Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 6/15 p. 10-14
  • E Mere Ka Ndị Jehova Guzosie Ike n’okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Mere Ka Ndị Jehova Guzosie Ike n’okwukwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ozi Ala Ọzọ Amalite Ọrụ
  • Iguzosi Ike n’Okwukwe n’Agbanyeghị Mkpagbu
  • A Zara Otu Ajụjụ Dị Mkpa
  • Njem Ozi Ala Ọzọ nke Abụọ Amalite
  • Inwe Ọganihu n’Udo
  • Ihe Nlereanya Si n’Ike Mmụọ Nsọ nke Ọrụ Ije Ozi Ala Ọzọ nke Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Banabas—“Nwa nke Nkasi Obi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • ‘Jehova Na-enye Ha Ike, Ha Ana-ekwu Okwu Ya n’Atụghị Egwu’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 6/15 p. 10-14

E Mere Ka Ndị Jehova Guzosie Ike n’okwukwe

“A na-enye nzukọ Kraịst ike n’okwukwe anyị, ọnụ ọgụgụ ha na-ababigakwa ụba ókè kwa ụbọchị—ỌRỤ 16:5.

1. Olee ụzọ Chineke si jiri Pọl onyeozi mee ihe?

JEHOVA jiri Sọl mee ihe dị ka ‘ihe ọrụ a họpụtara ahọpụta.’ Dị ka Pọl onyeozi, ọ ‘hụrụ ahụhụ ọtụtụ ihe.’ Ma site n’ọrụ ya na n’ọrụ nke ndị ọzọ, nzukọ Jehova nwere ịdị n’otu na mgbasapụ dị ebube.—Ọrụ 9:15, 16.

2. N’ihi gịnị ka o ga-eji bụrụ ihe bara uru ịtụle Ọrụ Ndị Ozi 13:1-16:5?

2 Ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba nke ndị Jentaịl nọ na-aghọ ndị Kraịst, otu nzukọ dị mkpa nke òtù na-achị isi ahụ mekwara ihe dị ukwuu iji wulite ịdị n’otu n’etiti ndị Chineke, ijikwa mee ka ha guzosie ike n’okwukwe. Ọ ga-abụ ihe bara uru nke ukwuu ịtụle ihe ndị a na ihe ndị ọzọ merenụ, bụ́ ndị e dekọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi 13:1-16:5, n’ihi na Ndịàmà Jehova nọ ugbu a na-enwe ahụmahụ nke ito uto na ngọzi ime mmụọ ndị yiri nke ahụ. (Aịsaịa 60:22) (Mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye nke isiokwu ndị a dabeere n’Ọrụ Ndị Ozi n’ime mbipụta nke a, anyị na-atụ aro ka ị gụọ akụkụ akwụkwọ ndị ahụ e depụtara ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo.)

Ndị Ozi Ala Ọzọ Amalite Ọrụ

3. Ọrụ dị aṅaa ka “ndị amụma na ndị ozizi” rụrụ n’Antiọk?

3 Ndị ikom ndị ọgbakọ ahụ dị n’Antiọk, Siria zipụrụ, nyeere ndị kwere ekwe aka iguzosi ike n’okwukwe. (13:1-5) N’Antiọk, e nwere “ndị amụma na ndị ozi” bụ́ Banabas, Simeọn (Naịga), Lusiọs onye Sairini, Manaen, na Sọl onye Tasọs. Ndị amụma kọwara Okwu Chineke wee buokwa amụma ihe ndị gaje ime n’ọdịnihu ebe ndị ozizi na-enye ọzụzụ n’Akwụkwọ nsọ na n’ibi obi nsọpụrụ Chineke. (1 Ndị Kọrint 13:8; 14:4) Banabas na Sọl natara ọrụ pụrụ iche. N’ịkpọrọ nwa nwanne Banabas, bụ́ Mak, ha jere Saịprọs. (Ndị Kọlọsi 4:10) Ha kwusara ozi ọma n’ụlọ nzukọ ndị dị n’ọdụ ụgbọ mmiri ọwụwa anyanwụ ahụ nke Salamis, ma e nweghị ihe ndekọ ọ bụla gosiri na ndị Juu nọ n’ebe ahụ naara ha nke ọma. Ebe ọ bụ na ndị dị otú ahụ nọ n’ọnọdụ dị mma n’ụzọ ihe onwunwe, mkpa dị aṅaa ka Mesaịa ahụ dị ha?

4. Gịnị mere mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ nọgidere na-ekwusa ozi ọma na Saịprọs?

4 Chineke gọziri ọrụ ịgba àmà ọzọ a rụrụ na Saịprọs. (13:6-12) Na Pafọs, ndị ozi ala ọzọ ahụ zutere onye Juu ahụ bụ onye mgbaasị na onye amụma ụgha, bú Ba-Jisọs (Elimas). Mgbe ọ nwara igbochi Onyeisi ahụ bụ Sajiọs Pọlọs ịnụ okwu Chineke, Sọl jupụtara ná mmụọ nsọ wee sị: “Gị onye jupụtara n’aghụghọ nile na ihe nile jọgburu onwe ya, gị nwa Ekwensu, gị onyeiro ezi omume nile, ị gaghị ahapụ ịkwahie ụzọ nile [ziri ezi nke Jehova, NW]?” Mgbe ahụ, aka Chineke dịkwasịrị Elimas inye ya ahụhụ, o wee kpuo ìsì ruo nwa oge, Sajiọs Pọlọs wee “kwere, ebe ibubo ozizi nke [Jehova, NW] nwụrụ ya n’ahụ.”

5, 6. (a) Mgbe Pọl kwuru okwu n’ụlọ nzukọ ahụ dị n’Antiọk nke Pisidia, gịnị ka o kwuru banyere Jisọs? (b) Mmetụta di aṅaa ka okwu Pọl nwere?

5 Site na Saịprọs, ndị ahụ ji ụgbọ mmiri jeruo obodo Paga nke dị n’Asia Minor. Mgbe ahụ, Pọl na Banabas chere ihu n’ebe ugwu gabiga ndagwurugwu dị iche iche, ma eleghị anya ‘n’ihe ize ndụ site n’osimiri na ndị na-apụnara mmadụ ihe,’ wee ruo Antiọk, Pisidia. (2 Ndị Kọrint 11:25, 26) Pọl kwuru okwu n’ụlọ nzukọ dị n’ebe ahụ. (13:13-41) Ọ tụleghachiri mmeso Chineke mesoro ndị Israel wee mee ka a mara onye ahụ sitere n’usoro ọmụmụ Devid bụ Jisọs dị ka Onye nzọpụta ahụ. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị ndị Juu kwuru ka e gbuo Jisọs, e mezuru nkwa ahụ e kwere ndị nna ha ochie mgbe Chineke kpọlitere ya site n’ọnwụ. (Abụ Ọma 2:7; 16:10; Aịsaịa 55:3) Pọl dọrọ ndị na-ege ya ntị aka ná ntị ka ha ghara ilelị onyinye nzọpụta ahụ anya, bụ́ nke Chineke nyere site na Kraịst.—Habakuk 1:5, Septuagint.

6 Okwu Pọl kpaliri mmasị, dịkwa ka okwu ihu ọha Ndịàmà Jehova na-ekwu taa na-akpali mmasị. (13:42-52) N’Ụbọchị izu ike sonị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo ahụ dum gbakọtara ịnụrụ okwu Jehova, nke a mekwara ka ndị Juu jupụta n’ekworo. Leenụ, n’ime nanị otu izu abalị asaa, ndị ozi ala ọzọ ahụ atọghatawo ndị Jentaịl karịa ka ndị Juu ahụ meworo ná ndụ ha nile! Ebe ọ bụ na ndị Juu ahụ ji nkwulu na-ekwugide ihe Pọl na-ekwu, oge eruwo ka ìhè ime mmụọ nwuo n’ebe ọzọ, a gwakwara ha, sị: ‘Ebe unu na-enupụ okwu Chineke n’ahụ unu wee na-ekpekwa onwe unu ikpe dị ka ndị na-ekwesịghị ndụ ebighị ebi, anyị na-echigharịkwuru ndị mba ọzọ.’—Aịsaịa 49:6.

7. Olee ụzọ Pọl na Banabas si meghachi omume ná mkpagbu?

7 Ugbu a, ndị Jentaịl ahụ malitere ịṅụrị ọṅụ, ndị nile nwekwara ezi ọchịchọ inweta ndụ ebighị ebi ghọrọ ndị kwere ekwe. Otú ọ dị, ka e ji okwu Jehova na-agabiga mba ahụ dum, ndị Juu kpaliri ụmụ nwanyị a maara aha ha (ma eleghị anya ịrụgide ndị di ha ma ọ bụ ndị ọzọ) na ndị ikom bụ ndị isi obodo ịkpagbu Pọl na Banabas wee tụpụ ha n’ókèala ha. Ma nke ahụ akwụsịghị ndị ozi ala ọzọ ahụ. Ihe ha mere bụ nanị ‘ịkụchapụ ájá nke ụkwụ ha megide ha’ wee jee Aịkọniọm (nke bụ Konya n’oge a), bụ́ obodo ukwu nke dị n’ógbè ndị Rom nke Galetia. (Luk 9:5; 10:11) Ma, gịnị banyere ndị na-eso ụzọ ndị ahụ a hapụrụ n’Antiọk nke Pisidia? Ebe e meworo ka ha guzosie ike n’okwukwe, ha nọgidere “wee jupụta n’ọṅụ na mmụọ nsọ.” Nke a na-enyere anyị aka ịhụ na ọ bụghị iwu na mkpagbu ga-egbochi ọganihu ime mmụọ.

Iguzosi Ike n’Okwukwe n’Agbanyeghị Mkpagbu

8. Gịnị si n’ọrụ ịgba àmà gara nke ọma a rụrụ n’Aịkọniọm pụta?

8 Pọl na Banabas n’onwe ha guzosikwara ike n’okwukwe n’agbanyeghị mkpagbu. (14:1-7) Ná nzaghachi nye ịgba àmà ha n’ụlọ nzukọ ahụ dị n’Aịkọniọm, ọtụtụ ndị Juu na ndị Grik ghọrọ ndị kwere ekwe. Mgbe ndị Juu na-ekweghị ekwe kpaliri ndị Jentaịl imegide ndị ọhụrụ ahụ kwere ekwe, ndị ọrụ abụọ ahụ jiri ikike sitere n’aka Chineke kwuwaa okwu, Chineke gosikwara nkwado ya site n’inye ha ike ịrụ ọrụ ebube dị iche iche. Nke a mere ka ìgwè mmadụ ahụ na-eme ihe ike kewaa ụzọ abụọ, otu akụkụ na-akwado ndị Juu, akụkụ nke ọzọ na-akwado ndị ozi ahụ (ndị ahụ e zitere ezite). Ndị ozi ahụ abụghị ndị na-atụ egwu na-enweghị isi, ma mgbe ha matara ihe banyere atụmatụ a na-eme ịtụ ha nkume, ha ji amamihe mee ihe wee hapụ ebe ahụ jee ikwusa ozi ọma na Laikaọnia, bụ́ otu ógbè dị n’Asia Minor n’ebe ndịda Galetia. Site n’iji amamihe mee ihe, anyị onwe anyị pụkwara ịnọgide na-arụsi ọrụ ike n’ozi ahụ n’agbanyeghị mmegide.—Matiu 10:23.

9, 10. (a) Olee ụzọ ndị bi na Listra si meghachi omume banyere ọgwụgwọ a gwọrọ otu nwoke dara ngwụrọ? (b) Gịnị bụ mmeghachi omume Pọl na Banabas na Listra?

9 Ebe ọzọ a gbara àmà bụ obodo ndị Laikaọnia ahụ bụ Listra. (14:8-18) N’ebe ahụ, Pọl gwọrọ otu nwoke nke dara ngwụrọ site n’afọ nne ya. N’aghọtaghị na ọ bụ Jehova mere ka e nwee ike ịrụ ọrụ ebube ahụ, ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu, sị: “Chi anyị rịdakwuuru anyị n’oyiyi mmadụ.” Ebe ọ bụ na e ji asụsụ ndị Laikaọnia kwuo nke a, Banabas na Pọl amataghị ihe na-emenụ. Ebe ọ bụ na Pọl na-ebute ụzọ n’ikwu okwu, ndị ahụ lere ya anya dị ka Makuri (Hermes) (bụ́ onye ahụ okwu na-aga were were n’ọnụ nke na-ejere chi ndị ọzọ ozi), cheekwa na Banabas bụ Jupita (Zeus), bụ́ chi bụ isi nke ndị Grik.

10 Ọbụna na onye nchụaja nke Jupita sekputara ehi, wetakwa okoko osisi ka o wee chụọrọ Pọl na Banabas àjà. Ma eleghị anya n’ịsụ asụsụ Grik a na-aghọtazu n’ebe nile ma ọ bụkwanụ site n’ọnụ onye nsụgharị okwu, ndị ọbịa ahụ mere ngwa ngwa ịkọwa na ha onwe ha bụkwa ụmụ mmadụ ndị nwere adịghị ike dị iche iche, na ha na-ekwusakwa ozi ọma ka ụmụ mmadụ wee nwee ike isi “n’ihe efu ndị a” (chi ndị na-adịghị ndụ, ma ọ bụ arụsị) wee chigharịkwute Chineke nke dị ndụ. (1 Ndị Eze 16:13; Abụ Ọma 115:3-9; 146:6) Ee, Chineke kweburu ka mba nile (ma ọ bụghị ndị Hibru) gaa n’ụzọ nke aka ha, ọ bụ ezie na ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà banyere ịdị adị ya na ịdị mma ya ‘site n’inye ha mmiri ozuzo na oge mkpụrụ, na-emeju obi ha n’ihe ọzụzụ na ọṅụ.’ (Abụ Ọma 147:8) N’agbanyeghị ntụgharị uche dị otú a, o siiri Banabas na Pọl ike igbochi ìgwè mmadụ nile ahụ ka ha ghara ịchụ àjà nye ha. Ma, ndị ozi ala ọzọ ahụ anaraghị ofufe dị ka ndị bụ chi, ha ejighịkwa ike dị otú ahụ mee ihe iguzobe Iso Ụzọ Kraịst n’ógbè ahụ. Nke a bụ nnọọ ezi ihe nlereanya, karịsịa, ma ọ bụrụ na ọ na-agụ anyị agụụ ịnara otuto n’ihi ihe Jehova kwere ka anyị mezuo n’ije ozi ya!

11. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’okwu ahụ bụ: “Anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke”?

11 Na mberede, mkpagbu bilitere. (14:19-28) Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? N’ịbụ ndị ndị Juu si Antiọk nke Pisidia na Aịkọniọm bịa, kpaliri, ìgwè mmadụ ahụ tụrụ Pọl nkume wee dọkpụpụ ya n’azụ obodo ahụ, na-eche na ọ nwụwo. (2 Ndị Kọrint 11:24, 25) Ma mgbe ndị na-eso ụzọ gbara ya gburugburu, o biliri, wee banyeghachi Listra n’enweghị onye hụtara ya, ma eleghị anya n’oge ọchịchịrị gbachiri. N’echi ya, ya na Banabas hapụrụ wee gaa Dabe, ebe ọtụtụ mmadụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ. Mgbe ha bịaghachiri na Listra, Aịkọniọm, na Antiọk, ndị ozi ala ọzọ ahụ wusiri ndị ahụ na-eso ụzọ ike, gbaa ha ume ịnọgide n’okwukwe ahụ, wee sị: “Anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke.” Dị ka ndị Kraịst, anyị onwe anyị na-atụkwa anya ịgabiga mkpagbu, anyị ekwesịghịkwa ịnwa izere ha site n’ịgọnarị okwukwe anyị. (2 Timoti 3:12) N’oge ahụ, a họpụtara ndị okenye ‘ọgbakọ dị iche iche, bụ́ ndị e degaara akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Galetia.

12. Mgbe njem ozi ala ọzọ Pọl nke mbụ gwụsịrị, gịnị ka ndị ozi ala ọzọ abụọ ahụ mere?

12 Mgbe ha na-agabiga n’etiti Pisidia, Pọl na Banabas kwusara okwu ahụ na Paga, bụ́ otu obodo a ma ama nke dị na Pamfìlia. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ha laghachiri Antiọk, Siria. Ebe njem Pọl nke mbụ gwụsịworo ugbu a, ndị ozi ala ọzọ abụọ ahụ kọọrọ ọgbakọ dị n’ebe ahụ “ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke Chineke sooro ha mee, kọọkwara ha na o meghererịị ọnụ ụzọ okwukwe nye ndị mba ọzọ.” Ha sooro ndị na-eso ụzọ nọ n’Antiọk nọrọ ruo ogologo oge ụfọdụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a mekwara ihe dị ukwuu ime ka ha guzosie ike n’okwukwe. Nleta ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eme n’oge a na-enwekwa otu mmetụta ime mmụọ dị otú ahụ.

A Zara Otu Ajụjụ Dị Mkpa

13. Ka e wee ghara ikewa Iso Ụzọ Kraịst gaa n’òtù nke ndị Hibru na nke na-abụghị nke ndị Juu, gịnị ka ọ dị mkpa ime?

13 Iguzosi ike n’okwukwe chọrọ ịdị n’otu n’echiche. (1 Ndị Kọrint 1:10) Ka e wee ghara ikewa Iso Ụzọ Kraịst gaa n’òtù nke ndị Hibru na nke na-abụghị nke ndị Juu, ọ dị mkpa ka òtù na-achị isi mee mkpebi ma ọ̀ bụ na ndị Jentaịl ahụ na-enubata ná nzukọ Chineke aghaghị idebe Iwu Moses wee bụrụ ndị e biri úgwù. (15:1-5) Ụfọdụ ndị si na Judia ejeworị Antiọk nke Siria wee malitekwa ikuziri ndị Jentaịl kwere ekwe n’ebe ahụ na ọ gwụlakwa ma hà biri úgwù, na a pụghị ịzọpụta ha. (Ọpụpụ 12:48) Ya mere, e zijere Pọl, Banabas na ndị ọzọ ijekwuru ndị ozi na ndị okenye ahụ nọ na Jerusalem. Ọbụna n’ebe ahụ, ndị kwere ekwe, ndị bụbu ndị Farisii ji idebe iwu kpọrọ ihe dị oké mkpa siri ọnwụ na ndị Jentaịl aghaghị ibi úgwù, debekwa Iwu ahụ.

14. (a) Ọ bụ ezie na e nwere nrụrịta ụka ná nzukọ ahụ e mere na Jerusalem, ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka e setịpụrụ? (b) Gịnị bụ isi ihe dị ná ntụgharị uche nke Pita n’oge ahụ?

14 E mere otu nzukọ iji chọpụta ihe bụ uche Chineke. (15:6-11) Ee, e nwere nrụrịta ụka, ma e nweghị esemokwu ọ bụla mgbe ndị ikom, ndị nwere ihe ndị ha kweresiri ike na ha, na-ekwpụta echiche ha—ezi ihe nlereanya nye ndị okenye n’oge a! Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Pita sịrị: ‘Chineke họọrọ isite n’ọnụ m mee ka ndị JentaịI [dị ka Kọniliọs] nụ ozi ọma ahụ wee kwere. Ọ gbaara ha àmà site n’inye ha mmụọ nsọ ahụ, ọ kpaghịkwa ókè ọ bụla n’etiti anyị na ha. [Ọrụ 10:44-47] Ya mere, gịnị mere unu na-anwa Chineke ọnwụnwa site n’ikonye yoke [ibu ọrụ nke idebe Iwu ahụ] n’olu ha, bụ́ nke ma anyị onwe anyị ma ndị nna nna anyị hà na-apụghị ibu? Anyị [bụ́ ndị Juu dị ka anụ ahụ si dị] tụkwasịrị obi na a ga-azọpụta anyị site n’amara nke Onyenwe anyị Jisọs, n’otu ụzọ ahụ a ga-azọpụtakwa ndị ahụ.’ Nnakwere Chineke nakweere ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù gosiri na obibi úgwù na idebe Iwu ahụ abụghị ihe a chọrọ maka nzọpụta.—Ndị Galetia 5:1.

15. Isi ihe dịgasị aṅaa ka Jemes kwupụtara, gịnịkwa ka ọ tụrụ aro ka e degara ndị Kraịst bụ ndị Jentaịl?

15 Ọ dịghị onye kwuru okwu ọ bụla ná nzukọ ahụ dum mgbe Pita kwusịrị, ma a gaje ikwu ihe ndị ọzọ. (15:12-21) Banabas na Pọl kọrọ banyere ihe ịrịba ama ndị Chineke sitere n’aka ha mee n’etiti ndị Jentaịl. Mgbe ahụ, onyeisi oche, bụ́ onye ahụ otu nne ji ya na Jisọs, bụ́ Jemes kwuru, sị: ‘Simeọn [bụ́ aha Hibru nke Pita] akọworo anyị otú Chineke si chee ndị mba ọzọ ihu isite n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.’ Jemes gosiri na amụma ahụ e buru banyere ‘iwughachi ụlọ ikwuu Devid’ (iguzobeghachi ọbụbụeze n’usoro ọmụmụ Devid) bụ nke a na-emezu ná nchịkọta nke ndị na-eso ụzọ Jisọs (ndị nketa Alaeze) site ma n’etiti ndị Juu ma n’etiti ndị Jentaịl. (Emọs 9:11,12, Septuagint; Ndị Rom 8:17) Ebe ọ bụ na Chineke zubere ime nke a, ndị ahụ na-eso ụzọ kwesịrị ịnakwere ya. Jemes tụrụ aro ka e degara ndị Kraịst bụ ndị Jentaịl akwụkwọ ka ha zere (1) ihe ndị e merụrụ emerụ site n’arụsị, (2) ịkwa iko, na (3) ọbara na anụ a nyagburu anyagbu. Mmachibido iwu ndị a dị n’ihe ndị ahụ Moses dere, bụ́ ndị a na-agụ n’ụlọ nzukọ nile n’ụbọchị izu ike ọ bụla.—Jenesis 9:3, 4; 12:15-17; 35:2, 4.

16. N’isi ihe atọ dị aṅaa ka akwụkwọ ozi ahụ òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ dere nyere nduzi banyere ha ruokwa taa?

16 Ugbu a, òtù na-achị isi ahụ zijeere ndị Jentaịl bụ ndị Kraịst akwụkwọ ozi, bụ́ ndị bi n’Antiọk, Siria, na Silisia. (15:22-35) Mmụọ nsọ na ndị dere akwụkwọ ozi ahụ kpọrọ òkù ka e zere ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị; ọbara (bụ nke ụfọdụ ndị na-eri mgbe mgbe); anụ ndị a nyagburu anyagbu n’ekweghị ka ọbara ha gbapụ (ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-ekpere arụsị na-ele anụ dị otú ahụ anya dị ka ihe dị oké mma oriri); na ịkwa iko (Grik, por-nei’a, nke na-egosi mmekọahụ ọ bụla na-ezighị ezi n’etiti ndị na-anọghị n’alụmdi na nwunye Akwụkwọ nsọ kwadoro). Site n’izere ihe ndị dị otú ahụ, ha ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ime mmụọ, ọbụna dị ka Ndịàmà Jehova na-enwe n’oge a n’ihi na ha na-emezu “ihe ndị a dị mkpa.” Okwu ahụ bụ “Ahụ ike dịkwara unu!” (NW) pụtara ịsị “Nọdụnụ nke ọma,” e kwesịghịkwa ikwubi na ihe ndị a a chọrọ ha n’aka bụ, n’ụzọ bụ isi, ihe metụtara nchebe nke ahụ ike. Mgbe a gụrụ akwụkwọ ozi ahụ n’Antiọk, ọgbakọ ahụ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi agbamume o nyere ha. N’oge ahụ, e mekwara ka ndị Chineke nọ n’Antiọk guzosie ike n’okwukwe site n’okwu agbamume nke Pọl, Saịlas, Banabas, na ndị ọzọ. Ka anyị onwe anyị na-achọkwa ụzọ anyị ga-esi gbaa ndị kwere ekwe ibe anyị ume, na-ewulikwa ha elu.

Njem Ozi Ala Ọzọ nke Abụọ Amalite

17. (a) Nsogbu dị aṅaa bilitere mgbe a na-eme atụmatụ ịga njem ozi ala ọzọ nke abụọ? (b) Pọl na Banabas si aṅaa dozie esemokwu ha?

17 Otu nsogbu bilitere mgbe a na-akwadebe ịga njem ozi ala ọzọ nke abụọ. (15:36-41) Pọl tụrụ aro ka ya na Banabas jeghachi ileta ọgbakọ ndị dị na Saịprọs na Asia Minor. Banabas kwere ma chọọ ịkpọrọ nwa nwanne ya bụ Mak. Pọl jụrụ ajụ n’ihi na Mak hapụrụ ha na Pamfilia n’oge gara aga. Mgbe nke ahụ mere, “oké iwe” dapụtara. Ma Pọl ma Banabas adịghị nke chọrọ iwepụ ụta n’isi nke onwe ya site n’ịgbalị ime ka ndị okenye ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ òtù ahụ na-achị isi tinye ọnụ n’okwu ahụ nke dịịrị nanị ha abụọ. Lee nnọọ ezi ihe nlereanya nke a bụ!

18. Gịnị sitere ná nkewa nke Pọl na Banabas pụta, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe nke a merenụ?

18 Otú ọ dị, esemokwu nke a kpatara nkewa. Banabas kpọọrọ Mak jewe Saịprọs. Pọl, ya na Saịlas dị ka onye òtù ya, “wee gabiga n’ime Siria na Silisia, na-eme ka nzukọ Kraịst guzosie ike.” O Pụrụ ịbụ na nkekọ ezinụlọ dị n’etiti ha metụtara mkpebi Banabas, ma ọ gaara egosiworị nnabata nke ọbụbụ Pọl bụ onyeozi na nhọrọ ya dị ka ‘ihe ọrụ a họpụtara ahọpụta.’ (Ọrụ 9:15) Gịnịkwanụ banyere anyị onwe anyị? Ihe nke a merenụ kwesịrị ime ka anyị ghọta mkpa ọ dị ịnakwara ndokwa ọchịchị Chineke, na-ekwenyekwara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” n’ụzọ zuru ezu!—Matiu 24:45-47.

Inwe Ọganihu n’Udo

19. Ihe nlereanya dị aṅaa dịịrị ndị Kraịst na-eto eto n’oge a n’ihe banyere Timoti?

19 E kweghị ka esemokwu nke a metụta udo nke ọgbakọ. A nọgidere na-eme ka ndị Chineke guzosie ike n’okwukwe. (16:1-5) Pọl na Saịlas jeruru Dabe, gaakwa Listra. N’ebe ahụ ka Timoti bi, bụ́ nwa nke nwanyị onye Juu kwere ekwe, bụ́ Yunaịsị na di ya onye Grik na-ekweghị ekwe. Timoti ka bụ nnọọ nwata, n’ihi na ọbụna 18 ma ọ bụ 20 afọ mgbe nke a gasịrị, a ka gwara ya, sị: “Ekwela ka onye ọ bụla lelịa nwata ị bụ anya.” (1 Timoti 4:12) Ebe ọ bụ na ‘ụmụnna ndị bi na Listra nakwa [n’Aịkọniọm n’ihe dị ka 18 maịlụ (29 kilomita) site n’ebe ahụ] gbaara ya ezi àmà,’ a maara ya nke ọma n’ihi ezi ije ozi na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị o nwere. Ndị na-eto eto bụ ndị Kraịst n’oge a kwesịrị ịchọ enyemaka Jehova iji wulite aha ọma yiri nke ahụ. Pọl biri Timoti úgwù n’ihi na ha gaje ije n’ụlọ na n’ụlọ nzukọ dị iche iche nke ndị Juu, bụ́ ndị maara na nna Timoti bụ onye Jentaịl, onyeozi ahụ achọghịkwa ihe ọ bụla ga-egbochi ndị Juu bụ ndị ikom na ndị inyom, ndị ọ dị mkpa ịmụta ihe banyere Mesaịa ahụ. N’emebighị ụkpụrụ Bible, Ndịàmà Jehova na-emekwa ihe ha pụrụ ime iji mee ka ụdị mmadụ nile nakwere ozi ọma ahụ.—1 Ndị Kọrint 9: 19-23.

20. Mmetụta dị aṅaa ka ime ihe kwekọrọ n’akwụkwọ ozi ahụ òtù na-achị si dere nwere, oleekwa otú i chere na nke a kwesịrị isi metụta anyị?

20 Mgbe ha kpọọrọ Timoti dị ka onye na-ejere ha ozi, Pọl na Saịlas nyefere ndị ahụ na-eso ụzọ iwu ndị ahụ òtù na-achị isi nyere ka ha wee debe ha. Gịnị sikwa na nke a pụta? Ma eleghị anya n’ikwu banyere Siria, Silisia, na Galetia, Luk dere, sị: “A na-enye nzukọ Kraịst ike n’okwukwe anyị, ọnụ ọgụgụ ha na-ababigakwa ụba ókè kwa ụbọchị.” Ee, ime ihe kwekọrọ n’akwụkwọ ozi ahụ òtù na-achị isi detara rụpụtara ịdị n’otu na ọganihu ime mmụọ. Lee ezi ihe nlereanya nke a bụ maka oge anyị a dị oké egwu, mgbe ọ dị mkpa ka ndị Jehova dịrị n’otu, guzosiekwa ike n’okwukwe!

I Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Olee ụzọ Pọl na Banabas si meghachi omume banyere mkpagbu?

◻ Gịnị ka a pụrụ ịmụta site n’okwu ahụ bụ: “Anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke”?

◻ Ndụmọdụ dị aṅaa ka anyị na-enweta site n’isi ihe atọ ahụ dị n’akwụkwọ ozi ahụ òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ zipụrụ?

◻ Olee ụzọ isi ihe ndị mere ka ndịàmà Jehova n’ime narị afọ mbụ ahụ guzosie ike n’okwukwe si emetụta anyị taa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya