye otuto dị otú ahụ bụ nke usoro ndị popu nke Rom. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu okpukpe dị iche iche nke Lucio Ferraris dere, bụ́ nke e bipụtara n’Italy, kọwara popu dị ka “onye nwere ùgwù na ịdị elu dị oké elu nke na ọ bụghịzi nanị mmadụ nkịtị kama, dị ka a pụrụ ikwu ya, ọ bụ Chineke, na Onye Nnọchianya nke Chineke.” Okpueze ya bụ okpueze dị okpukpu atọ, “dị ka eze nke eluigwe, nke ala na nke ọkụ ala mmụọ.” Otu akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Popu bụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, Chineke nke nọ n’elu ala, nanị onyeisi nke ndị nwere okwukwe n’ebe Kraịst nọ, eze kachasị ndị eze nile ọ bụla.” O kwukwara: “Mgbe ụfọdụ popu pụrụ ime ihe megidere iwu Chineke.” Ọzọ akwụkwọ bụ The New Catholic Dictionary kwuru banyere popu, sị: “Ndị nnọchianya ya na-ebutekwa ndị nnọchianya mba ndị ọzọ ụzọ.”

21. Gosipụta ọdịiche dị n’etiti omume popu na nke Pita na otu mmụọ ozi.

21 N’adịghị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs, popu na-eyikarị uwe ukwu pụrụ iche, na-anabatakwa ofufe nke ụmụ mmadụ. Popu na-ekwe ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye ya, susuo mgbaaka ya ọnụ, ma na-ebu ya n’ubu ha n’elu oche pụrụ iche. Lee ka ndị popu siworo bulie onwe ha elu n’ime ọtụtụ narị afọ ndị gara aga. N’ezie nke a bụ nnọọ ihe dị iche n’ịdị mfe na ịdị umeala n’obi nke Pita, onye gwara Kọniliọs, bú ọchịagha onye Rom ahụ onye gbunyere ikpere n’ala iji kpọọ isiala n’ụkwụ ya, sị: “Bilie, . . . ọ bụ nanị mmadụ nkịtị ka m bụ”! (Ọrụ 10:25, 26, Jerusalem Bible nke ndị Katọlik) Leekwa nke a si dị iche n’ebe mmụọ ozi ahụ nọ, bụ́ onye nyere Jọn onyeozi Mkpughe ahụ! Jọn nwara ịkpọ isiala n’ụzọ ife ofufe nye mmụọ ozi ahụ, ma mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Lezie anya ka ị ghara ime ya: abụ m ohu ibe gị, bụrụkwa ohu ibe nke ụmụnna gị, bụ́ ndị amụma, ha na ndị na-edebe okwu nile nke akwụkwọ a: kpọọ isiala nye Chineke.”—Mkpughe 22:8, 9.

22. Site n’ụkpụrụ Akwụkwọ nsọ dị aṅaa ka a pụrụ isi mata onye onye mmebi iwu ahụ bụ?

22 Ntụle nke a a na-atụle òtù ndị ụkọchukwu ọ̀ dị oké ike? Anyị pụrụ ịchọpụta nke a site n’itinye ụkpụrụ ahụ Jisọs nyere iji chọpụta ndị amụma ụgha: “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.” (Matiu 7:15, 16) Mgbe ahụ, gịnị bụ mkpụrụ nke ndị ụkọchukwu mịworo eri ọtụtụ narị afọ na n’ime narị afọ nke iri abụọ anyị a? Gịnị ga-abụ ajọ ọdịnihu nke onye mmebi iwu nke a, oleekwa ndị ga-eso keta ajọ ọdịnihu ahụ? Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị ahụ na-atụ egwu Chineke n’ezie nwere n’ihe banyere onye mmebi iwu nke a? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle isi ihe ndị a.

Ajụju maka Ntụleghachi:

◻ Gịnị ka onye mmebi iwụ ahụ bụ, oleekwa mgbe ọ pụtara ìhè?

◻ Olee otú Bible si mee ka a mara nna nke òtù mmebi iwu nke a?

◻ Olee otụ́ ndị ndú okpukpe siworo bulie onwe ha elu karịa ndị mmadụ?

◻ Ozizi na omume ndị e wezugara n’ezi ofufe dịgasị aṅaa bilitere site n’aka ndị ndú okpukpe?

◻ Olee otú àgwà ndị popu si dị iche pụọ na nke Pita na otu mmụọ ozi?

[Foto dị na peeji nke 14]

Pita onyeozi, n’adịghị ka ndị popu, ekweghị ka mmadụ kpọọ isiala nye ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya