Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 3/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgidenụ ‘Na-ege Ya ntị’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Alaeze Chineke—Ị̀ Na-aghọta Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ndịàmà Jehova Hà Chere na Ọ Bụ Naanị Ha Na-ekpere Chineke Otú Ọ Chọrọ?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 3/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

■ Site na Matiu 7:13, 14 na Luk 13:24, ànyị kwesịrị ikwubi na ọbụna ná mbilite n’ọnwọ, ọtutụ mmadụ ga-ajụ ezi ofufe?

Ee e, amaokwu ndị a adịghị akwado nkwubị okwu ahụ. Kama nke ahu, ha metụtara kwomkwem inweta ndu n’Alaeze eluigwe.

Okwu Jisọs ahụ dị na Matiu 7:13, 14 bu akụkụ nke Ozizi Elu Ugwu ahụ. 0 kwuru, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla ịyị, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ ndị na-achọta ya.”

Ókè ka ukwuu n’ihe Jisos kwuru n’oge ahụ metụtara Alaeze eluigwe karịsịa. Dị ka ihe atụ, o ji okwu ndị a malite: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị ndị [maara mkpa na-akpa ha n’ime mmụọ, NW] n’ihi na alaeze nke eluigwe bụ nke ndị ahụ. “Ọ sịrị na ndị dị ọcha n’obi “ga-ahụ Chineke” nakwa na “alaeze eluigwe” bụ nke ndị ahụ “e sogbuworo n’ihi ezi omume.” (Matiu 5:3, 8, 10) N’ikpeazụ n’ime otu okwu ahụ, Jisọs kwuru banyere ụzọ ahụ dị obosara nke na-eduba n’ịla n’iyi na ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ. N’otu akụkụ, o kwukwara, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme ịhe nna m nke bi n’eluigwe na-achọ.”—Matiu 7:13, 14, 21.

Ihe Luk 13:24 pụtara yikwara nke ahụ, dị ka amaokwu ndị gbara ya gburugburu na-egosi, Jisos nyere ihe atụ abụọ banyere “alaeze Chineke.” E mesịa, a jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ndị a na-azọpụta [hà] dị mmadụ olè na ole?” Jisos zara, sị: “Jisienu ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na ọtụtụ mmadụ, ka m sị unu, ga-achọ ịba n’ime ya, ma ha a gaghị enwe ike.” “Ọtụtụ mmadụ” na-ezo aka n’ebe ndị ahụ rịọrọ ka a kpọbata ha mgbe e mechisịrị ụzọ ma kpọchie ya. Ndị a bụ ndị “na-arụ ọrụ ajọ omume” bụ́ ndị na-erughị eru isoro ‘Abraham, Aisak, na Jekọb na ndị amuma nile, nọrọ n’alaeze Chineke.’ “Ọtụtụ mmadụ” ahụ echewo na ha ga-abụ ndị mbụ “n’alaeze Chineke,” ma n’ezie ha ga-abụ ndị ikpeazu nke pụtara n’ụzọ doro anya, na ha agaghi anọ n’ime ya ma ọlị.-Luk 13:18-30.

Nghọta dị na gburugburu amaokwu ahụ na-egosi na Jisọs na-ekwu banyere ịbanye n’Alaeze eluigwe nke Chineke. Ndị ndú Juu laa azụ n’oge ahụ anoworị eri ogologo oge na-ama ụtọ ọnodu ihe ùgwú nke ịbụ ndị maara Okwu Chineke. Ha chere na ha bara ụba n’ụzọ ime mmụọ, bụrụkwa ndị ezi omume n’anya Chineke, nke dị iche n’ebe ndị nkịtị nọ, bụ́ ndị ha weere dị ka ndị dị ala. (Jọn 9:24-34) Ma, Jisọs kwuru na ndị ọna ụtụ, na ndị inyom na-akwa iko, bụ ndị natara ozi ya ma chegharịa pụrụ inwe nkwado nke Chineke.—Tụlee Matiu 21:23-32; Luk 16:14-31.

Ndị mmadụ nkịtị bụ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ n’ọnọdụ nke ịbụ ndị a nabatara dị ka ụmụ ime mmụo mgbe e meghepụrụ ọkpụkpọ nke eluigwe na Pentikọst nke afọ 33 O.A. (Ndị Hibru 10:19, 20) Ọ bụ ezie na ìgwè bara ụba nụrụ banyere Jisọs, ndị ahụ nakweere ya ma mesịa nweta olileanya nke eluigwe dị ole na ole. Ma a pụrụ iji ìgwè atụrụ nta nke ụmụ mmadụ e ji mmụọ nsọ mụta inata ụgwọ ọrụ ahụ tụnyere Jekọb isoro Jehova (Abraham ahụ Ka Ukwuu) na Ọkpara ya (nke Aisak sere onyinyo ya) rikọọ nri n’eluigwe. Nke ahụ n’ezie ruru eru mmadụ iji n’ihi ya jisie ike, ma ihe ka ọtụtụ ná ndị nụrụ ihe Jisọs kwuru emeghị otú ahụ.

N’ihi ya, n’amaokwu ahụ anyị pụrụ ịhụ ihe atụ abụọ ndị ahụ na okwu Jisọs (banyere mmadụ ole na ole ịbụ ndị nọ n’ụzọ ahụ dị mkpagịde nke na-eduga ná ndụ na ịbụ ndị a zọpụtara) metụtara n’ụzọ bụ isi inwe nnwapụta nke Chineke n’oge ahụ mgbe Ọ na-esetịpụ olileanya nke nḍụ eluigwe. Nanị ole na ole ndị nụrụ ozi nke eziokwu ahụ ma mụta ihe a chọrọ n’aka ha zaghachiri ma gosipụta onwe ha dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi.—Matiu 22:14; 24:13; Jọn 6:60-66.

Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na ọbụna taa mgbe e nwere akụkụ Bible nile nweekwa mmezu amụma dị iche iche nke Chineke banyere mgbe ikpeazụ n’ụzọ bara ụba, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ma e jiri ha tụnyere ndị ọzọ, na-ege ntị n’ozi ndị Kraịst ma na-anọgide n’ijere Jehova ozi. Nke a kwekọrọ n’ihe atụ Jisọs banyere ụdị ala dị iche iche. O kwuru na ụfọdụ ndị ga-anụ “okwu alaeze eluigwe,” ma Setan ga-apụnara ha ihe a ghaworo. Ndị ọzọ ga-eji ọṅụ nata okwu ahụ ma, ka oge na-aga ha ga-ada n’ihi mkpagbu ma ọ bụ nsogbu. Ma ndị ọzọ ga-egosi onwe ha ndị na-adịghị amị mkpụrụ n’ihi “nchegbu nke oge a na aghụgḥọ nke akụ.”—Matiu 13:18-23.

Ọ pụrụ ido anyị anya na a ga-enwe ọdịiche mgbe a ga-eme ka nde kwuru nde bilite n’ọnwu n’Ụbọchị Ikpe ahụ. Mgbe ahụ Setan agaghị enwere onwe ya ịpụnara mkpụru nke eziokwu ahụ a ghaworo n’ime obi ha. Ha agajeghị ịhụ ahụhụ nsogbu ma ọ bụ nchegbu nke ajọ usoro ihe dị ugbu a. A ga-ezi ha ihe n’okpuru ọnọdụ nke ezi omume, nke ọrụ ebube nke Chineke gbara gburugburu, tinyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ na ọgwụgwọ nke mba nile. O kwere nghọta, na mmadụ ụfọdụ agaghị aṅa ntị ọbụna mgbe ahụ. (Tụlee Jọn 11:45-53.) Ma e nwere ezi ihe mere a ga-eji chee na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-aghọta ihe okwu ahụ bụ, gee ntị na ya, ma bụrụ ndị a zọpụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya