Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 1 p. 12-13
  • Eziokwu Banyere Alaeze Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Banyere Alaeze Chineke
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jizọs Kụziri Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Alaeze Chineke Na-achị
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 1 p. 12-13
Foto na-egosi otú ụwa dị ma ị nọrọ n’ọnwa na-ele ya, anwụ ana-achakwasị ya

Eziokwu Banyere Alaeze Chineke

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Gịnị bụ Alaeze Chineke? Olee ihe ọ ga-emere anyị? Olee ihe mere anyị ga-eji ekpe ekpere ka ọ bịa?

Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke.

Luk 1:31-33: “Ị ga-agụkwa ya Jizọs. Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kacha Elu. Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya bụ́ Devid. Ọ ga-achị ezinụlọ Jekọb ruo mgbe ebighị ebi, Alaeze ya agaghịkwa agwụ agwụ.”

Alaeze Chineke bụ isi ihe Jizọs kụziiri ndị mmadụ.

Matiu 9:35: “Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla.”

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị ha ga-eji ama na Alaeze ahụ eruwela nso.

Matiu 24:7: “N’ihi na mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha. A ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.”

Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwusa gbasara Alaeze Chineke n’ụwa niile ugbu a.

Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”

Ihe Ndị I Kwesịrị Ịma Gbasara Alaeze Chineke

Ebe Ọ Dị. Alaeze Chineke bụ ọchịchị Chineke guzobere n’eluigwe.—DANIEL 2:44; MATIU 4:17.

Ihe Ọ Ga-eme. Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, ebe ụmụ mmadụ niile ga-ebi n’udo ma dịrị n’otu. O nweghịkwa onye ga na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-anwụ anwụ.—ABỤ ỌMA 37:11, 29.

Ndị Ga-achị na Ya. Chineke họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ Eze Alaeze ahụ n’eluigwe. Ya na mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ e si n’ụwa zụta ga-eso achị.—LUK 1:30-33; 12:32; MKPUGHE 14:1, 3.

Ndị Ọ Ga-achị. Ndị Alaeze ahụ ga-achị ga-ebi n’ụwa. Ha ga-eji obi ha niile na-anọ n’okpuru Jizọs, na-erubekwa isi n’iwu na-achịkwa ndị nọ n’Alaeze ahụ.—MATIU 7:21.

Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Eze Kacha Mma Ga-achị Ụmụ Mmadụ

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na o ruru eru ịchị ụmụ mmadụ nakwa na ọ hụrụ ha n’anya, n’ihi na

  • O meteere ndị ogbenye ebere.—LUK 14:13, 14.

  • Ọ kpọrọ mmegbu asị. —MATIU 21:12, 13.

  • O mere ka ihe ndị dị ka oké ifufe na oké osimiri daa jụụ.—MAK 4:39.

  • O nyere ọtụtụ puku mmadụ nri.—MATIU 14:19-21.

  • O nweere ndị na-arịa ọrịa ọmịiko, gwọọkwa ha niile.—MATIU 8:16.

  • Ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ.—JỌN 11:43, 44.

Otú Alaeze Chineke Ga-esi Abara Gị Uru Ugbu A

I nwere ike ịna-enwekwu obi ụtọ ugbu a ma i soro ná ndị Alaeze Chineke ga-achị. Dị ka ihe atụ, ndị Alaeze ahụ ga-achị

  • ‘Na-agba mbọ ka ha na mmadụ niile na-adị n’udo.’—NDỊ HIBRU 12:14.

  • Na-enwe udo, ezinụlọ ha na-adịkwa n’otu, n’ihi na ndị di na nwunye na-ahụ ibe ha n’anya ma na-asọpụrụ ibe ha.—NDỊ EFESỌS 5:22, 23, 33.

  • Na-enwe obi ụtọ ma jiri ndụ ha na-eme ihe bara uru n’ihi na ha “na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya.”—LUK 11:28.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya