Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 85
  • Gịnị Bụ Agha Amagedọn?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Agha Amagedọn?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl Kwuru
  • Amagedọn—Òle Mgbe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Amagedọn—Oge Mgbanwe nke Ga-eweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Amagedọn Ọ̀ Ga-amalite n’Izrel?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Amagedọn Bụ Ihe Ọma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 85
Ebe ọkụ na sọlfọ si n’elu na-ada

Gịnị Bụ Agha Amagedọn?

Ihe Baịbụl Kwuru

Agha Amagedọn bụ agha ikpeazụ a ga-alụ n’ụwa a. Ọ bụ Chineke na ndị ọchịchị ga-alụ ya. Ndị ọchịchị a na ndị na-akwado ha ebidolarị imegide Chineke ugbu a ebe ọ bụ na ha ekweghị anabata ọchịchị ya. (Abụ Ọma 2:2) Ọ bụ agha Amagedọn ka Chineke ga-eji bibie ọchịchị ụmụ mmadụ.​—Daniel 2:​44.

Ọ bụ naanị otu ugbo ka “Amagedọn” gbara na Baịbụl. Ọ gbara ná Mkpughe 16:16. N’akwụkwọ Mkpughe, e buru amụma na a ga-akpọkọta “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” “n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru” “maka ibu agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”​—Mkpughe 16:14.

Ole ndị ga-alụ agha Amagedọn? Jizọs Kraịst ga-edu ndị agha nọ n’eluigwe bịa bibie ndị iro Chineke. (Mkpughe 19:11-​16, 19-​21) Ndị na-emegide ọchịchị Chineke na ndị kpọrọ Chineke asị so ná ndị a a ga-ebibi.​—Ezikiel 39:7.

À ga-alụ agha Amagedọn naanị ná mba Izrel ma ọ bụ n’ebe dị ya nso? Mba. Ọ bụghị naanị n’otu ebe ka a ga-alụ agha Amagedọn. Ọ bụ agha ga-ezu ụwa niile ọnụ.​—Jeremaya 25:32-​34; Ezikiel 39:17-​20.

Okwu ahụ bụ́ Amagedọn pụtara “Ugwu Megido.” Otú ọzọ e sikwa ede ya bụ “Ha-Magedọn” (otú e si ede ya n’asụsụ Hibru bụ Har Meghiddohnʹ). Megido bụ obodo dịbu n’ala Izrel. A nọkwa n’ebe ndị dị nso na Megido lụọ ọtụtụ agha ndị e ji mara ndị bụ́ ọkaibe. E dere banyere ụfọdụ agha ndị ahụ na Baịbụl. (Ndị Ikpe 5:​19, 20; 2 Ndị Eze 9:​27; 23:29) Ma, Amagedọn abụghị ugwu nkịtị dị́ nso na Megido oge ochie. O nweghị nnukwu ugwu dị na Megido, Ndagwurugwu Jezril dị́ nso ebe ahụ agaghịkwa aba ndị niile ga-alụso Chineke agha. N’Amagedọn, mba dị iche iche ga-ezukọta nke ikpeazụ ya imegide ọchịchị Chineke.

Gịnị ka Chineke ga-eji alụ agha Amagedọn? Anyị amachaghị ihe Chineke ga-eji alụ ya. Ma, anyị ma na o nwere ọtụtụ ihe o ji lụọ agha n’oge ochie o nwekwara ike iji lụọ agha a, dị ka, akụ́ mmiri igwe, ala ọma jijiji, oké mmiri ozuzo, ọkụ na sọlfọ, àmụ̀mà, na ọrịa na-efe efe. (Job 38:22, 23; Ezikiel 38:19, 22; Habakọk 3:​10, 11; Zekaraya 14:12) Jehova nwekwara ike itinye ụfọdụ ndị iro ya n’ọgba aghara, ha egburịtawa ibe ha. Ma, ha ga-emecha mata na ọ bụ Chineke na-ebuso ha agha.​—Ezikiel 38:21, 23; Zekaraya 14:13.

Agha Amagedọn ọ̀ ga-eweta ọgwụgwụ ụwa? Ọ gaghị eme ka ụwa anyị a gharazie ịdị n’ihi na Chineke kere ụwa a ka ụmụ mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29; 96:10; Ekliziastis 1:4) A gaghịkwa ebibi mmadụ niile n’agha Amagedọn. Kama, a ga-eji ya zọpụta ụmụ mmadụ n’ihi na Baịbụl kwuru na a ga-azọpụta “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ndị ohu Chineke.​—Mkpughe 7:​9, 14; Abụ Ọma 37:34.

N’ebe ụfọdụ e kwuru gbasara “ụwa” na Baịbụl, ihe a na-ekwu bụ ụwa nkịtị. Ma, e nwere ebe ụfọdụ “ụwa” a na-ekwu okwu ya bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. (1 Jọn 2:​15-​17) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na “ụwa” a na-ekwu okwu ya bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ọ dabara adaba ikwu na Amagedọn ga-eweta “ọgwụgwụ ụwa.”​—Matiu 24:3, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Olee mgbe a ga-alụ agha Amagedọn? Mgbe Jizọs na-ekwu banyere “oké mkpagbu” nke ga-ebi n’agha Amagedọn, o kwuru, sị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” (Matiu 24:21, 36) Ma, Baịbụl kwuru ihe gosiri na a ga-alụ agha Amagedọn n’oge ọnụnọ Jizọs. Ọnụnọ Jizọs ebidola kemgbe afọ 1914.​—Matiu 24:37-​39.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya