Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/1 p. 16-21
  • Alaeze Chineke—Ị̀ Na-aghọta Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alaeze Chineke—Ị̀ Na-aghọta Ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ịghọta Alaeze Ahụ’
  • Ibu Ọrụ na Nghọta Na-eso
  • Inyocha Onwe Anyị n’Ihe Banyere Alaeze Ahụ
  • “Ndị Ajọ Omume Agaghị Eketa Alaeze Chineke”
  • Ihe Jizọs Kụziri Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ihe Alaeze Chineke Pụrụ Ịpụta nye Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Eziokwu Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Alaeze Chineke Na-achị
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/1 p. 16-21

Alaeze Chineke—Ị̀ Na-aghọta Ya?

“Onye a ghakwara n’ala ahụ dị mma, mmadụ a bụ onye na-anụ okwu ahụ, wee ghọta ya.”—MATIU 13:23.

1. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime nkweta zuru ebe nile banyere “alaeze eluigwe”?

Ị̀‘GHỌTAWO’ ihe Alaeze Chineke bụ? Echiche ndị e nwere banyere “alaeze eluigwe” adịwo iche n’ụzọ dị ukwuu kemgbe ọtụtụ narị afọ. Otu nkweta zuru ọnụ n’etiti ụfọdụ ndị òtù chọọchị taa bụ na Alaeze ahụ bụ ihe Chineke na-etinye n’ime obi mmadụ n’oge ntọghata ya. Ndị ọzọ na-eche na ọ bụ ebe ndị ọma na-aga mgbe ha nwụsịrị ije kporie ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma ndị ọzọ na-azọrọ na Chineke ahapụworo ya ụmụ mmadụ iweta Alaeze ahụ n’elu ala site na ha ịrụ ọrụ ịkụbanye ozizi na omume ndị Kraịst n’ihe omume ọha mmadụ na nke gọọmenti.

2. Bible ò si aṅaa akọwa Alaeze Chineke, gịnịkwa ka ọ ga-arụzu?

2 Otú ọ dị, Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na Alaeze Chineke abụghị òtù dị n’elu ụwa. Ọ bụghị ọnọdụ obi nke ọ na-abụkwanụ ime ọha mmadụ nile ndị Kraịst. N’eziokwu, nghọta ziri ezi nke ihe Alaeze a bụ na-eduje ná mgbanwe ndị dị ukwuu ná ndụ nke ndị tinyere okwukwe n’ime ya. Ma Alaeze ahụ n’onwe ya bụ ọchịchị eluigwe nke Chineke guzobere nke ga-emezu uche Chineke, na-ekpochapụ mmetụta nile nke mmehie na ọnwụ ma na-eweghachi ọnọdụ ezi omume n’elu ala. Alaeze ahụ amalitelarị ọchịchị n’eluigwe, n’oge na-adịghịkwa anya “ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [nke mmadụ] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44; Mkpughe 11:15; 12:10.

3. Mgbe Jisọs malitere ozi ya, gịnị ka e megheere ụmụ mmadụ?

3 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells dere, sị: “Ozizi nke Alaeze Eluigwe nke a, nke bụ ozizi bụ isi nke Jisọs, nakwa nke keere òkè dị nnọọ nta n’ime usoro ozizi ndị Kraịst, bụ n’ezie otu n’ime ozizi dị iche n’ụzọ bụ isi nke nọgidere na-akpali ma na-agbanwe echiche nke ndị mmadụ.” Siterị ná mmalite, isiokwu nke ozi Jisọs bụ: “Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:17) Ọ nọ n’ebe ahụ n’elu ala dị ka Eze e tere mmanụ, ọṅụ nke kachasịkwa ọṅụ, a na-emeghere ụmụ mmadụ ụzọ ugbu a ọ bụghị nanị iji kere òkè ná ngọzi nile nke Alaeze ahụ kamakwa isoro Jisọs bụrụ ndị ọchịchị na ndị nchụàjà n’Alaeze ahụ!—Luk 22:28-30; Mkpughe 1:6; 5:10.

4. Na narị afọ mbụ, olee otú ìgwè mmadụ si zaghachi ‘n’ozi ọma nke alaeze,’ na-eduje n’ikpe dị aṅaa?

4 Ọ bụ ezie na ọ bụ ìgwè mmadụ nụrụ “ozi ọma nke alaeze ahụ” na-akpali akpali, ọ bụ nanị ole na ole kwetara. Nke a bụ n’otu akụkụ n’ihi na ndị ndú okpukpe “[emechiwo] ụzọ alaeze eluigwe n’ihu mmadụ.” Ha “wepụrụ mkpịsị ugodi nke ọmụma ihe” site n’ozizi ụgha ha dị iche iche. N’ihi na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ jụrụ Jisọs dị ka Mesaịa na Eze ahụ e tere mmanụ nke Alaeze Chineke, Jisọs gwara ha, sị: “A ga-anara unu alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya.”—Matiu 4:23; 21:43; 23:13; Luk 11:52.

5. Olee otú ihe ka ukwuu ná ndị nụrụ ihe ịma atụ nile nke Jisọs si gosi na ha ejighị nghọta nụ?

5 Mgbe ọ na-ezi ìgwè mmadụ dị ukwuu ihe n’otu oge, Jisọs, dị ka o si eme, jiri ọtụtụ ihe atụ mee ihe iji nwalee ìgwè mmadụ ahụ na iwepụsị ndị nwere nanị mmasị elu ọnụ n’Alaeze ahụ. Ihe ịma atụ nke mbụ metụtara onye ọgha mkpụrụ nke ghara mkpụrụ n’ụdị ala anọ. Atọ ndị nke mbụ adịghị mma maka ihe ọkụkụ ndị na-eto eto, ma nke ikpeazụ bụ ‘ala dị mma’ nke mịpụtara mkpụrụ dị mma. Ihe ịma atụ ahụ dị mkpirikpi jiri agbamume bụ́: “Onye nwere ntị, ya nụ” wee mechie. (Matiu 13:1-9) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nọ n’ebe ahụ ṅara ntị n’ihe o kwuru, ma ha ‘anụghị’ ya. Ha enweghị nkwali ọ bụla, ezi mmasị ọ bụla n’ịmata otú mkpụrụ a ghara n’ụdị ọnọdụ dị iche iche si yie Alaeze eluigwe. Ha laghachiri n’ebe obibi ha dị iche iche ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị, ikekwe na-eche na ihe ịma atụ nile nke Jisọs bụ nanị akụkọ ọma ndị na-akụzi ụkpụrụ omume ọma. Lee nghọta dị omimi, leekwa ihe ùgwù na ohere magburu onwe ha ndị funahụrụ ha n’ihi na obi ha azaghachighị!

6. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị ndị na-eso ụzọ Jisọs ka e nyere nghọta nke “ihe omimi alaeze”?

6 Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ unu ka e nyeworo ịmara ihe omimi alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ.” N’ihota Aịsaịa, o kwukwasịrị: ‘N’ihi na obi ndị nke a mara abụba, ntị ha kpọchikwara, ha kpuchikwara anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ ma eleghị anya, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka M gharakwa ime ka ahụ dị ha ike. Ma ngọzi na-adịrị anya unu, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ; na ntị unu, n’ihi na ha na-anụ ihe.’—Matiu 13:10-16; Mak 4:11-13.

‘Ịghọta Alaeze Ahụ’

7. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ‘ịghọta’ Alaeze ahụ?

7 Jisọs rụtụrụ nsogbu ahụ aka. O metụtara ‘ịghọta’ ozi Alaeze ahụ. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha nọ nanị ha, sị: ‘Ya mere, unu onwe unu nụ ilu nke ọgha mkpụrụ ahụ. Mgbe onye ọ bụla nụrụ okwu alaeze eluigwe, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ abịa, pụnara ihe a ghaworo n’obi ya.’ Ọ gara n’ihu ịkọwa na ụdị ala anọ ahụ nọchiri anya ọnọdụ obi dị iche iche ebe a ga-agha “okwu alaeze” ahụ.—Matiu 13:18-23; Luk 8:9-15.

8. Gịnị gbochiri “mkpụrụ” ahụ a ghara n’ụdị ala atọ ndị mbụ ahụ ịmịpụta mkpụrụ?

8 “Mkpụrụ” ahụ dịcha mma n’ọnọdụ nke ọ bụla, ma mkpụrụ ọ ga-amịpụta ga-adabere n’otú ala dị. Ọ bụrụ na ala nke obi yiri ụzọ na-ekwo ekwo, nke a zọsiri ike, nke e ji ọtụtụ ihe omume na-abụghị nke ime mmụọ mee ka o sie ike, ọ ga-adị mfe nye onye na-anụ ozi Alaeze ahụ ịgọpụ onwe ya, na-ekwu na ohere adịghị maka Alaeze ahụ. Mkpụrụ ahụ e leghaara anya bụ nke a pụrụ ịpụnara n’ụzọ dị mfe tupu ọ gbanye mkpọrọgwụ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na a ghara mkpụrụ ahụ n’obi nke yiri ala nkume? Mkpụrụ ahụ nwere ike ipu, ma ọ ga-esiri ya ike ime ka mkpọrọgwụ ya bamie ime maka inweta ihe oriri na ịkwụsi ike. Olileanya nke ịbụ ohu Chineke na-erube isi, karịsịa n’okpomọkụ nke mkpagbu, ga-abụ ihe ịma aka na-erikpu erikpu, onye ahụ ga-asụkwa ngọngọ. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ala nke obi jupụtara ná nchekasị ndị yiri ogwu ma ọ bụ ọchịchọ akụ̀ na ụba n’ụzọ ịhụ ihe onwunwe n’anya, a ga-akpagbu ihe ọkụkụ Alaeze ahụ dị tịga tịga. N’ọnọdụ atọ ndị a a na-ahụkarị ná ndụ, ọ dịghị mkpụrụ Alaeze a ga-amịpụta.

9. N’ihi gịnị ka mkpụrụ ahụ a ghara n’ala dị mma ji nwee ike ịmịpụta mkpụrụ dị mma?

9 Otú ọ dị, gịnị banyere mkpụrụ Alaeze ahụ a ghara n’ala dị mma? Jisọs na-aza, sị: ‘Onye a ghakwara n’ala ahụ dị mma, mmadụ a bụ onye na-anụ okwu ahụ, wee ghọta ya; onye na-amị mkpụrụ n’ezie, mịpụta, otu [otu narị], ọzọ [iri isii], ọzọ [iri atọ].’ (Matiu 13:23) ‘N’ịghọta’ Alaeze ahụ, ha ga-amịpụta mkpụrụ dị mma dị ka ọnọdụ ha n’otu n’otu si dị.

Ibu Ọrụ na Nghọta Na-eso

10. (a) Olee otú Jisọs si gosi na ‘ịghọta’ Alaeze ahụ na-eweta ma ngọzi ma ibu ọrụ? (b) Ọrụ Jisọs nyere ịga mee ndị na-eso ụzọ ọ̀ bụ nanị ndị na-eso ụzọ narị afọ mbụ ka o metụtara?

10 Mgbe o nyesịrị ihe atụ isii ndị ọzọ iji kọwaa akụkụ dị iche iche nke Alaeze ahụ, Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ùnu aghọtawo ihe ndị a nile?’ Mgbe ha zara “Ee,” ọ sịrị: “N’ihi nke a odeakwụkwọ ọ bụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, o yiri mmadụ nke bụ nna nwe ụlọ, onye na-esi n’akụ̀ ya atụpụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.” Ozizi na ọzụzụ nile Jisọs nyere ga-ewuli ndị na-eso ụzọ ya ịghọ ndị Kraịst tozuru okè ndị pụrụ isite “n’akụ̀” ha wepụta ihe oriri ime mmụọ mara mma nke na-enweghị ọgwụgwụ. Akụkụ dị ukwuu na nke a metụtara Alaeze Chineke. Jisọs mere ka o doo anya na ‘ịghọta’ Alaeze ahụ ga-eweta ọ bụghị nanị ngọzi kamakwa ibu ọrụ. O nyere ha ọrụ, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu: ma lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.”—Matiu 13:51, 52; 28:19, 20.

11. Mgbe 1914 rutere, ihe omume ndị dị aṅaa metụtara Alaeze ahụ weere ọnọdụ?

11 Dị ka o kwere ná nkwa, Jisọs anọgidewo na-anọnyere ezi ndị na-eso ụzọ ya n’ime ọtụtụ narị afọ ndị gafeworonụ rute taa. N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, o jiriwo nke nta nke nta nye ha nghọta, ha azawokwa ya ajụjụ maka iji ìhè eziokwu na-amụba amụba eme ihe. (Luk 19:11-15, 26) Na 1914, ihe omume dị iche iche nke Alaeze ahụ malitere ịpụta ìhè ngwa ngwa nakwa n’ụzọ dị ịrịba ama. N’afọ ahụ, ọ bụghị nanị na ‘ọmụmụ’ nke Alaeze ahụ a nọworo na-atụ anya ya eri ogologo oge weere ọnọdụ, kamakwa “ọgwụgwụ oge a” malitere. (Mkpughe 11:15; 12:5, 10; Daniel 7:13, 14, 27) Ezi ndị Kraịst, n’ịghọta ihe ihe ndị na-emenụ pụtara, arụwo ọrụ nkwusa Alaeze na izi ihe kachasịnụ n’akụkọ ihe mere eme. Jisọs buru nke a n’amụma, na-asị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.

12. (a) Olee ihe siworo n’ịgba àmà sara mbara nke Alaeze ahụ n’oge a pụta? (b) N’ụwa a nke na-enwe obi abụọ, olee ihe ize ndụ dịịrị ndị Kraịst?

12 Ịgba àmà a sara mbara nke Alaeze ahụ eruwo n’ihe karịrị 230 ala. Ka ọ dị ugbu a, ihe karịrị nde ezi ndị na-eso ụzọ ise na-ekere òkè n’ọrụ a, a ka na-achịkọtakwa ndị ọzọ. Ma ọ bụrụ na anyị ejiri ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ tụnyere 5.6 ijeri mmadụ bi n’ụwa, o doro anya na dị ka ọ dị n’ụbọchị Jisọs, ihe ka nnọọ ukwuu n’ihe a kpọrọ mmadụ adịghị ‘aghọta’ Alaeze ahụ. Ọtụtụ, dị ka e buru n’amụma, na-akwa emo ma na-asị: “Olee ebe nkwa nke ọbịbịa Ya dị?” (2 Pita 3:3, 4) Ihe ize ndụ dịịrị anyị dị ka ndị Kraịst bụ na àgwà inwe afọ ojuju onwe onye, inwe obi abụọ, ịhụ ihe onwunwe n’anya ha pụrụ iji nwayọọ nwayọọ nwee mmetụta n’otú anyị si ele ihe ùgwù anyị dị iche iche nke Alaeze anya. N’ịbụ ndị ndị nke ụwa a gbara gburugburu, anyị pụrụ n’ụzọ dị mfe ịmalite ịnakwere ụfọdụ n’ime àgwà na omume ha. Lee ka o si dị mkpa na anyị ‘ghọtara’ Alaeze Chineke ma jigidesie ya ike!

Inyocha Onwe Anyị n’Ihe Banyere Alaeze Ahụ

13. N’ihe banyere ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ, olee otú anyị pụrụ isi nwalee ma anyị na-anọgide jiri nghọta ‘na-anụ’?

13 Jisọs kwuru banyere oge owuwe ihe ubi nke anyị na-ebi n’ime ya, sị: “Nwa nke mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi Ya, ha ga-achịkọpụta n’alaeze Ya ihe nile na-eme ka a maa n’ọnyà, na ndị na-eme ihe na-emebi iwu . . . Mgbe ahụ ka ndị ezi omume ga-enwupụ dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha. Onye nwere ntị, ya nụ.” (Matiu 13:41, 43) Ị̀ na-anọgide jiri nzaghachi nrubeisi ‘na-anụ’ iwu ahụ nke ikwusa Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ? Cheta, “onye a ghakwara n’ala ahụ dị mma” ‘nụrụ okwu ahụ, ghọtakwa ya’ wee mịa mkpụrụ dị mma.—Matiu 13:23.

14. Mgbe e nyere ntụziaka, olee otú anyị si egosi na anyị ‘na-aghọta’ ndụmọdụ ahụ e nyere?

14 Mgbe anyị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye ma na-eje nzukọ ndị Kraịst, anyị aghaghị ‘iwezụga obi anyị inwe nghọta.’ (Ilu 2:1-4) Mgbe e nyere ndụmọdụ banyere àgwà, ejiji, egwú, na ntụrụndụ, anyị aghaghị ikwe ka ọ bamie n’ime obi anyị ma kpalie anyị ime mgbanwe ọ bụla dị mkpa. Ya adịla mgbe ị ga-ewere ya dị ka ihe na-adịchaghị njọ, mee ngọpụ, ma ọ bụkwanụ n’aka nke ọzọ ghara ime ihe. Ọ bụrụ na Alaeze ahụ dị adị n’ezie ná ndụ anyị, anyị ga-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya nile ma jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaara ya ndị ọzọ. Jisọs sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m Nke bi n’eluigwe na-achọ.”—Matiu 7:21-23.

15. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ‘ibu ụzọ chọọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke’?

15 Omume ụmụ mmadụ bụ inwe nchegbu banyere ihe oriri, uwe, na ụlọ ndị a chọrọ, ma Jisọs sịrị: “Burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume [Chineke]; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:33, 34) N’isetịpụ ihe ndị ka mkpa, bute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ gị. Mee ka ndụ gị dị mfe, na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị mkpa. Ọ ga-abụ ihe nzuzu iji ihe omume na nchụso ndị na-adịghị mkpa mejupụta ndụ anyị, ikekwe na-ewere ya na ime nke a bụ ihe a pụrụ ịnabata, ebe ọ bụ na ihe ndị a adịchaghị njọ n’onwe ha. Ọ bụ ezie na nke ahụ pụrụ ịbụ eziokwu, gịnị ka inweta na iji ihe ndị dị otú ahụ na-adịghị mkpa eme ihe ga-eme n’ebe anyị idokwa oge maka ọmụmụ ihe onwe onye, ije nzukọ ndị Kraịst, na ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa dị? Jisọs sịrị na Alaeze ahụ yiri onye ahịa nke hụrụ “otu pearl dị oké ọnụ ahịa, o [wee] jee, ree ihe nile o nwere, ka ha hà, wee zụta ya.” (Matiu 13:45, 46) Nke a bụ mmetụta anyị kwesịrị inwe banyere Alaeze Chineke. Anyị kwesịrị iṅomi Pọl, ọ bụghị Dimas, bụ́ onye hapụrụ ozi ahụ “ebe ọ hụrụ oge dị ugbu a n’anya.”—2 Timoti 4:10, 18; Matiu 19:23, 24; Ndị Filipaị 3:7, 8, 13, 14; 1 Timoti 6:9, 10, 17-19.

“Ndị Ajọ Omume Agaghị Eketa Alaeze Chineke”

16. Olee otú ‘ịghọta’ Alaeze Chineke ga-esi nyere anyị aka izere àgwà na-ezighị ezi?

16 Mgbe ọgbakọ dị na Kọrint na-agbachi nkịtị n’omume rụrụ arụ, Pọl ji obi eziokwu kwuo, sị: “Ma ọ bụ ùnu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ bụrụ na anyị ‘aghọta’ Alaeze Chineke, anyị agaghị aghọ onwe anyị aghụghọ site n’ịdị na-eche na Jehova ga-agbachi nkịtị n’ụdị omume rụrụ arụ ụfọdụ ma ọ bụrụhaala na ọ na-ahụ ka anyị ji ọrụ n’aka n’ozi ndị Kraịst. E kwesịghị ọbụna ịkpọta adịghị ọcha aha n’etiti anyị. (Ndị Efesọs 5:3-5) Ị̀ na-achọpụta na ụfọdụ n’ime echiche ma ọ bụ omume rụrụ arụ nke ụwa a amalitewo igbebata n’ime ndụ gị? Wepụ ha ná ndụ gị ozugbo! Alaeze ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu ifunahụ mmadụ n’ihi ihe ndị dị otú ahụ.—Mak 9:47.

17. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ekele maka Alaeze Chineke ga-esi akwalite ịdị umeala n’obi ma wepụ ihe ndị na-akpata ịsụ ngọngọ?

17 Ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ, sị: “Ònyekwa dịkarịrị ukwuu n’alaeze eluigwe?” Jisọs zara ya site n’idebe otu nwatakịrị n’etiti ha na ikwu, sị: “N’ezie asị m unu, Ọ bụrụ na unu echigharịghị, bịa dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị. Ya mere, onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya dị ka nwatakịrị a, onye ahụ dịkarịrị ukwuu n’alaeze eluigwe.” (Matiu 18:1-6) Ndị dị mpako, ndị na-achọkarị ihe, ndị na-adịghị eche banyere ndị ọzọ, na ndị na-emebi iwu agaghị anọ n’Alaeze Chineke, ha agaghị abụkwa ndị Alaeze ahụ ga-achị. Ịhụnanya i nwere maka ụmụnna gị, ịdị umeala n’obi gị, egwu Chineke gị, ọ̀ na-akwali gị izere isite n’àgwà gị mee ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ? Ka ị̀ na-esi ọnwụ ‘n’ihe ndị ruuru’ gị n’agbanyeghị otú akparamàgwà na àgwà nke a pụrụ isi metụta ndị ọzọ?—Ndị Rom 14:13, 17.

18. Gịnị ga-abịara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi mgbe Alaeze Chineke mere ka e mee uche Ya ‘dị ka e si eme ya n’eluigwe, n’ụwa’?

18 Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, n’oge na-adịghị anya ga-aza n’ụzọ zuru ezu ekpere ahụ e ji ịnụ ọkụ obi na-ekpe: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” N’isi nso, Eze ahụ na-achị achị, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-abịa n’echiche nke ịnọdụ ala n’ocheeze ya maka ikpe ikpe, ikewa “atụrụ” pụọ “n’ụmụ ewu.” N’oge ahụ a kara aka, “Eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri Ya, Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.” Ụmụ ewu ga-apụ “baa [ná mbibi, NW] ebighị ebi: ma ndị ezi omume ga-aba ná ndụ ebighị ebi.” (Matiu 6:10; 25:31-34, 46) ‘Oké mkpagbu ahụ’ ga-ekpochapụ usoro ihe ochie a na ndị nile jụrụ ‘ịghọta’ Alaeze ahụ. Ma ọtụtụ nde ndị lanarịrị ‘oké mkpagbu’ ahụ na ọtụtụ ijeri ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-eketa ngọzi nile nke Alaeze ahụ n’enweghị ọgwụgwụ n’ime Paradaịs elu ala ahụ e weghachiri. (Mkpughe 7:14) Alaeze ahụ bụ ọchịchị ọhụrụ nke ụwa, na-achị site n’eluigwe. Ọ ga-emezu nzube Jehova maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ, iji doo aha ya kachasị nsọ nsọ. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe nketa ruru nnọọ eru ka a rụọrọ ya ọrụ, chụọrọ ya àjà, ma chere ya? Nke a bụ ihe ‘ịghọta’ Alaeze ahụ kwesịrị ịpụtara anyị!

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Gịnị bụ Alaeze Chineke?

◻ N’ihi gịnị ka ihe ka ukwuu n’ime ndị gere Jisọs ntị na-ejighị “ghọta” Alaeze ahụ?

◻ Olee otú ‘ịghọta’ Alaeze ahụ si eweta ma ngọzi ma ibu ọrụ?

◻ N’ihe banyere ime nkwusa, gịnị na-egosi ma ànyị ‘aghọtawo’ Alaeze ahụ?

◻ Olee otú anyị si egosi site n’akparamàgwà anyị na anyị ‘aghọtawo’ ndụmọdụ e nyere?

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ndị na-eso ụzọ Jisọs ‘ghọtara’ Alaeze ahụ ma mịa mkpụrụ dị mma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya