Ndụ na Ije Ozi Jisos
Mgbe Kraịst Bịara n’lke Alaeze
JlSỌS na ndị na-eso ụzọ ya ka nọ n’elu Ugwu Olive. N’inye ha azịza n’arịrịọ ha rịọrọ ya maka ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya nakwa nke ọgwụgwụ usoro ihe ndị a, o nyere ha ihe atụ nke ikpeazụ dị n’usoro ihe atụ atọ ndị ahụ. Jisọs malitere ikwu, sị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya.”
Ndị mmadụ apụghị ịhụ ndị mmụọ ozi nọ n’ebube ha nke eluigwe. Ya mere ọbịbịa nke Nwa nke mmadụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ya na ndị mmụọ ozi aghaghị ịbụ nke ụmụ mmadụ na-agaghị eji anya ha hụ. Ọbịbịa ahụ mere n’afọ 1914. Ma ọ̀ bụ n’ihi nzube dị aṅaa? Jisọs na-akọwa, sị: “Ma n’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe.”
N’ịkọwa ihe ga-eme ndị ahụ e kewapụrụ gaa n’akụkụ nke inweta ihu ọma, Jisọs kwuru, sị: “Mgbe ahụ eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya, Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site ná ntọala nke ụwa.” Atụrụ ndị ahụ agaghị eso Kraịst chịa achị n’eluigwe kama ha ga-eketa Alaeze ahụ n’echiche nke ịbụ ndị ọ ga-achị n’elu ala. “Ntọala nke ụwa” weere ọnọdụ mgbe Adam na Iv mụtara ụmụ mbụ ndị ga-erite uru site na ndokwa Chineke ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ.
Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka e ji kewapụta atụrụ ndị ahụ gaa n’aka nri nke inweta ihu ọma nke Eze ahụ? Eze ahụ zaghachiri, sị: “N’ihi na agụụ gụrụ m, unu wee nye m ihe m ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ, unu wee kụrụ mmiri nye m: abụ m ọbịa, unu kpọbata m; agbara m ọtọ, unu wee gbokwasị m ákwà: ahụ adịghị m ike, unu wee leta m: anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu wee bịakwute m.”
Ebe ọ bụ na atụrụ ndị ahụ nọ n’elu ala, ha chọrọ ịma otú ọ pụrụ isiworị bụrụ na ha meere Eze eluigwe ha ihe ọma ndị dị otú ahụ. Ha jụrụ, sị: “Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, anyị wee zụọ gị? Ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị wee kụrụ mmiri nye gị? Olee mgbe anyị hụkwara gị ka ị bụ ọbịa, anyị wee kpọbata gị? Ma ọ bụ ka ị na-agba ọtọ, anyị wee gbokwasị gị ákwà? Olee mgbe anyị hụkwara gị ka ahụ na-adịghị gị ike, ma ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ, anyị wee bịakwute gị?”
Eze ahụ zaghachiri, sị: “N’ezie asị m unu, ka ọ hà, bụ́ otú unu si mee ya nye otu onye n’ime ụmụnna m ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, mụ ka unu mere ya nye.” Ụmụnna Kraịst bụ ihe fọdụrụ na 144,000 ndị ahụ nọ n’elu ala bụ́ ndị ga-eso ya chịa achị n’eluigwe. Jisọs kwukwara na imere ha ihe ọma bụ otu ihe ahụ dị ka imere ya ihe ọma.
Ọzọ, Eze ahụ gwara ewu ndị ahụ okwu. “Pụọnụ n’ihu m, ndị a na-abụ ọnụ, gaa n’ọkụ ebighị ebi ahụ nke e doziworo nye Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya: n’ihi na agụụ gụrụ m, ma unu enyeghị m ihe m ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ ma unu ekughị mmiri nye m: abụ m ọbịa, ma unu akpọbataghị m; agbara m ọtọ, ma unu egbokwasighị m ákwà; ahụ adịghị m ike, anọkwa m n’ụlọ mkpọrọ, ma unu eletaghị m.”
Otú ọ dị, ewu ndị ahụ mere mkpesa, sị: “Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, ma ọ bụ ka ị bụ ọbịa, ma ọ bụ ka ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ ka ahụ na-adịghị gị ike, ma ọ bụ ka ị nọ n’ụlọ mkpọrọ, ma anyị ejeghịrị gị ozi?” E kpere ewu ndị ahụ ikpe nke anataghị ihu ọma n’ihi otu ihe ahụ mere e ji kpe atụrụ ndị ahụ ikpe nke ịnata ihu ọma. Jisọs zara, sị: “Ka ọ hà, bụ́ otú unu na-emeghị ya nye otu onye n’ime ndị a dịkarịsịrị nta [nke ụmụnna m], mụ ka unu na-emeghị ya nye.”
Ya mere ọnụnọ Kraịst n’ike Alaeze, na nwa oge tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe ndị a ná mkpagbu ukwu ahụ, ga-abụ oge ikpe ikpe. Ewu ndị ahụ “[ga-aba ná mbibi, NW] ebighị ebi: ma ndị ezi omume [atụrụ ndị ahụ] ga-aba ná ndụ ebighị ebi.” Matiu 25:31-46; Mkpughe 14:1-3.
◆ N’ihi gịnị ka ọnụnọ Kraịst na-aghaghị iji bụrụ nke anya na-adịghị ahụ, ọrụ dịkwa aṅaa ka ọ na-arụ n’oge ahụ?
◆ N’echiche di aṅaa ka atụrụ ndị ahụ ketara Alaeze ahụ?
◆ Olee mgbe “ntọala nke ụwa” weere ọnọdụ, n’ihi gịnịkwa mere ọ ji bụrụ mgbe ahụ?
◆ N’ihe ndabere di aṅaa ka a na-ekpe ndị mmadụ ikpe ma hà bụ atụrụ ma ọ bụ ewu?