Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
◻ “OKÉ nsogbu” ahụ e wetara megide ọgbakọ ndị Kraịst nke oge gboo mere ihe ịchụsasị ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 8:1) Otú ọ dị, mkpagbu nke a arụpụtaghị ihe a tụrụ anya ya n’ihi na ndị ahụ a chụsasịrị “jegharịrị na-ezisa ozi ọma, bụ́ okwu Chineke.” (Ọrụ 8:4) Filip nọgidere na-ekwusa, “ìgwè mmadụ nile wee were otu obi na-aṅa ntị” n’ihe ọ na-ekwu. (Ọrụ 8:6) Dị ka mkpagbu na-arụpụtaghị ihe a tụrụ anya ya n’ime narị afọ mbụ, otú ahụ ka o meworo n’otu obodo nta dị n’ebe ugwu Thailand.
Otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nke Ndịàmà Jehova malitere ikwusa ozi ọma n’obodo nta nke a, ma ná mmalite, ndị obodo ahụ achọghi ige ntị. Otú ọ dị, mgbe ya na onye okwuchukwu bi n’ebe ahụ na-ekwurịta okwu, ndị mmadụ gbakọtara ige ntị. Ụfọdụ ndị ghọtara na Onyeàmà ahụ maara Bible nke ọma karịa onye okwuchukwu ha, ha wee malite iso onye ọsụ ụzọ ahụ na-amụ Bible ọ bụ ezie na ndị ọzọ nọ na-enye ha nsogbu. E gbusịrị ụfọdụ n’ime ọbọgwụ ha, e yiri ndụ onye ọsụ ụzọ ahụ egwu, e sukwara ụlọ nke otu onye nwere mmasi ọkụ. Nwoke ahụ sịrị: “Ha pụrụ isu ụlọ m ọkụ, ma ha apụghị isu obi m ọkụ.” Ndị ahụ ha na Onyeàmà ahụ na-amụ ihe na-eji ịnyịnya ígwè gbaa ogologo ụzọ iji jee nzukọ dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Anọ n’ime ha mere baptism, isii ndị ọzọ ka nọkwa soro ha na-abịa nzukọ dị iche iche.
Nkwụghachi Ụgwọ maka Ime Ihe n’Eziokwu
◻ Ụmụnna nọ na Zambia abụrụwo ndị a maara nke ọma n’ihi ime ihe n’eziokwụ, nke a ewetawokwara ha ngọzi, nyekwara ndị ọzọ aka ịmata eziokwu ahụ. Otu onye okenye ọgbakọ, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge nile, nọ n’otu ụgbọ ala bọọsụ na-aga njem, wee nụ ka otu Onyeàmà so ndị ọzọ nọ n’ime bọọsụ ahụ na-ekwurịta okwu banyere mbilite n’ọnwụ ahụ. Otu onye nọ na moto ahụ jụrụ nwanna nwanyị ahụ, sị: “N’ihi gịnị ka unu bụ Ndịàmà ji ekwu na ọ bụ nanị nke unu bụ ezi okpukpe dịnụ?” Nwanna nwoke ahụ sonyere ná mkparịta ụka ahụ wee gwa onye njem ahụ na Jehova ga-akwụghachi Ndịàmà ya ụgwọ n’ihi na ha na-akuzi eziokwu sitere na Bible.
Mgbe etiti abalị gafechara n’ogologo njem nke a, bọọsụ ahụ bịarutere n’ebe ndị nche nọ n’ụzọ. Mmiri na-ezosi nnọọ ike. Otu onye soja batara n’ime bọọsụ ahụ wee jụọ ma ò nwere onye ọ bụla bụ Onyeàmà Jehova n’ime ya. Ha dị mmadụ atọ. Mgbe ahụ ọ sịrị: “Ọ dị mma, Ndịàmà Jehova nọdụnụ ala, ndị ọzọ nile burunụ akpa unu pụta n’èzí.” Ndị ọzọ nile pụrụ n’èzí n’ime mmiri ozuzo ahụ, mgbe e nyochasịkwara ha, ha buuru ibu ha bataghachi, uwe ha dekwara mmiri.
Mgbe ọ bataghachiri n’ime bọọsu ahụ, onye soja ahụ kwuru, sị: “Ihe mere m ji hapụ Ndịàmà ahụ bụ na ha bụ ndị na-eme ihe n’eziokwu. Anyị enwewo ahụmahụ dị ukwuu, wee chọpụta na ọ bụ nanị ha bụ ndị na-eme ihe n’eziokwu; mgbe anyị jụrụ ha ihe dị n’ime akpa ha, ha na-agwa anyị eziokwu.” Ka bọọsụ ahụ kwọliri, nwanna nwoke ahụ jụrụ, sị: “Olee nke bụ ezi okpukpe?” Otu onye zara, sị: “Ọ bụ nke ahụ mmiri na-amaghị.”
Ee, ime ihe n’eziokwu na-enye aka ịmata ezi okpukpe ahụ, ọ na-enyekwa nkwụghachi ụgwọ!