AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ TESALONAỊKA 1-3
A Ga-ekpughe Onye Ahụ Na-emebi Iwu
Gịnị ka ihe ndị Pọl kwuru n’amaokwu ndị a pụtara?
“Ihe mgbochi” (amaokwu nke 6)—O nwere ike ịbụ ndịozi
“Kpughee” (amaokwu nke 6)—Mgbe ndịozi nwụchara, Ndị Kraịst adịgboroja malitere ịkụzi ihe ndị na-abụghị eziokwu na ime omume ndị gosiri na ha bụ ndị ihu abụọ
“Ihe omimi nke mmebi iwu a” (amaokwu nke 7)—“A matachaghị onye bụ́ “onye ahụ na-emebi iwu” n’oge Pọl
“Onye ahụ na-emebi iwu” (amaokwu nke 8)—Taa, ọ bụ ndị ụkọchukwu Krisendọm n’ozuzu ha
‘Onyenwe anyị Jizọs ga-egbu [onye ahụ na-emebi iwu], . . . site n’ime ka ọnụnọ ya pụta ìhè’ (amaokwu nke 8)—Jizọs ga-eme ka ọnụnọ ya dị ka Eze pụta ìhè mgbe ọ ga-ebibi ụwa Setan a, bibiekwa “onye ahụ na-emebi iwu”
Olee otú amaokwu Baịbụl ndị a si enyere gị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ebe ọ bụ na ọgwụgwụ adịla nso?