Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ịkwụwa Aka Ọtọ Na-akwado Ozi Anyị
ỊKWỤWA aka ọtọ bụ isi ihe a chọrọ n’aka ndị Kraịst. Pọl onyeozi dere ná Ndị Hibru 13:18: “Anyị kwere na anyị nwere akọ na uche ọma, ebe anyị na-achọ ibi obi nke ọma n’ihe nile.” Anyị ịkwụwa aka ọtọ ‘na-achọ ozizi nke Onye Nzọpụta anyị Chineke mma n’ihe nile.’ (Taịtọs 2:10) Ịkwụwa aka ọtọ, nakwa nkwusa Alaeze, nke ndị Kraịst abụọ n’alaeze Tonga dị n’Ebe Ndịda nke Pacific na-agba àmà dị ike. Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Samoa na-akọ, sị:
“Ruo ọtụtụ afọ, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà gwara ndị bi n’ime obodo anọ dị n’agwaetiti ha okwu banyere Alaeze Chineke ma ghara ịrụpụta ihe ọ bụla a na-ahụ anya. E mesịa, mgbe di ya dara ọrịa, nke nwunye aghaghị ilekọta ugbo ha ma na-egbutu, na-echekpọkwa akụ oyibo, bụ́ nanị ụzọ ha si enweta ego. Mgbe oge ruru ka ndị ga-azụrụ ha nyochaa akụ oyibo ndị ahụ a mịkpọrọ amịkpọ, akpa onye ọzọ gwakọtara n’akpa ise ya. Ndị obodo ahụ gwara ya ka o debe akpa ọzọ ahụ ma lee ya anya dị ka ngọzi si n’aka Chineke. Otú ọ dị, nwanna nwanyị ahụ jụrụ, ọbụnakwa mgbe a kwụrụ ya ụgwọ maka akpa isii, ọ naara nanị ole ego ruuru ya. A hụtara ịkwụwa aka ọtọ ya.
“E mesịa, mgbe di ya ga-eme njem gaa n’agwaetiti ọzọ, onye nwe otu ụlọ ahịa gwara ya ka ọ zụtara ya ihe ụfọdụ. Onyeàmà ahụ mere dị ka a gwara ya ma weghachiri nwoke ahụ ego mafọdụrụ. O juru nwoke ahụ anya. Ọ sịrị na ọ bụ nke mbụ mmadụ na-eweghachi ego mafọdụrụ. Ndị ọ rịọworo ka ha zụta ihe ụfọdụ na-ewere ego mafọdụrụ mgbe nile. Mgbe ọzọ, mgbe Onyeàmà ahụ chọrọ ihe site n’ụlọ ahịa nwoke a, nwoke ahụ nyere ya ugodi ụzọ ụlọ ahịa ahụ, na-agwa ya ka o were ihe ọ chọrọ ma hapụ ego ya n’ụlọ ahịa ahụ. Ndị ọzọ nọ ebe ahụ jụrụ onye ahụ nwe ụlọ ahịa ihe mere ọ ga-eji nye Onyeàmà ahụ ugodi ọnụ ụzọ ụlọ ahịa ahụ ma ọ gaghị enye ha. Onye ahụ nwe ya kọwara na ọ gwụla Onyeàmà ahụ bụ onye ya pụrụ ịtụkwasị obi n’obodo nta ahụ.
“Ezi àgwà nke di na nwunye a ka ndị obodo nta a ji akọ akụkọ. E ji ịkwụwa aka ọtọ ha, nnọpụiche ha ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ịgba àmà ha banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke na-egosi ọdịiche dị n’etiti nkwenkwe nile nke ndị obodo ahụ na ozizi nile nke Bible, mara Ndịàmà. Ugbu a mgbe ajụjụ bilitere banyere Bible, ndị ahụ na-ejekwurukarị Ndịàmà maka azịza. Ọbụna na nke nwoke ebiliwo n’ụra n’abalị, gaa ná nzukọ obodo, wee zaa ajụjụ ndị biliteworo n’isiokwu Bible. Mgbe ọ na-aga ememe ili ozu n’obodo nta ahụ, a rịọwo ya ọtụtụ mgbe ka o gosi ihe Bible na-ekwu banyere ọnwụ, a nakwerewokwa ihe ndị o kwuru.”
Ya mere ịkwụwa aka ọtọ nke di na nwunye a bụ́ Ndịàmà na nkwusa Alaeze ha na-agba àmà dị mma n’agwaetiti a mara mma nke Ebe Ndịda Pacific. Ha nwere olileanya na ndị ọzọ ga-amụ Bible wee were nguzo ha n’akụkụ eziokwu. Ha mee otú ahụ, Jehova Chineke ga-agọzi ha n’ezie.—Jọn 8:32.