Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
■ Onye Kraịst ò kwesịrị izere iṅụ kọfi na tea n’ihi na ha nwere ọgwụ ahụ na-eri mmadụ ahụ bụ caffeine n’ime ha?
Bible ekwughi ihe ọ bụla banyere kọfị ma ọ bụ tea. Ma ihe o kwuru pụrụ inyere onye Kraịst aka ikpebi ma ọ ga-aṅụ kọfi ma ọ bụ tea.
Ọgwụ ahụ bu caffeine puru imetụta uche na anụ ahụ. A na-aṅụ ọtụtụ nde iko kọfị na tea kwa ụbọchị, bụ nke dujere Dr. Melvin Konner ikwu, si: “N’ezie, [caffeine] pụrụ ịbụ ọgwụ na-emetụta uche a kasị jiri na-eme ihe n’ụwa.” Ọ pụrụ ime ka ahụ gbagaa mmadụ, mụbaa ọ̀tùtụ̀ mmiri ọgwu adrenaline dị n’ahụ mmadụ, meekwa ka ọbara na-agazu n’ahụ nke ọma karị ya na ka nri na-agbazekwa nke ọma karị. Eziokwu ahụ nke bụ na ọ bụ ọgwụ abụghi ihe na-ekpebi ma onye Kraist ò kwesịri ịjụ ihe ọṅụṅụ ndị caffeine di n’ime ha (kọfị, tea, ihe ọṅụṅụ cola, maté) ma ọ bụ ihe oriri (ndị dị ka chocolate).
Alcohol bụkwa ọgwụ nke purụ imetụta uche na anụ ahụ, ma gịnị ka Akwụkwọ nsọ kwuru banyere ya? Bible kwetara na mmanya (ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya) pụrụ ime ka “obi mmadụ ṅụria” ma ọ bụ gbanwee ọnọdụ nke mkpụrụ obi onye nọ n’ihe isi ike. (Abụ Ọma 104:15; llu 31:6, 7) Ma Okwu Chineke adịghị egosi na ndị na-efe ezi ofufe aghaghi izere ihe ọṅụṅụ nile na-aba n’anya. Ihe Bible katọrọ bụ iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghi ekwesị—iṅụbiga mmanya ókè. — Deuterọnọmi 21: 18-21; llu 20:1; Hosea 4:11; 1 Ndị Kọrint 5:11-13; 1 Pita 4:3.
Otú ọ dị, gịnị banyere ihe ahụ a na-ekwu nke bụ na ọgwụ caffeine pụrụ iri mmadụ ahụ? Ndị na-aṅụkarị kọfị, tea, ma ọ bụ maté pụrụ iwulite ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdabere na ha, ọ bụ ezie na a ka na-arụ ụka ma nke a ọ bụ idabere n’ọgwụ dị ka ndị ọkà mmụta ahụ ike si ele ya anya. Ma ọ dịghi ihe ọzọ, ha na-enwe mmetụta a na-enwe mgbe mmadụ na-adighị enwetakwa ihe ọ na-enwetabụ, dị ka isi ọwuwa ma ọ bụ ọchichọ igbọ agbọ, ma ọ bụrụ na a napụ ha ọ̀tụ̀tụ̀ caffeine ha na-enwetabu. N’ebe a, chetaghachikwa echiche Bible banyere ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Ọ bụ ezie na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eriwo ọtụtụ ndị ahụ, a machibidoghi ndị Kraist iwu iṅụ ya ma ọ bụrụ na ha aṅụọ ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị. Jisọs ṅụrụ mmanya; ọbuna na o mepụtara mmanya n’ụzọ ọrụ ebụbe n’oge otu oriri agbamakwụkwọ.— Matiu 26:29; Jọn 2:3-11.
Ma, onye Kraịst pụrụ iche na ọ ga-akara ya mma ka ọ ghara itinye onwe ya n’ihe ize ndụ nke ịghọ onye dabeere n’ọgwụ caffeine. Ọ bụrụ na ọ na-enwe ahụ mgbakasi mgbe ọ na-enwetaghi ọ̀tụ̀tụ̀ ọgwụ caffeine ọ na-enwetabu, ọ pụrụ itụle izere caffeine dị ka ngosipgta nke “njide onwe onye.” (Ndị Galetia 5:22, 23, NW) Ebe ọ bụ na Bible ekwughi ihe ọ bụla banyere izere ihe ọṅụṅụ ndị caffeine dị n’ime ha, mkpebi banyere kọfi ma ọ bụ tea bụ nke onye ọ bụla na-aghaghi ime n’onwe ya. Ọ dị mkpa imeru ihe n’ókè ma ọ bụrụ na onye Kraist na-aṅụ nke ọ bụla n’ime ha.—Tụlee Taịtọs 2:2.
Imeru ihe n’ókè dịkwa mkpa n’okwu metụtara ihe ize ndụ ahụ ike. E kwuwo okwu banyere ọtụtụ ihe ize ndụ dị n’itinye caffeine n’ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu (ma ọ bu site na kọfị, tea, ihe ọṅụṅụ cola di iche iche ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na ihe oriri ndị ọzọ). Ma, ka ihe ọmụmụ ụfọdụ na-ejikọta caffeine na ihe ize ndụ ahụ ike, ihe ọmụmụ ndị ọzọ yiri ka hà na-ekwu ihe megidere nke ahu.
Ezi uche nke di n’imeru ihe n’ókè pụtara ìhè n’ihe Bible kwuru banyere mmanụ aṅụ. Ọ bụ ihe dị ka e si kee ya, ịracha ya dị ka ihe na-akpali akpali nke na-enye ike bụkwa ihe kwekọrọ n’usoro okike (n’ụzọ na-eyighị mmadụ ikuba awụrụ ọku n’akpa ume ya). (1 Samuel 14:26, 27; Matiu 3:4) Otú ọ di, i pụrụ ida ọrịa site n’ịrachabiga ya ókè. Bible dọrọ aka ná ntị’, sì: “Ọ̀ bụ mmanụ aṅụ ka ị chọtaworo? Rachaa nke ga-ezuru gị; ka i wee ghara iriju ya afọ, wee gbọọ ya.”—Ilu 25:16, 27.
Ụfọdụ ndị apụghi ịracha mmanụ aṅu ma ọlị. N’otu aka ahukwa, n’ihi ihe metutara ahụ ike, ọ pụrụ idí mkpa ka ụfọdụ ndị zere ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, caffeine, ihe ndị e si ná mmiri ara ehi mepụta, ma ọ bu ihe oriri na ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ. Ndị ọzọ pụrụ izere ihe ndị ahụ n’ihi ọchịchọ onwe onye ha ma ọ bụ n’ihi echiche ndị mmadụ nwere n’ógbè ha, na-achọ ka ha ghara imejọ onye ọ bụla. Nke a na-echetara anyi okwu Pọl onyeozi: “Ọ bụrụ na ihe oriri emee ka nwanna m maa n’ọnyà, m gaghi eri anụ ma’ọlị ruo mgbe ebighi ebi, ka m ghara ime ka nwanna m maa n’ọnyà.”—1 Ndị Kọrint 8:13.
Ya mere, ka onye ọ bụla mee ihe kwekọrọ ná mkpebi nke onwe ya gharakwa iche na e kwesirị imanye ndị ọzọ ịgbaso mkpebi nke ya. Pọl dere, si: “Ka onye na-eri ihe ghara ikpọ onye na-adịghi eri ihe efu; ka onye na-adighi eri gharakwa ikpe onye na-eri ikpe: n’ihi na Chineke kpọbatara ya. Gi onwe gị nke na-ekpe onye na-ejere onye ọzọ ozi, ị̀ bụ onye?”—Ndị Rom 14:3, 4.