Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 5/15 p. 3-7
  • Amagedọn—Òle Mgbe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Amagedọn—Òle Mgbe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Amagedọn?
  • Olee Ndị Ga-ekere Òkè na Ya?
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Lụọ Ya?
  • N’òle Ebe Ka Ọ Ga-ewere Ọnọdụ?
  • Olee Mgbe Amagedọn Ga-ewere Ọnọdụ?
  • Ihe Amagedọn Ga-arụzu
  • Gịnị Bụ Agha Amagedọn?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Amagedọn—Oge Mgbanwe nke Ga-eweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Amagedọn Ọ̀ Ga-amalite n’Izrel?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Amagedọn Bụ Ihe Ọma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 5/15 p. 3-7

Amagedọn—Òle Mgbe?

“ANYỊ guzo n’Amagedọn, anyị na-ebukwara Onyenwe anyị agha.” Site n’okwu ndị a, onye bụbu onyeisi ala nke mba U.S. bụ́ Theodore Roosevelt ji okwu ahụ bụ “Amagedọn” mee ihe n’ihe banyere ibu agha ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ya onwe ya tinyere aka na ya. Ya mere, ànyị ga-ele anya Amagedọn n’ọgbọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

N’afọ ole na ole gara aga, magazin a na-ebi na Canada bụ Business Life bu otu isiokwu bụ “Amagedọn nke Ọnọdụ Akụ na Ụba.” Otu isiokwu nta jụrụ, sị: “Mba Ndị Na-emepeghị Emepe akwụlighị ụgwọ ha ji ọ̀ pụrụ ịkwali ndakpọ nke ọnọdụ akụ na ụba anyị?” Ma, ànyị kwesịrị inwe echiche nke bụ na Amagedọn bụ ọdachi nke ihe banyere ego?

Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ Newsweek si kọọ, mmebi ụwa ghọrọ isiokwu e ji ekwu okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ịrụ ụka nke onyeisi ala na 1984. Na mgbe ahụ, “a jụrụ” onyeisi ala U.S. bụ́ Ronald Reagan n’oge ahụ “ma ò kwenyere na ụwa na-eche ‘Amagedọn nke agha nuklia’ ihu. Reagan kwenyere na a na-enwe ‘nkwurịta okwu nke ọkà ihe ọmụma’ banyere ndabakọ nke ihe ndị na-eme mgbe ahụ na ihe àmà ndị dị na Bible, ndị na-egosipụta mgbe ikpeazụ, ma onyeisi ala ahụ nọgidere na-ekwu na ọ dịghị mgbe ya kwuru na ‘anyị ga-eme atụmatụ ga-ekwenyekọ n’Amagedọn.’” Ma, nnyocha anyị na-enyocha ihe Amagedọn pụtara ò kwesịrị ịdabere n’ihe omume nke agha nke na-eyi egwu ọdachi nke agha nuklia?

Ọtụtụ ndị okpukpe na-ekwu na Amagedọn bụ agha. Ma ná mmalite nke narị afọ nke iri na itoolu, onyeọkà mmụta Bible bụ́ Adam Clarke dere, sị: “Lee nnọọ ka nchepụta nile nke ụmụ mmadụ n’okwu a si bụrụ ihe na-atọ ọchị! N’ime iri afọ abụọ gara aga a lụwo agha nke a n’ebe dị iche iche, dị ka ndị ọhụ ụzọ ndị ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha kpuru ìsì na ndị mere onwe ha ndị amụma si kọọ! N’otu mgbe ọ bụ Austerlitz, n’oge ọzọ ọ bụ Moscow, n’oge ọzọ Leipsic, na ugbu a Waterloo! Otú a ka ha nọgideworo na-aga n’ihu, otú a ka ha ga-anọgidekwa na-aga n’ihu, na-akpata mgbagwoju anya na-abụkwa ndị nọ ná mgbagwoju anya.”

N’ụzọ doro anya, ime nnyocha maka ihe Amagedọn pụtara na-akpali ajụjụ ụfọdụ ndị dị mkpa. Gịnị ka Amagedọn bụ? Ọ bụrụ na ọ bụ agha, olee ndị ga-ekere òkè na ya? N’ihi gịnị ka a ga-eji lụọ ya? Olee ebe ọ ga-ewere ọnọdụ? Olee mgbe Amagedọn ga-ewere ọnọdụ?

Gịnị Bụ Amagedọn?

Okwu ahụ bụ “Amagedọn” bụ nke e nwetara site n’okwu dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe, bụ́ nke e ji okwu ihe atụ wee mara. N’ebe ahụ onyeozi bụ Jọn dere, sị: “M wee hụ ndị mmụọ atọ na-adịghị ọcha, dị ka awọ, ka ha na-esi n’ọnụ dragọn ahụ, sikwa n’ọnụ anụ ọhịa ahụ, sikwa n’ọnụ onye amụma ụgha ahụ, pụta: n’ihi na ha bụ ndị mmụọ nke ndị mmụọ ọjọọ, na-eme ihe ịrịba ama dị iche iche; ndị na-apụkwuru ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, ime ka ha zukọọ ibu agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, onye pụrụ ime ihe nile. . . . Ha wee mee ka ha zukọọ n’ebe ahụ a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha-Magedọn.”—Mkpughe 16:13-16.

Amagedọn, ma ọ bụ Ha-Magedọn, bụ okwu Grik a sụgharịrị dị ka e si akpọ ya nke ya na okwu Hibru bụ Har Meghid-dohn’ bụ otu ihe, nke pụtara “Oké Ugwu nke Megido,” ma ọ bụ “Oké Ugwu nke Mgbakọba ndị Agha.” E jikọtara ya na “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.” Ya mere Amagedọn abụghị nsọrịta mpì nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọdachị nke ọnọdụ akụ na ụba, agha nuklia, ma ọ bụ ibu agha nke ụmụ mmadụ. Kama nke ahụ, Amagedọn bụ agha nke Chineke.

Olee Ndị Ga-ekere Òkè na Ya?

Okwu atọ ahụ na-adịghị ọcha ndị yiri awọ, nke ndị mmụọ kpaliri, na-esi n’ọnụ dragọn ahụ (Setan bụ́ Ekwensu), anụ ọhịa ahụ (njikọ ọchịchị ya o guzobere n’elu ala), na onye amụma ụgha ahụ bụ njikọ Britain na America apụta. Okwu ndị a nke ndị mmụọ ọjọọ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ọjọọ kpaliri, na-achịkọta ndị eze, ma ọ bụ ndị ọchịchị ụwa, bịa na Ha-Magedọn.— Lee isi 32 nke akwụkwọ bụ Revelation—Its Grand Climax At Hand! nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc, bipụtara.

N’akụkụ nke Jehova n’agha Amagedọn ahụ ka e nwere oké ìgwè ndị mmụọ a na-adịghị ahụ anya nke onyeisi ha bụ Eze ahụ bụ́ Jisọs Kraịst. Jọn onyeozi na-akọ, sị: “M wee hụ eluigwe ka o gheworo oghe; ma lee, ịnyịnya ọcha dị, na onye na-anọkwasị ya, bụ́ onye a na-akpọ Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu; ọ bụkwa n’ezi omume ka ọ na-ekpe ikpe, na-ebukwa agha. . . . Usuu nile nke ndị agha ndị dị n’eluigwe wee soo ya. . . . Mma agha dị nkọ na-esikwa n’ọnụ ya pụta, ka o wee were ya tigbuo mba nile: Ya onwe ya ga-ewerekwa mkpanaka nke ígwè zụọ ha dị ka atụrụ: Ya onwe ya na-azọkwa ebe nzọcha mkpụrụ vine nke mmanya nke ọnụma nke iwe Chineke Onye pụrụ ime ihe nile. O nwekwara aha e dekwasịworo n’elu uwe ya na n’elu apata ụkwụ ya, Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile.” (Mkpughe 19:11-16) Mma agha ahụ dị nkọ nọchiri anya ikike Kraịst inye iwu ka e gbusịsịa ndị nile jụrụ ịkwado Alaeze Chineke. (Mkpughe 1:16; 2:16) E nwere usuu ndị agha a na-adịghị ahụ ahụ anya maka agha nke Amagedọn.

Ndị na-emegide emegide bụ Setan, ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya, na ndị eze nile nke ụwa. Ma anyị ekwesịghị iche na ọ bụ nanị ndị ọchịchị ụwa ndị nọ n’akụkụ nke a na-ahụ anya, n’ihi na ndị ha na-achị achị sokwa na ya. E buwo ya n’amụma, sị: “Iwe ka Jehova na-ewesa mba nile, ọ na-ejidekwa ọnụma n’ahụ usuu nile nke ndị agha ha.”—Aịsaia 34:2.

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Lụọ Ya?

A ga-alụ agha Amagedọn n’ihi na Chineke bụ onye ezi omume, ọ gaghịkwa anọgide gbachi nkịtị ka ihe ọjọọ dịgide. (Abụ Ọma 11:7) N’ihi nke a, a ghaghị ibibi nzukọ Setan bụ́ Ekwensu, nke ndị mmụọ ọjọọ na ụmụ mmadụ na-enupụ isi mejupụtara, bụ́ ndị kpatara ajọ omume na ahụhụ dịworo ọtụtụ puku afọ. (Tụlee Jenesis 3:15.) A ga-ebuli ịchịisi eluigwe na ala nke Jehova elu n’Amagedọn, agha ahụ ga-ewepụkwa aha ya n’ịta ụta nke e bokwasịworo ya ruo ọtụtụ narị afọ. Dị ka Chineke kwupụtara site n’ọnụ onye amụma ya bụ Ezikiel, sị: “M gaghị ekwekwa ọzọ ka e mee ka aha nsọ m ghara ịdị nsọ: mba nile ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova.”—Ezikiel 39:7.

N’ezie agha Chineke nke Amagedọn ga-egbochi mbibi nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. Jehova kere elu ala ka e biri n’ime ya, ọ bụghị ka e jiri ọkụ agha nuklia ma ọ bụ ụdị agha ọzọ n’etiti ụmụ mmadụ mee ya ka ọ ghara ikwesị ekwesị ịdị ndụ na ya. (Aịsaịa 45:18) Ọ gaje “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” (Mkpughe 11:18) Ma onye ọbụ abụ kwupụtara, sị: “Jehova bụ eze: ọzọ, elu ụwa dum mmadụ bi [Hibru, te-vel’; elu ala, dị ka nke na-emepụta nri na nke mmadụ bi na ya, ụwa dum a pụrụ ibi n’ime ya] na-eguzosi ike, a dịghị ewezuga ya n’ọnọdụ ya.”—Abụ Ọma 96:10.

Ihe Chineke ga-eme n’Amagedọn ga-ekwekọ kpam kpam n’àgwà ya ndị bụ isi nke bụ ikpe ziri ezi, amamihe, ike, na ịhụnanya. (Deuterọnọmi 32:4; Job 12:13; Aịsaịa 40:26; 1 Jọn 4:8) Ọ ga-eme ihe megide “ndị mmehie ndị na-asọpụrụghị Chineke,” ọ bụghị megide ndị omume ha ziri ezi. (Jud 14, 15) Nanị ‘ndị na-emebi iwu ka a ga-enye ná mma agha.’ (Jeremaịa 25:31) Nke a ga-enye ohere maka mweghachi nke Paradaịs, iji mezuo nzube nke Chineke maka elu ala na ihe a kpọrọ mmadụ.—Luk 23:43.

N’òle Ebe Ka Ọ Ga-ewere Ọnọdụ?

Ebe ọ bụ na okwu ahụ bụ “Amagedọn” sitere n’okwu Hibru pụtara “Oké Ugwu nke Megido,” ụfọdụ mmadụ pụrụ ikwubi na a ga-alụ agha nke a n’ebe dị oké elu a na-akpọ aha ahụ. Otú ọ dị, ọ dịbeghị oké ugwu aha ya bụ Megido. N’ihe dị ka 60 maịlụ [100 kilomita] n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Jerusalem e nwere otu obodo nta, ma ọ bụ obodo ukwu dị n’elu ugwu nta nke a kpọrọ Megido, ma ọ bụ nanị mkpụtamkpụ ala elu ya dị ihe dị ka 70 amaụkwụ ka e ji amata ebe ahụ ugbu a.—Joshua 17:11.

A na-esi n’elu obodo ukwu mgbe ochie ahụ na-eleda anya na “ndagwurugwu Megido.” (2 Ihe Emere 35:22) Ijikọ Amagedọn (ma ọ bụ Ha-Magedọn) na gburugburu ebe ahụ bụ ihe kwesịrị ekwesị n’ihi na ọ bụ ebe a nọrọ lụọ agha ndị e ji kpebie ndị ka ibe ha. Dị ka ihe atụ, n’ebe ahụ ka Chineke nyeere Onyeikpe bụ Berak aka iwere oké ihe otiti tigbuo eze Kenean bụ Jebin na ndị agha ya nọ n’okpuru nduzi nke Sisera. (Ndị Ikpe 4:12-24; 5:19, 20) N’ebe ahụ ka Gideon na ìgwè ndị agha ya dị nta meriri ndị Midian. (Ndị Ikpe 7:1-8:35) N’ebe ahụkwa ka e gburu ndị eze abụọ bụ Ahazaịa na Josaịa.—2 Ndị Eze 9:27; 23: 29, 30.

Otú ọ dị, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama, na ndagwurugwu nke a, nke a na-akpọkwa Ndagwurugwu nke Esdraelon, dị nanị 20 maịlụ [32 kilomita] n’ogologo, dịkwa 18 maịlụ [29 kilomita] n’ùhie n’akụkụ ọwụwa anyanwụ. Ọ dịghị mgbe ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi na ndị agha ha ga-abatali n’ebe dị nta otú a. E wezuga nke ahụ, ọbụna ugwu nta (ugwu nta nke Megido) ma ọ bụ mkpụtamkpụ ala adịghị nke bụ oké ugwu. Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, Amagedọn abụghị ihe ga-ewere ọnọdụ n’ebe bụ ugwu n’Etiti Ebe ọwụwa Anyanwụ nke ụwa. Kama nke ahụ, Amagedọn (ma ọ bụ Ha-Magedọn) bụ ihe atụ nke ọnọdụ ga-ezu ụwa nile, ọ bụ ezie na ụfọdụ ihe ndị mere o ji na-aza aha ahụ sitere na Megido na ihe mere n’ebe ahụ.

Olee Mgbe Amagedọn Ga-ewere Ọnọdụ?

Ebe ọ bụ na Megido dị n’ala nke ndị bụ ndị Chineke n’oge ochie, ihe ga-eme n’Amagedọn metụtara Ndịàmà Jehova n’ime “mgbe ọgwụgwụ” nke oge a. (Daniel 12:4) Amagedọn metụtara “ebe ahụ” nke ndị ọchịchị ụwa zukọrọ n’imegide Jehova na Alaeze ya nke dị n’aka Jisọs Kraịst. (Mkpughe 16:14, 16) Ma “ebe” ahụ (Grik, to’pos) na-apụta ọnọdụ ụwa. Amagedọn ga-ewere ọnọdụ mgbe otu ọnọdụ bilitere nke metụtara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile.

Inwe ọganihu ime mmụọ nke Ndịàmà Jehova na-ewe Setan bụ́ Ekwensu oké iwe, bụ́ onye ga-ebu oké agha megide ndị Kraịst ndị a yiri ka ha enweghị nchebe. Mbuso agha zuru ụwa nile nke a site n’aka Setan, ma ọ bụ Gọg, ka a kọwara n’Ezikiel isi 38 na 39. Ná mkpali nke Ekwensu, mba nile ga-alụso ndị Jehova ahụ hụrụ udo n’anya a chịkọpụtara site n’etiti mba nile, ọgụ. Ee, a ga-egosipụta mmegide nke Ekwensu site n’ime ihe n’ụwa nile megide ndị ohu Jehova nke elu ala, bụ́ ndị nnọchianya ya a na-ahụ anya na ndị na-ekwusa Alaeze Chineke.

A na-amatakarị agha site n’ebe a lụrụ ya. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ ịkpọ oké nchebe nke Jehova ga-echebe ndị ya ọgụ, ma ọ bụ agha, nke Amagedọn. Mgbe Jehova ga-ebilite ichebe ndị ohu ya megide mbuso agha nke Gọg, Amagedọn ga-amalite! Ọchịchị ụmụ mmadụ ga-adakpọsị. Oké mmiri ozuzo, akụ mmiri igwe na-ebibi ihe, ọkụ na brimstone na-enwu ka àmụ̀mà, oké ọrịa ndị na-efe efe—n’ezie ọrụ aka nke Chineke—ga-akpata obi ịlọ mmiri nke ụwa ndị na-esoghị ná Ndịàmà Jehova. Ụmụ mmadụ bụ́ ndị iro ga-achịrị ngwá agha ha imegiderịta ibe ha. Ndị agha mgburịta onwe onye nke a na-egbughị, ka Jehova ga-ekpochapụ.—Ezikiel 38:18-23; Daniel 2:44.

N’oké egwu, aka mmadụ ọ bụla ga-ebili imegide onye agbata obi ya ná mgbalị oké ọgba aghara na-enweghị isi maka nlanarị. (Zekaraịa 14:12, 13) “Ndị Jehova gburu ga-adizukwa n’ụbọchị ahụ site n’otu nsọtụ ụwa wee ruo nsọtụ ọzọ nke ụwa: a gaghị etiri ha aka n’obi, a gaghị achịkọtakwa ha, a gaghị elikwa ha; nsị anụ n’elu ala ka ha ga-aghọ.” (Jeremaịa 25:33) Mgbalị ọ bụla ị na-eme ịnọpụ iche n’agha Chineke ga-anapụ gị ndụ gị n’Amagedọn! Dịkwa ka a na-egosipụta ya ọtụtụ mgbe site n’Akwụkwọ nsọ n’ime magazin nke a, ọgbọ nke dị ugbu a agaghị agafe tupu Amagedọn abịa!—Matiu 24:21, 34.

Ihe Amagedọn Ga-arụzu

Amagedọn ga-ewepụ akụkụ ikpeazụ nke ihe fọdụrụ ná nzukọ Setan nke elu ala. Ọzọ, a ga-atụba Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ime abyss. (Mkpughe 20:1-3) Lee nnọọ aha ngọzi ndị ga-adịrị ndị Jehova, bụ́ ndị ga-alanarị oké agha nke Amagedọn, na-enwe ọṅụ! Ha ga-eji obi ụtọ malite ọrụ mwuzigharị ihe nke ga-eme ka elu ụwa nile ghọọ paradaịs, ebe mmetọ, ihe mgbu, iru újú, anya mmiri ákwá, na ọnwụ na-agaghị adị. (Mkpughe 21: 3, 4) Ị pụkwara ịnọ n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na i jiri obi gị nakwere okwu nke onye ọbụ abụ bụ́: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị inweta ala: mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ [ya].” (Abụ Ọma 37:34) N’ezie, ị pụrụ ịdị ndụ hụ agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile, ghọọkwa onye lanarịrị n’obi ụtọ mgbe Amagedọn ga-alụ!

“Ebe a na-eme ka ihe ndị a nile laa n’iyi otú a, ọ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke [Jehova, NW].” —2 Pita 3:11, 12

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

Amagedọn abụghị nsọrịta mpì nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọdachị nke ọnọdụ akụ na ụba, agha nuklia, ma ọ bụ ibu agha nke ụmụ mmadụ. Amagedọn bụ agha nke Chineke

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Agha Chineke nke Amagedọn ga-egbochi mbibi nke ihe nile a kpọrọ mmadụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Mgbalị ọ bụla ị na-eme ịnọpụ iche n’agha Chineke ga-anapụ gị ndụ gị n’Amagedọn!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya