Uru Ịmata Eziokwu Ga-abara Gị
Chineke, bụ́ onye na-anaghị agha ụgha na-ekwe nkwa inye gị “ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
OLEE IHE I KWESỊRỊ IME IJI NWETA YA?
Na-erubere Chineke isi.—Diuterọnọmi 30:19, 20.
Na-eme ihe ị mụtara n’Okwu Chineke kwa ụbọchị.—Jems 1:25.
Eziokwu Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-amụta na Baịbụl na-abara ha uru. Obi ga-atọkwa ha ụtọ ịkụziri gị ihe ndị ahụ ha na-amụta.
Ị chọọ ịmụtakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl na-akụzi, gụọ akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa n’Ịntanet, na www.jw.org/ig.