“Lee M; Ziga M”
DỊ KA WILFRED JOHN SI KỌỌ
Ndị agha Burma na-eche nche si akụkụ abụọ nke osimiri ahụ wakpo anyị. Ha bu égbè ndị a kwụnyere mma a na-akwụnye n’ọnụ égbè, bụ́ ndị ha tụdoro anyị dara mmiri na-eru ha n’úkwù gbaa anyị gburugburu n’okpuru àkwà mmiri dị n’okporo ụzọ awara awara ahụ.
EGWU tụrụ mụ na onye òtù m nke ukwuu. Gịnị na-eme? Ọ bụ ezie na anyị aghọtaghị asụsụ a na-asụ, ngwa ngwa anyị matara ihe na-emenụ—e ji anyị eji. A kpụụrụ anyị n’ajụghị ajụjụ ọ bụla ka anyị ma nanị ákwà nhicha mmiri n’ùkwù anyị gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị nso, ọfịsa na-asụ Bekee wee gbaa anyị ajụjụ.
Ọ bụ na 1941, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, e nyokwara anyị enyo ịbụ ndị na-agba mba ha mgba okpuru. Mgbe anyị kọwasịrị ọrụ nkwusa ndị Kraịst anyị n’ụzọ juru ọfịsa ahụ afọ, ọ gwara anyị na anyị nwere ihe ndabara ọma ịdị ndụ gabiga mwakpo ahụ. Ọ sịrị na a na-agbagbu ọtụtụ ndị a na-enyo enyo, ọ dịghịkwa ajụjụ a na-ajụ. Anyị kelere Jehova wee nara okwu ndụmọdụ ọfịsa ahụ ịhapụ ịkwụgharị n’àkwà mmiri ọ bụla n’ọdịnihu.
Olee otú m si banye n’ọnọdụ dị otú ahụ na Burma (Myanmar ugbu a)? Ka m kọwaa ma nye nkọwa ụfọdụ banyere nzụlite m.
Nhọrọ M Mere ná Mmalite Ndụ M
A mụrụ m na Wales na 1917, mgbe m gbakwara afọ isii mụ na ndị mụrụ m na nwanne m nwoke nke m tọrọ kwagara New Zealand, ebe m tolitere n’ugbo nna m ebe a na-emepụta mmiri ara ehi. Otu ụbọchị o kpolatara akwụkwọ ndị ọ zụtara n’ụlọ ahịa na-ere ihe ndị e jigoro mee ihe. Mbipụta abụọ nke Studies in the Scriptures, nke Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara, so na ha. Ndị a ghọrọ ihe onwunwe ndị nne m weere n’ihe dị oké ọnụ ahịa, dịkwa ka nne Timoti bụ Yunaịsi, ọ zụlitere n’ime m ọchịchọ itinye ntorobịa m n’ije ozi maka ọdịmma nile nke Alaeze Jehova.—2 Timoti 1:5.
Na 1937 nhọrọ abụọ chere m ihu: iweghara ugbo mmiri ara ehi nna m ma ọ bụ ịgwa Jehova dị ka onye amụma Chineke bụ Aịsaịa mere, “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) M ka na-eto eto, nwee ezi ahụ ike, gharakwa inwe oké ibu ọrụ. Edetụwo m ndụ ọrụ ugbo ire, ọ masịkwara m. N’aka nke ọzọ, enweghị m ahụmahụ ọ bụla dị ka onye ozi oge nile ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ. Olee nke m ga-ahọrọ—ịrụ ọrụ n’ugbo ahụ ka ọ bụ ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ?
Ndị ọkà okwu si n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova n’Australia bụ isi iyi nke agbamume. Ha letara ógbè anyị na New Zealand ma gbaa m ume iji oge újú nke ndụ m nke dị oké ọnụ ahịa jeere Chineke ozi. (Eklisiastis 12:1) M so ndị mụrụ m kwurịta okwu ahụ, ha kwenyekwara n’amamihe nke itinye uche Chineke n’ọnọdụ mbụ. M tụgharịkwara n’uche m okwu ndị ahụ Jisọs Kraịst kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:33.
Nhọrọ m edowo anya! Ebe ọ bụ na na mgbe ahụ e nweghị alaka ụlọ ọrụ ọ bụla nke Ndịàmà Jehova na New Zealand, a kpọrọ m òkù ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Australia nke dị na Sydney. Otú a, na 1937, m banyere n’ụgbọ mmiri ịga Australia iji bụrụ onye ozi oge nile nke Jehova Chineke.
‘Olee ọrụ a ga-ekenye m?’ ka m chere n’uche m. Ma, nke ahụ ọ̀ bụ nsogbu? N’ụzọ bụ isi, agwawo m Jehova, ‘Lee m. Jiri m mee ihe ebe ọ bụla ọ bụ uche gị.’ Ruo afọ abụọ m nyere aka n’ime ngwá egwú nke ndị Ndịàmà Jehova ji mee ihe n’oge ahụ iji kpọọrọ ndị nwe ụlọ okwu Bible a gụnyere n’ime efere egwú. Otú ọ dị, ọzụzụ bụ isi e nyere m n’alaka ụlọ ọrụ ahụ bụ maka ọrụ ebe ndọba akwụkwọ.
Ịga Singapore
Na 1939, e kenyere m ọrụ ịga Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa—ije ozi n’ebe ndọba akwụkwọ Society na Singapore. Ebe ndọba akwụkwọ ahụ jere ozi dị ka ebe bụ isi maka ịnata na ibupụ akwụkwọ site n’Australia, Britain, na United States gaa n’ọtụtụ mba n’Esia.
Singapore bụ obodo nwere ọtụtụ asụsụ ebe ọdịnala ndị Ọwụwa Anyanwụ na ndị Europe gwakọtara. Asụsụ Malay bụ asụsụ a na-ejikarị enwe nkwurịta okwu, ijikwa mee nkwusa site n’ọnụ ụzọ gaa n’ọnụ ụzọ, anyị bụ́ ndị bịara abịa aghaghị ịmụta ya. N’ọtụtụ asụsụ, anyị nwere ihe a na-akpọ kaadị ịgba àmà. Ndị a nwere okwu dị mkpirikpi nke ozi Alaeze ahụ nke e biri n’elu ha.
Iji malite, m buuru ihe e dere na kaadị ịgba àmà Malay ahụ n’isi wee jiri nwayọọ nwayọọ na-ewulite okwu n’asụsụ ahụ. Ma anyị na-ejikwa akwụkwọ Bible n’asụsụ ndị ọzọ. Nye ndị India, dị ka ihe atụ, anyị nwere akwụkwọ n’asụsụ Bengali, Gujarati, Hindi, Malayalam, Tamil, na Urdu. Izute ìgwè ndị na-asụ ọtụtụ asụsụ otú a bụ ahụmahụ dị ọhụrụ nye m.
M na-echeta nke ọma ọkwa na-atụ ụjọ na September 1939, mkpọsa nke agha na Europe. Anyị jụrụ, ‘Ọ̀ ga-amụba ma metụta Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa?’ O yiri m ka ọ bụ ihe na-ebute Amagedọn ụzọ—m chere na ọ bụ oge ya kpọmkwem! Afọ juru m na m na-eji oge ntorobịa m eme ihe n’ụzọ zuru ezu, kwesịkwa ekwesị.
Tinyere ọrụ m n’ebe ndọba akwụkwọ ahụ, m na-ekere òkè zuru ezu ná nzukọ nile nke ọgbakọ na ozi ubi. E duziri ọmụmụ Bible dị iche iche, ụfọdụ ndị zaghachikwara ma nakwere baptism ime mmiri. A kpọọrọ ha jee n’ụsọ osimiri dị nso wee mikpuo ha ná mmiri dị ṅara ṅara nke ọdụ ụgbọ mmiri Singapore. Ọbụna na anyị kpebiri inwe mgbakọ, jiri nwayọọ kpọọ ndị nwere mmasị òkù. Dị ka ihe ọṅụ nye anyị, ihe dị ka 25 mmadụ bịara n’ihe anyị chere mgbe ahụ ga-abụ mgbakọ anyị nke ikpeazụ tupu Amagedọn.
Agha ahụ gbochiri nke ukwuu iso alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Society kparịta. Ebe ndọba akwụkwọ anyị nke Singapore, dị ka ihe atụ, natara ihe ịrịba ama dị mkpirikpi na ndị ọsụ ụzọ atọ bụ́ ndị Germany ga-erute Singapore n’isi nso n’ụgbọ mmiri a na-enyeghị aha ya ka ha na-aga ebe e kenyere ha ọrụ nke a na-ekwughị. Izu ole na ole n’ihu ha rutere wee nọnyere anyị hour iri nke na-akpali akpali. Ọ bụ ezie na asụsụ bụ nsogbu, anyị nwere ike ịghọta na ebe ha na-aga e kenyere ha ọrụ bụ Shanghai.
Ọrụ E Kenyere M na Shanghai
Mgbe otu afọ gasịrị, e kenyere m ọrụ ịga Shanghai. E nyeghị m adres ụlọ, nanị nọmba igbe post ọfịs. Mgbe a gbasịrị m ajụjụ nke ukwuu na post ọfịs, m nwere ike iguzobe onye m bụ nke ọma ka e wee nye m adres ebe obibi Society. Otú ọ dị, onye China bi ebe ahụ gwara m na a kwagharịwo alaka ụlọ ọrụ ahụ, e nweghịkwa nkọwa ebe ha kwagara.
‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a?’ ka m chere n’echiche. M kpere ekpere maka nduzi n’ekwupụtaghị okwu. Ka m na-elelị anya elu m hụrụ ndị ikom atọ, ha katụ ndị ọzọ ogologo ma dịtụ iche n’ọdịdị ha. N’ezie ha yiri ndị Germany atọ ahụ kwụsịtụrụ na Singapore ruo hour ole na ole ahụ fefere ọsọ ọsọ. Ngwa ngwa, m chụsoro ha.
“Biko,” ka m ji nsụ kwuo n’oké mkpali. Ha kwụsịrị ma jiri iwe leruo m anya. “Singapore. Ndịàmà Jehova. Ùnu chetara m?” ka m jụrụ.
Mgbe minit ole na ole gasịrị, ha zaghachiri, sị: “Ja! Ja! Ja!” N’amaghị ama anyị makụrụ onwe anyị, anya mmiri nke ọṅụ jukwara m ihu. N’etiti ọtụtụ nde mmadụ, olee otú o si bụrụ na ndị ikom atọ ahụ ga-agafe ebe ahụ kpọmkwem n’oge ahụ? Nanị ihe m kwuru bụ, “Ekele dịrị gị, Jehova.” Ezinụlọ atọ ahụ bụ́ ndị China, ndị Germany atọ ahụ, na mụ onwe m bụ nanị Ndịàmà e nwere na Shanghai.
Hong Kong na E Mesịa Burma
Mgbe m jeworo ozi na Shanghai ruo ọnwa ole na ole, e kenyere m ọrụ na Hong Kong. Mgbe onye mụ na ya ga-arụkọ ọrụ ọsụ ụzọ nke ga-esite n’Australia na-abịaghị, m nọrọ nanị m, Onyeàmà e nwere nanị ya n’ógbè ahụ mba ọzọ na-achị. Ọzọ, m ghaghị ichetara onwe m na m gwawo Jehova sị, “Lee m; ziga m.”
Ọrụ m bụkarịrị n’ebe ndị China na-asụ Bekee nọ, ma m nwekwara ihe isi ike n’ịgafe ọnụ ụzọ àmà ndị e nwere n’ebe ha bi, ebe ọ bụ na ndị oje ozi na-elekọta ha na-asụ nanị asụsụ Chinese. Ya mere m mụrụ asụsụ Chinese n’olu abụọ a na-ejikarị eme ihe. Ọ dịrị irè! M ga-ejekwuru ndị nche ọnụ ụzọ ama, gosi kaadị ọrụ m, sụọ ntakịrị Chinese m maara, ọtụtụ mgbe a na-akpọbatakwa m n’ụlọ.
Otu oge mgbe m na-eleta otu ụlọ akwụkwọ, m gbasoro usoro nke a ná mgbalị ịgwa onye hedimasta okwu. Onye nkụzi nọ n’ọkwá dị ala zutere m n’ebe a na-echere ndị ọbịa. M soro ya gafee klasị ole na ole, m gosikwara ekele maka ezi àgwà ụmụaka ahụ, wee dị njikere ịbụ onye a kpọgaara hedimasta. Onye nkụzi ahụ kụrụ aka, meghee ụzọ, kwụzụga n’azụ, wee feere m aka ka m banye. Dị ka ihe ijuanya na-akpasu iwe nye m, o jiworo obi ọma duga m n’ụlọ mposi! O yiri ka a ghọtahiewo asụsụ Chinese m sụrụ, dị ka hedimasta ahụ mesịrị gwa m, e chewo na m bụ onye ọrụ na-enyocha ọwa mmiri okporo ígwè na usoro nkwafu mmiri ọjọọ.
Mgbe m rụsịworo ọrụ ọnwa anọ, ndị uwe ojii Hong Kong gwara m na a machibidowo ọrụ nkwusa anyị iwu nakwa na m ga-akwụsị ọrụ ma ọ bụ a gbaara m ụgbọ nwa mkpị. M họọrọ ụgbọ nwa mkpị ebe ọ bụ na ọnụ ụzọ ịnọgide na-eme nkwusa ka ghere oghe n’ebe ọzọ. Mgbe m nọ na Hong Kong, etinyewo m 462 akwụkwọ, enyewokwara m mmadụ abụọ ọzọ aka ikere òkè n’ozi ahụ.
Site Hong Kong, e kenyere m ọrụ na Burma. N’ebe ahụ m rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ ma nye aka n’ọrụ ebe ndọba akwụkwọ dị na Rangoon (Yangon ugbu a). Otu n’ime ahụmahụ ndị kasị adọrọ mmasị bụ nke ime nkwusa n’obodo ukwu na obodo nta ndị dịsasịrị n’ogologo ụzọ bụ isi si Rangoon gaa Mandalay ma gabigakwa ruo obodo dị n’ókèala China bụ́ Lashio. Mụ na onye ọsụ ụzọ mụ na ya na-arụkọ ọrụ tinyekarịrị uche n’ebe ndị na-asụ Bekee nọ, na-anata ọtụtụ narị ụtụ maka magazin Consolation (nke bụ Awake! [Teta!] ugbu a). Dị ka ihe ndabara, ụzọ ámá nke a bụ isi si Rangoon gaa Mandalay gaje ịbụ nke a maara dị ka Burma Road, ụzọ e si ebuga ihe agha dị iche iche nke America na China.
Igwuru ájá uzuzu na-eru n’ikiri ụkwụ gabiga na-eme ka anyị chọọ ịsa nnọọ ahụ. Nke a dubara n’ihe ahụ merenụ nke a kọrọ banyere ya ná mmalite, nke ịbụ ndị e ji eji mgbe anyị na-asa ahụ n’otu osimiri n’okpuru àkwà mmiri. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, agha a na-alụ na ọrịa manyere anyị ịlaghachi Rangoon. M nwere ike ịnọgide na Burma ruo 1943, mgbe agha ahụ e mere ka o kporokwuo ọkụ manyere m ịlaghachi Australia.
Laghachi Azụ n’Australia
Ka ọ dị mgbe ahụ, a machibidowo ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’Australia. Otú ọ dị, e wepụrụ mmachibido iwu ahụ ngwa ngwa, mgbe oge na-agakwa, a kpọrọ m òkù ịbịa rụọ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ. E mesịa, na 1947, m lụrụ Betty Moss, onye nọworo na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Society n’Australia. Nne na nna Betty bụ ndị ọsụ ụzọ, ha gbakwara ya na nwanne ya nwoke bụ Bill ume ime ọrụ ọsụ ụzọ ọrụ ha ga-arụ ná ndụ. Betty malitere ọrụ ọsụ ụzọ n’ụbọchị ọ gụchara akwụkwọ, bụ mgbe ọ gbara afọ 14. Echere m na anyị abụọ ga-eme nke ọma, ebe ya onwe ya kwa gwaworo Jehova n’ụzọ bụ isi, “Lee m; ziga m.”
Mgbe anyị lụworo di na nwunye ruo otu afọ, a kpọrọ m òkù ịbanye ọrụ sekit, na-eleta ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Ịrụ ọrụ n’obodo ndị dịpụrụ adịpụ nke Australia bụ nnọọ ihe ịma aka. Oké mmiri ozuzo na-eweta oké idei mmiri na-ewetakarị nsogbu n’ime njem, karịsịa n’ụzọ ụrọ ụrọ ndị na-amị amị. Ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ n’oge okpomọkụ na-eru 110 degree Fahrenheit n’ebe ndo dị. Ebe anyị bi n’ụlọ ntu e ji ákwà kpuchite, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ n’oge ahụ adịghị ekwe odidi, oge oyi na-atụbigakwa oyi ókè.
Ọ bụ ihe ọṅụ ije ozi dị ka onye nlekọta distrikti mgbe e nwere nanị distrikti abụọ n’Australia. Donald MacLean lekọtara otu distrikti, m lekọtakwa nke ọzọ. E mesịa anyị agbanwerịta distrikti. Ọ bụ ihe na-akpali akpali ịgụ banyere ọgbakọ ndị dị ugbu a n’ebe ndị anyị jere ozi na mbụ. Mkpụrụ nke eziokwu Bible epuwo nnọọ ma mịa mkpụrụ!
Laghachi n’Ebe Ihe Nile Malitere
Na 1961, enwere m ihe ùgwù nke ịga klasị mbụ nke ụlọ akwụkwọ Gilead nke ndị ozi ala ọzọ mgbe e bufesịrị ya na Brooklyn, New York. A kpọwo m òkù n’oge ndị ọzọ gara aga ma anaraghị m ha n’ihi nsogbu ahụ ike. Mgbe ọzụzụ ahụ were ọnwa iri gasịrị, a kpọrọ m òkù ịnara New Zealand dị ka ebe e kenyere m ọrụ.
Ya mere eri January 1962, mụ na Betty anọwo n’ebe a na New Zealand, otu n’ime ala ndị dị n’okpuru. A na-ezokarị aka n’ebe ọ dị dị ka otu n’ime ebe makarịsịrị mma na Pacific. N’echiche nke ọchịchị Chineke, ọ bụ ihe ọṅụ ije ozi ma n’ọrụ sekit ma n’ọrụ distrikti. N’afọ 14 gara aga, kemgbe April 1979, anyị anọwo na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ New Zealand.
Mụ na Betty eruwo afọ ndụ nke 70 ugbu a, n’etiti anyị abụọ anyị etinyewo 116 afọ n’ije ozi Alaeze oge nile n’akwụsịghị akwụsị. Betty malitere ọrụ ọsụ ụzọ na January 1933, m malitekwara n’April 1937. Anyị enwewo ọtụtụ ihe ọṅụ ka anyị kiriri ka ụmụ anyị na ụmụ ụmụ anyị n’ime mmụọ na-eme ihe anyị mere mgbe anyị ka na-eto eto, nke bụ ịnakwere ndụmọdụ nke Eklisiastis 12:1: “Chetakwa Onye Keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.”
Lee ihe ùgwù ọ bụworo itinye nnọọ ndụ anyị dum n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke na ime ndị na-eso ụzọ, dị ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nyere n’iwu! (Matiu 24:14; 28:19, 20) Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu na anyị nakweere òkù Chineke kpọrọ dị ka onye amụma bụ Aịsaịa mere ogologo oge gara aga sị, “Lee m; ziga m.”