Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb18 Mach p. 7
  • “Na-echenụ Nche”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-echenụ Nche”
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Ga ‘Na-eche Nche’?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Kụzie Gbasara Ịmụrụ Anya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ụmụ Agbọghọ Ndị Maara Ihe na Ndị Nzuzu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ị̀ Na-ege Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
mwb18 Mach p. 7
Ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke Jizọs ji mee ihe atụ

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 25

“Na-echenụ Nche”

25:1-12

Ọ bụ eziokwu na Jizọs bu ndị e tere mmanụ n’obi mee ihe atụ ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke, ma, ihe ọ na-akụzi gbasakwara Ndị Kraịst niile. (w15 3/15 12-16) Baịbụl, sịrị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.” (Mat. 25:13) Ị̀ ga-akọwali ihe atụ a Jizọs mere?

  • Nwoke Na-alụ Nwaanyị Ọhụrụ (amaokwu nke 1)—Jizọs

  • Ụmụ agbọghọ nwere uche, dịkwa njikere (amaokwu nke 2)—Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị dị njikere iji obi ha niile na-arụ ọrụ e nyere ha ma na-enwu ka ndị na-enye ìhè ruo ọgwụgwụ (Fil. 2:15)

  • Mkpu ahụ: “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịala!” (amaokwu nke 6)—Ihe gosiri ọnụnọ Jizọs

  • Ụmụ agbọghọ nzuzu (amaokwu nke 8)—Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị gawara izute Nwoke Ahụ Na-alụ Nwaanyị Ọhụrụ ma ha anọgideghị na nche, ha anọgideghịkwa na-ekwesị ntụkwasị obi

  • Ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche jụrụ inyetụ ndị nke ọzọ mmanụ ha (amaokwu nke 9)—A kachaa ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi akara ikpeazụ, oge agaghịzi adị ha ga-eji enyere ndị nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi aka

  • “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere” (amaokwu nke 10)—Jizọs ga-abịa ikpe ikpe ná ngwụcha oké mkpagbu ahụ

  • Ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche sooro nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ banye n’oriri alụmdi na nwunye ahụ, e mechie ụzọ (amaokwu nke 10)—Jizọs ga-akpọrọ ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi gaa eluigwe, ma, ndị nke ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi agaghị aga eluigwe

Ihe atụ a anaghị agwa anyị na ọtụtụ ndị e tere mmanụ ga-akwụsị ikwesị ntụkwasị obi, nke ga-eme ka e dochie ha. Kama, e ji ya na-eme ka onye nke ọ bụla n’ime ha mata na ọ bụ ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-adị njikere ma nọrọ na nche ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ ga-adị nzuzu ma ghara ikwesị ntụkwasị obi. Jizọs gwara ha, sị: “Unu onwe unu, dịrịnụ njikere.” (Mat. 24:44) Ma, ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, Jizọs chọrọ ka anyị niile dị njikere iji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi ma nọrọkwa na nche.

Olee otú m si na-egosi na m nọ na nche?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya