Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 1 p. 14-15
  • Eziokwu Banyere Ọdịnihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Banyere Ọdịnihu
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EZIGBO ỌCHỊCHỊ
  • EZIGBO AHỤ́ IKE
  • UDO ZURU ỤWA ỌNỤ
  • NAANỊ NDỊ EZI OMUME GA-EBIZI N’ỤWA
  • ỤWA NIILE GA-ABỤ PARADAỊS
  • Olileanya
    Teta!—2018
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Nkwere Chineke Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị Na-eru Ọgwụgwụ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Alaeze Chineke Karịrị Ọchịchị Ndị Ọzọ n’Ụzọ Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 1 p. 14-15
Ebe ndị mmadụ nọ na Paradaịs

Eziokwu Banyere Ọdịnihu

Ì chetụla echiche otú ọdịnihu ga-adị? Baịbụl gwara anyị ihe ndị dị mkpa ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ihe ndị ahụ ga-emetụtakwa mmadụ niile bi n’ụwa.

Jizọs kwuru otú anyị ga-esi ‘ama na Alaeze Chineke dị nso.’ (Luk 21:31) Ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru anyị ga-eji amata ya bụ agha, oké ala ọma jijiji, ụkọ nri nakwa ọrịa na-efe efe. Anyị na-ahụ ka ihe ndị a niile na-eme taa.—Luk 21:10-17.

Baịbụl kwukwara na otu n’ime ihe ndị a ga-eji amata “oge ikpeazụ” nke ọchịchị ụmụ mmadụ bụ na ndị mmadụ ga na-akpa àgwà ọjọọ. I nwere ike ịgụ banyere ya na 2 Timoti 3:1-5. Mgbe ị na-ahụ ka ndị mmadụ na-akpa àgwà ndị ahụ, o doro anya na ị ga-ekweta na amụma a Baịbụl buru na-emezu n’oge a.

Gịnị ka mmezu amụma a na-egosi? Ọ na-egosi na oge Alaeze Chineke ga-eji eme ka ihe dịrị ndị mmadụ mma n’ụwa adịla nso. (Luk 21:36) Na Baịbụl, Chineke kwuru ihe ọma ọ ga-eme n’ụwa nakwa ihe ọ ga-emere ndị ga-ebi na ya. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

EZIGBO ỌCHỊCHỊ

“E nyere [Jizọs] ọchịchị, mee ka a na-akwanyere ya ùgwù, nyekwa ya alaeze, ka ndị dị iche iche, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị akwụsị akwụsị. A gaghịkwa ebibi alaeze ya ebibi.”—DANIEL 7:14.

Ihe ọ pụtara: Ị ga-enwe obi ụtọ mgbe ọchịchị kacha mma ga-achịwa ụwa niile. Ọ bụ Chineke hiwere ọchịchị a, ma mee Ọkpara ya Eze ya.

EZIGBO AHỤ́ IKE

Ebe nwatakịrị nwaanyị hapụrụ ígwè ndi ngwọrọ ya gawazie ije

“O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: ’Ahụ́ adịghị m.’”—AỊZAYA 33:24.

Ihe ọ pụtara: Ị gaghị arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ. Ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

UDO ZURU ỤWA ỌNỤ

Ebe a kụjisiri égbè

“Ọ na-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.”—ABỤ ỌMA 46:9.

Ihe ọ pụtara: Agha na ahụhụ niile ọ na-akpata agaghịzi adị.

NAANỊ NDỊ EZI OMUME GA-EBIZI N’ỤWA

“Ndị ajọ omume agaghịzi anọ . . . Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa.”—ABỤ ỌMA 37:10, 11.

Ihe ọ pụtara: A gaghịzi enwe ndị ọjọọ n’ụwa. Ọ bụ naanị ndị chọrọ irubere Chineke isi ga-ebi na ya.

ỤWA NIILE GA-ABỤ PARADAỊS

“Ha ga-arụ ụlọ, birikwa na ha. Ha ga-akọ ubi vaịn, rie ihe si na ya.” —AỊZAYA 65:21, 22.

Ihe ọ pụtara: Ụwa niile ga-ama mma. Chineke ga-aza ekpere anyị bụ́ ka uche ya mee “n’ụwa.”—Matiu 6:10.

Ebe ndị mmadụ nọ na Paradaịs
    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya