Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/15 p. 20-23
  • Banabas—“Nwa nke Nkasi Obi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Banabas—“Nwa nke Nkasi Obi”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Inyeaka Nwere Afọ Ọma
  • N’Antiọk
  • Ọrụ Ozi Ala Ọzọ Pụrụ Iche
  • Okwu Ibi Úgwù
  • “Oké Iwe”
  • Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • ‘Jehova Na-enye Ha Ike, Ha Ana-ekwu Okwu Ya n’Atụghị Egwu’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • E Mere Ka Ndị Jehova Guzosie Ike n’okwukwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ihe Nlereanya Si n’Ike Mmụọ Nsọ nke Ọrụ Ije Ozi Ala Ọzọ nke Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/15 p. 20-23

Banabas—“Nwa nke Nkasi Obi”

OLEE mgbe ikpeazụ i nwetara nkasi obi site n’aka enyi gị? Ì chetara mgbe ikpeazụ i nyere ya onye ọzọ? Site n’oge ruo n’oge, anyị nile na-enwe mkpa agbamume, leekwa obi ekele anyị na-enwe n’ebe ndị jiri ịhụnanya nye ya nọ! Ịkasi obi pụtara iwepụta oge gee ntị, ghọta, ma nye aka. Ị̀ dị njikere ime nke ahụ?

Otu onye nke gosiri ịdị njikere dị otú ahụ n’ụzọ kwesịrị nṅomi bụ Banabas, onye “bụ ezi nwoke, jupụtakwa na Mmụọ Nsọ na okwukwe.” (Ọrụ 11:24) Gịnị mere a pụrụ iji kwuo nke ahụ banyere Banabas? Gịnị ka o meworo iji ruo eru maka nkọwa a?

Onye Inyeaka Nwere Afọ Ọma

Ezigbo aha ya bụ Josef, ma ndị ozi nyere ya utu aha na-akọwa ihe nke kwekọrọ nnọọ n’àgwà ya—Banabas, nke pụtara “Nwa nke nkasi obi.”a (Ọrụ 4:36) Ọ dịbeghị nnọọ anya e hiwere ọgbakọ ndị Kraịst. Ụfọdụ chere na Banabas bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs tupu mgbe ahụ. (Luk 10:1, 2) Ma ọ̀ dị otú ahụ ma ọ bụ na ọ dịghị, nwoke a akpaziwo àgwà.

Ngwa ngwa Pentikọst 33 O.A. gasịrị, Banabas, bụ́ onye Livaị si Saịprọs, sitere n’afọ ofufo ree ala wee nye ndị ozi ego ya. Gịnị mere o ji mee nke ahụ? Ihe ndekọ dị n’Ọrụ na-agwa anyị na n’etiti ndị Kraịst nọ na Jerusalem n’oge ahụ, “e wee na-eke òkè enye ha nile n’otu n’otu, dị ka ọ dị onye ọ bụla mkpa.” Ihe àmà na-egosi na Banabas hụrụ na e nwere mkpa, o jikwa ọmịiko mee ihe banyere ya. (Ọrụ 4:34-37) Ọ ga-abụ na ọ bụ nwoke nwere akụ̀ na ụba, ma ọ laghị azụ n’iwepụta ma ihe onwunwe ya ma onwe ya maka ọganihu ọdịmma Alaeze.b “Ebe ọ bụla Banabas hụrụ ụmụ mmadụ ma ọ bụ ọnọdụ ndị chọrọ agbamume, ọ na-enye agbamume nile o nwere ike inye,” ka ọkà mmụta bụ́ F. F. Bruce na-ekwu. Nke a pụtara ìhè n’akụkọ nke abụọ ebe ọ pụtara.

N’ihe dị ka na 36 O.A., Sọl nke Tasọs (onye ga-aghọ Pọl onyeozi n’ọdịnihu), bụ́ onye Kraịst ugbu a, na-eme mgbalị ịkpọtụrụ ọgbakọ dị na Jerusalem, “ma ha nile na-atụ egwu ya, ebe ha na-ekweghị na ọ bụ onye na-eso ụzọ.” Olee otú ọ ga-esi mee ka ọgbakọ a kweta na nchegharị ya bụ nke ezigbo ya, ọ bụghịkwa aghụghọ efu iji bibikwuo ya? “Banabas jidere ya n’aka, wee duru ya jekwuru ndị ozi.”—Ọrụ 9:26, 27; Ndị Galetia 1:13, 18, 19.

E kwughị ihe mere Banabas jiri tụkwasị Sọl obi. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, “Nwa nke nkasi obi” ahụ mere ihe kwekọrọ n’utu aha ya site n’ige Sọl ntị na inyere ya aka pụọ n’ọnọdụ ọjọọ nke yiri ka olileanya adịghị na ya. Ọ bụ ezie na Sọl laghachiri n’obodo ya bụ́ Tasọs, ndị ikom abụọ ahụ aghọworị enyi. N’afọ ndị na-abịa, nke ahụ gaje ịrụpụta ihe ndị dị mkpa.—Ọrụ 9:30.

N’Antiọk

N’ihe dị ka na 45 O.A., akụkọ ruru Jerusalem banyere ihe ịtụnanya ndị na-eme n’Antiọk nke Siria—ọtụtụ ndị na-asụ Grik bi n’obodo ahụ na-aghọ ndị kwere ekwe. Ọgbakọ ahụ zipụrụ Banabas ịga mee nchọpụta na ịhazi ọrụ ahụ n’ebe ahụ. Nhọrọ ahụ magburu onwe ya. Luk na-akọ, sị: “Mgbe ọ bịaruru, mgbe ọ hụkwara amara Chineke, ọ ṅụrịa; o wee rịọ ha nile, ka ha zube n’obi ha ịnọgide n’ebe Onyenwe anyị nọ: n’ihi na ọ bụ ezi nwoke, jupụtakwa na Mmụọ Nsọ na okwukwe: e wee tụkwasị oké ìgwè mmadụ nye Onyenwe anyị.”—Ọrụ 11:22-24.

Nke ahụ abụghị nanị ihe o mere. Dị ka ọkà mmụta bụ́ Giuseppe Ricciotti si kwuo, “Banabas bụ nwoke ji ọgụgụ isi eme ihe, ọ ghọtakwara ozugbo mkpa ọ dị ịbanye n’ọrụ iji hụ na owuwe ihe ubi bara ụba sochiri ịma pokopoko dị otú ahụ na-enye nchekwube. Ya mere, mkpa bụ́ isi bụ inwe ndị ọrụ owuwe ihe ubi.” N’ịbụ onye sitere Saịprọs, ikekwe ọ maara Banabas ahụ iso ndị Jentaịl na-emekọ ihe. Ọ pụrụ ichewo na ya ruru eru karịsịa ikwusara ndị ọgọ mmụọ ozi ọma. Ma ọ dị njikere iwebata ndị ọzọ n’ọrụ a na-atọ ụtọ, nke na-agbakwa ume.

Banabas chere banyere Sọl. Ma eleghị nnọọ anya, Banabas maara banyere mkpughe amụma ahụ e nyere Ananaịas n’oge nchegharị Sọl, na onye ahụ bụbu onye mkpagbu bụ ‘ihe ọrụ a họpụtara, iburu aha Jisọs chee n’ihu mba nile.’ (Ọrụ 9:15) Ya mere Banabas gawara Tasọs—njem ihe dị ka kilomita 200 nanị n’uje—ịchọta Sọl. Ha abụọ rụkọrọ ọrụ ọnụ ruo otu afọ dum, “ọ bụkwa n’Antiọk ka e buru ụzọ” n’oge a “kpọọ ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị Kristian.”—Ọrụ 11:25, 26.

N’oge ọchịchị Klọdiọs, oké ụnwụ dakwasịrị akụkụ dị iche iche nke Alaeze Ukwu Rom. Dị ka onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, na Jerusalem “ọtụtụ mmadụ nwụrụ n’ihi enweghị ihe dị mkpa iji nweta ihe oriri.” N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ nọ n’Antiọk “onye ọ bụla ka ihe o nwere hà, wee zube izigara ụmụnna n’ime Kraịst ndị bi na Judia ihe inyere ha aka: nke ha mekwara, na-ezigara ndị okenye site n’aka Banabas na Sọl.” Mgbe ha jezusịrị ozi ahụ, ha abụọ kpọ Jọn Mak laghachi Antiọk, ebe a gụnyere ha ná ndị amụma na ndị ozizi nke ọgbakọ.—Ọrụ 11:29, 30; 12:25; 13:1.

Ọrụ Ozi Ala Ọzọ Pụrụ Iche

Mgbe ahụ ihe pụrụ iche mere. “Mgbe ha na-efe Onyenwe anyị ofufe, na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, Kewapụtara m Banabas na Sọl ịrụ ọrụ nke M kpọworo ha ka ha rụọ.” Cheedị echiche! Mmụọ Jehova nyere iwu ka e nye mmadụ abụọ ahụ ọrụ pụrụ iche. “Ya mere ndị ahụ, ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha rịdata na Seleusia; ha wee site n’ebe ahụ baa n’ụgbọ jee Saịprọs.” A pụkwara n’izi ezi ịkpọ Banabas onyeozi, ma ọ bụ onye e zigara.—Ọrụ 13:2, 4; 14:14.

Mgbe ha gabigasịrị Saịprọs, tọghatakwa Sajiọs Pọlọs, bụ́ onye isi obodo ahụ Rom na-achị, ha jere Paga, n’ụsọ oké osimiri dị n’ebe ndịda nke Asia Minor, ebe Jọn Mak hapụrụ ha ma laghachi Jerusalem. (Ọrụ 13:13) O yiri ka ruo mgbe ahụ Banabas na-ebute ụzọ, ikekwe dị ka onye ibe nke nwere ahụmahụ karị. Site n’oge a gaa n’ihu, ọ bụ Sọl (onye a na-akpọ Pọl ugbu a) na-ebutezi ụzọ. (Tụlee Ọrụ 13:7, 13, 16; 15:2.) Ihe nke a na-eme ò wutere Banabas? Ee e, ọ bụ onye Kraịst tozuru okè onye ji obi umeala ghọta na Jehova jikwa onye ibe ya na-eme ihe n’ụzọ dị ike. Site n’ọnụ ha, Jehova chọrọ ka ókèala ndị ọzọkwa nụ ozi ọma ahụ.

N’ezie, tupu a chụpụ ha abụọ n’Antiọk nke Pisidia, ebe ahụ nile nụrụ okwu Chineke site n’ọnụ Pọl na Banabas, ọtụtụ ndị nabatakwara ozi ahụ. (Ọrụ 13:43, 48-52) N’Aịkọniọm, “oké ìgwè mmadụ, ma ndị Juu ma ndị Grik, kwere na Jisọs.” Nke a kpaliri Pọl na Banabas ịnọgide n’ebe ahụ ruo ogologo oge, ‘na-ekwuwa okwu n’ime Onyenwe anyị, Onye na-enye ka e mee ihe ịrịba ama na ọrụ ebube dị iche iche site n’aka ha.’ N’ịnụ na a kpawo nkata ịtụ ha nkume, ha abụọ ji amamihe gbalaga ma gaa n’ihu n’ọrụ ha na Laịkaọnia, Listra, na Dabe. N’agbanyeghị ahụmahụ ndị dị ize ndụ na Listra, ma Banabas ma Pọl nọgidere “na-eme ka mkpụrụ obi ndị na-eso ụzọ Jisọs guzosie ike, na-arịọ ha ka ha nọgide n’okwukwe anyị, na-egosikwa na anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke.”—Ọrụ 14:1-7, 19-22.

Ndị nkwusa abụọ a dị ike agajeghị ikwe ka e menye ha ụjọ. Kama nke ahụ, ha gaghachiri iwuli ndị Kraịst ọhụrụ ahụ elu n’ebe ndị ha zutewororịị oké mmegide, ikekwe na-enyere ndị ikom ruru eru aka idu ndú n’ọgbakọ ọhụrụ ndị ahụ.

Okwu Ibi Úgwù

Ihe dị ka afọ 16 ka Pentikọst 33 O.A. gasịrị, Banabas so n’ihe omume mere ihe akụkọ banyere okwu ibi úgwù. “Mmadụ ụfọdụ wee si na Judia rịdata [Antiọk nke Siria] wee zie ụmụnna n’ime Kraịst ihe, sị, Ọ bụrụ na e bighị unu úgwù dị ka omenala nke Mosis nyere si dị, a pụghị ịzọpụta unu.” Banabas na Pọl maara site n’ahụmahụ na nke a abụghị eziokwu, ha rụkwara okwu ahụ ụka. Kama iji ikike ha mee ihe, ha matara na nke a bụ okwu e kwesịrị idozi maka ọdịmma nke òtù ụmụnna dum. Ya mere ha wegaara òtù na-achị isi nọ na Jerusalem okwu ahụ, bụ́ ebe ihe ndị ha kọrọ nyere aka idozi okwu ahụ. Ka nke ahụ gasịrị, Pọl na Banabas, bụ́ ndị a kọwara dị ka ndị a “hụrụ n’anya, ndị rarawooro ndụ ha nye n’ihi aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst,” so ná ndị e ziri ịga gwa ụmụnna nọ n’Antiọk mkpebi ahụ. Mgbe a gụrụ akwụkwọ ozi ahụ si n’aka òtù na-achị isi, e kwuokwa okwu dị iche iche, ọgbakọ ahụ ‘ṅụrịrị n’ihi nkasi obi dị ya,’ ‘e wee mee ka obi ha guzosie ike.’—Ọrụ 15:1, 2, 4, 25-32.—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

“Oké Iwe”

Mgbe e kwusịrị ihe ọma dị ukwuu banyere ya, anyị pụrụ iche na ọ dịghị mgbe anyị ga-eṅomili ihe nlereanya Banabas. Ma, “Nwa nke nkasi obi” ahụ bụ onye na-ezughị okè dị nnọọ ka anyị nile bụ. Ka ya na Pọl na-eme atụmatụ njem ozi ala ọzọ nke abụọ ileta ọgbakọ dị iche iche, esemokwu dapụtara. Banabas kpebisiri ike ịkpọrọ nwa nwanne nne ya bụ́ Jọn Mak, ma Pọl echeghị na o kwesịrị ekwesị, ebe Jọn Mak hapụburu ha na njem ozi ala ọzọ nke mbụ. “Oké iwe wee pụta n’etiti ha, nke mere ka ha kewaa otu onye n’ebe ibe ya nọ, Banabas wee kuru Mak nye onwe ya, wee baa n’ụgbọ jee Saịprọs,” ebe “Pọl họpụtara Saịlas, wee pụọ” jee n’ebe dị iche.—Ọrụ 15:36-40.

Lee ihe mwute ọ bụ! N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ahụ mere na-akọrọ anyị ihe ọzọ banyere ụdị onye Banabas bụ. “Ọ nọgidere na-abụ ihe ịja mma nye Banabas na ọ dị njikere ịnwale ihe ma tụkwasị Mak obi nke ugboro abụọ,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu. Dị ka onye edemede ahụ na-atụ aro ya, ọ pụrụ nnọọ ịbụwo na “nchekwube Banabas nwere n’ebe ọ nọ nyere aka iweghachite obi ike o nwere n’onwe ya ma bụrụ ihe kpaliri ya ịraraghachi onwe ya nye.” Dị ka ihe siri gaa, a nwapụtara nchekwube ahụ n’ụzọ zuru ezu, n’ihi na oge ruru mgbe ọbụna Pọl nakweere uru Mak bara n’ije ozi ndị Kraịst.—2 Timoti 4:11; tụlee Ndị Kọlọsi 4:10.

Ihe nlereanya Banabas pụrụ ịkpali anyị iwepụta ohere ige ntị, ịghọta, na ịgba ndị nwere nkụda mmụọ ume na inye aka n’ụzọ dị irè mgbe ọ bụla anyị hụrụ mkpa ya. Ihe ndekọ nke ịdị njikere ya iji ịdị nwayọọ na obi ike jeere ụmụnna ya ozi, nakwa ihe ndị magburu onwe ya nke a rụpụtara, bụ agbamume n’onwe ya. Lee aha ngọzi ọ bụ inwe ndị dị ka Banabas n’ọgbakọ anyị dị iche iche taa!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ịkpọ mmadụ “nwa nke” otu àgwà na-eme ka njimara dị ịrịba ama pụta ìhè. (Lee Deuterọnọmi 3:18, nkọwa ala ala peji NW) Na narị afọ mbụ, a na-ejikarị utu aha adọrọ uche gaa n’àgwà ndị mmadụ nwere. (Tụlee Mak 3:17.) Ọ bụ otu ụzọ ọha si amata mmadụ.

b N’ịtụle ihe ndị Iwu Mosis kwuworo, ụfọdụ ajụọla ụzọ Banabas, bụ́ onye Livaị, si nwee ala. (Ọnụ Ọgụgụ 18:20) Otú ọ dị, e kwesịrị ịrịba ama na o doghị anya ma ala ahụ ọ dị na Palestine ka ọ dị na Saịprọs. Ọzọ, ọ pụrụ ịbụ na nke a bụ nanị ala ili nke Banabas nwetaworo n’akụkụ Jerusalem. Ka o sina dị, Banabas nyere ala ya iji nyere ndị ọzọ aka.

[Foto dị na peeji nke 23]

Banabas “bụ ezi nwoke, jupụtakwa na Mmụọ Nsọ na okwukwe”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya