Agha nke Jeriko—Akụkọ Ifo ka ọ̀ bụ Ihe Mere Eme?
RUO ọtụtụ iri afọ, ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala anwawo itinye ihe ịrụ ụka n’akụkọ Bible ahụ banyere Joshua na agha nke Jeriko ahụ. Dị ka Bible si kwuo, Joshua na ndị agha Israel zọrọ ije gburugburu Jeriko ruo ụbọchị asaa, ruo mgbe Chineke mere ka oké mgbidi nile nke obodo ahụ daa. Nke a mere ka ndị Israel nwee ike ịbanye wee ‘suo obodo ahụ na ihe nile dị n’ime ya ọkụ.’—Joshua 6:1-24.
Ma ọtụtụ ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala, n’ịbụ ndị nchọpụta a na-akwanyere oké ùgwù nke Kathleen Kenyon mere n’afọ ndị 1950 metụtara, kweere ọbụna na Jeriko adịghị adị n’oge mbuso agha ndị Israel ahụ. Ee, ha kwuru na e bibiworị obodo ahụ ihe karịrị otu narị afọ tupu mgbe ahụ! Otú a, a na-ekwu na ihe ndekọ Bible ahụ banyere Joshua na ndị Israel abụghị eziokwu. Ma, n’oge na-adịghị anya gara aga, Dr. Bryant G. Wood, bụ́ onyeọkà mmụta ihe mgbe ochie ndị e gwupụtara n’ala, onye nọ na University of Toronto, Canada, elebaghachiwo anya n’ihe àmà e nwetara site na Jeriko. Dị ka akwụkwọ akụkọ The New York Times si kọọ, o kwubiwo na Dr. Kenyon “lere anya inweta ụdị ihe a kpụrụ akpụ ndị na-ekwesịghị ịdị n’ebe ahụ, na n’ebe ndị ha na-ekwesịghịkwa ịdị,” na ihe àmà e nwere nwekwara “nkwekọrịta dị ukwuu” ya na Bible.
Dr. Wood kpọtụrụ uche n’otu ogidi ntụ́ dị amaụkwụ atọ [1 mita] nke ibé ụrọ a kpụrụ akpụ jupụtara na ya, iberibe brick ndị si ná mgbidi nke dara ada, na ógwè osisi dị iche iche, ndị na-ejicha oji dị ka à ga-asị na ha sitere n’ọkụ nke gbazuru obodo ahụ dum. A chọpụtawo oge iberibe ụrọ ndị ahụ sitere na ya (site n’usoro nchọpụta oge ndị e nwere ugbu a, bụ́ ndị e kwenyere na ha ezichaghị ezi) ịbụ 1410 tupu Oge Anyị, tinye ma ọ bụkwanụ wepụ 40 afọ site na nke a—bụ́ nke na-adịghị nnọọ anya site na 1473 T.O.A., bụ́ afọ a lụrụ agha Jeriko ahụ dị ka ihe ndekọ Bible si dị.
Ndị na-egwu ala iji chọpụta ihe mgbe ochie achọpụtawo na ụlọ ndị dị na Jeriko nwere nnọọ nkwakọba hiri nne nke mkpụrụ e wetara n’ubi. Nke a bụ ihe na-akpali mmasị, ebe ọ bụ na Bible na-egosi na Jeriko dara n’oge na-adịghị anya mgbe oge owuwe ihe ubi gasịrị, a nọchibidoghịkwa ya ruo ogologo oge iji kpata ụnwụ nri. (Joshua 3:14-16) Ihe abụọ ndị a bụcha ezi ihe mere ọ ga-eji bụrụ na mkpụrụ e wetara n’ubi jupụtara n’ụlọ ndị ahụ mgbe e bibiri obodo ahụ.
Ndị ọkà mmụta sayensị na-alakarị azụ mgbe a bịara n’ịnakwere izi ezi nke Bible. Ya mere, akwụkwọ akụkọ Times ahụ hotara okwu otu onyeọkà mmụta a ma ama kwuru iji mee nzaghachi banyere nchọpụta ndị Wood mere, na-asị: “Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na ihe dị ukwuu n’ihe ọmụma a na-achọta na Bible nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke eziokwu n’ime ya.” Ma, ka nchọpụta ọkà mmụta sayensị na ọkà igwupụta ihe mgbe ochie ndị e liri n’ala na-akwado ọtụtụ ihe ndekọ Akwụkwọ nsọ ndị ọzọ, ọ na-apụta ìhè nye ndị obi ha ghere oghe na Bible abụghị nchịkọta nke akụkọ ụgha dị iche iche, ndị na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke eziokwu site n’oge ruo n’oge. Dị ka Bible n’onwe ya kwuru: “Chineke bụ onye eziokwu, ma mmadụ nile n’otu n’otu bụ ndị ụgha.”—Ndị Rom 3:4.
Ọ bụ ezie na nkọwa nke ihe ndị e gwupụtara n’ala Jeriko bụ ihe na-akpali mmasị, ezi ndị Kraịst ‘na-ejegharị n’okwukwe, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ.’ (2 Ndị Kọrint 5:7) Okwukwe ha adabereghị n’ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala. Ma è nwere ihe àmà nke ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala ma ọ bụ na e nweghị ya, Bible anọgidewo na-abụ ebe a pụrụ ịdabere na ya maka inweta ihe ọmụma banyere mgbe gara aga, oge dị ugbu a, nakwa ọdịnihu.—Abụ Ọma 119:105; 2 Pita 1: 19-21.
[Foto dị na peeji nke 7]
Mkpọmkpọ ebe nke Jeriko, ebe Jehova nyere ndị Israel mmeri
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.