Ile Ndị Ọbịa Anya Nke Ọma Ewetara Malta Ngọzi
MALTA nabatara Pọl onyeozi nke ọma oge o rutere n’elu ala mgbe ụgbọ mmiri ọ nọ na ya kpuru n’ime narị afọ mbụ O.A. Ndị bi n’agwaetiti ahụ nabatara ya na ndị njem ibe ya nke ọma ‘n’ụzọ enyemaka.’ N’eziokwu, ndị ahụ bi na Malta gosiri ndị njem ahụ ‘obi ọma a na-ahụtụbeghị mbụ.’—Ọrụ 28:1, 2.
Mgbe e mesịrị, onyeisi agwaetiti ahụ, bụ́ Pọbliọs, nabatara Pọl na ndị ya na ha so nke ọma ‘werekwa obi ọma lee ha ọbịa ụbọchị atọ.’ Mgbe akụkọ gbasazuru ebe nile na onyeozi ahụ agwọwo nna Pọbliọs ọrịa ahụ ọkụ na ọnyụnyụ ọbara, “ndị fọdụrụ n’agwaetiti ahụ ndị na-arịa nrịarịa wee bịakwute ya, e wee mee ka ahụ ha dị ike.” (Ọrụ 28:7-9) Ma Pọl mere ihe karịrị nke ahụ. Ọ kụnyere mkpụrụ nke eziokwu n’ime obi nke ndị ahụ, nke a rụpụtakwara ọtụtụ ngọzi nye ndị a na-ele ọbịa anya nke ọma ndị bi n’agwaetiti ahụ. Taa, otu ihe ahụ na-emekwa na Malta. Bịa ka ị hụrụ otú nke ahụ si na-eme.
Ndị Ọbịa Eweta Ozi Ọma
Ọ bụrụ na e si n’elu lee ya anya, Malta ahụ nke anyanwụ na-achakwasị na ya na-egbukepụ egbukepụ dị ka ọla nke e debere n’etiti osimiri Mediterranean ahụ na-acha anụnụ anụnụ. Mgbe a na-erute Ọdụ Ụgbọ Elu nke Luga, onye ọbịa na-ahụ ala nke anyanwụ na-awakwasị, nke yiri ka o nweghị ihe ọkụkụ dị ukwuu na ya. Mgbe ọ rịturu n’ala, ọ na-achọpụta na agwaetiti nke a dị maịlụ asaa n’ogologo, dịkwa maịlụ iri n’uhie [11 x 16 kilomita], nwere ihe dị ka 347,000 ndị bi na ya. Elu ụlọ ndị e wuliri elu na ogologo ihe nguzobe dị iche iche ndị dị n’ọtụtụ chọọchị na katidral ndị dị na Malta na-ekpughe akụkọ ya n’ihe banyere okpukpe. Ma n’ime narị afọ nke iri abụọ nke a, olee otú ndị Malta siworo rite uru site n’ọbịbịa nke Ndịàmà Jehova?
Otu onye nlekọta na-ejegharj ejegharị aha ya bụ David bịara n’ụlọ Juliana wee zute nnabata dị ngwa nke ozi Alaeze ahụ. Juliana kọrọ, sị, “Ntinye aka chọọchị na-etinye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị wutere m nke ukwuu, m wee gbalịa ịchọta n’ime Bible ihe bụ eziokwu banyere ọchịchị nke Chineke. Ma ka m na-agụ ya, e nwere ihe ndị m na-apụghị ighọta ozugbo. Cheedị echiche ụdị mkpali m ga-enweworị mgbe onye nke a bịara n’ụlọ m jụrụ m ma m̀ maara ihe Alaeze Chineke bụ! Ozugbo ahụ, arịọrọ m ya ka o gosi m azịza ya n’ime Bible ndị Katọlik nke m. O mere otú ahụ. N’ụbọchị ahụ ka m maara na achọtawo m eziokwu ahụ.”
Otu onye nkwusa bụ onye ebe ahụ mere ndokwa iduziri Juliana ọmụmụ Bible. Mgbe David bịaghachiri na Malta n’ọnwa isii ọzọ, lee nnọọ ihe ịtụnanya ọ bụụrụ ya ịhụ ka Juliana nabatara ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze! N’oge na-adịghị anya, ọ dị njikere ịbụ onye nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ.
Ozizi chọọchị agbagwojuwokwa di Juliana, bụ́ Francis, anya. Mgbe o jere ileta Juliana n’otu oge mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, ọ hụrụ ka ọ nọ na-ege ntị n’okwu ihu ọha ndị dabeere na Bible, bụ́ ndị e kwuru n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe ọ nụrụ otu okwu e kwuru n’isiokwu metụtara ezinụlọ, Francis rịbara ama otú ndụmọdụ Bible ahụ si bụrụ ihe ezi uche dị na ya, n’ihi nke a, o kpebikwara ịmalite ije nzukọ ndị Kraịst dị iche iche. N’oge na-adịghị anya, ọ matara ihe banyere otu nsogbu nke ọ na-aghaghị idozi? Gịnị ka ọ bụ?
Ruo ihe dị ka 20 afọ, Francis anọwo na-arụ ọrụ dị ka onye na-anakọta ego n’ụlọ ebe a na-agba chaa chaa. Ọ ghọtara ugbu a na ọrụ ndị metụtara ịgba chaa chaa ekwekọghị n’ụkpụrụ ndị Kraịst ndị megidere inwe oke ọchịchọ na inwe anyaukwu. (Ndị Rom 13: 9, 10; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Francis kwupụtara, sị, “Ọ bụ ezie na ná mmalite, enwechaghị m okwukwe nke dị mkpa iji gbanwee ọrụ m, ekpere m ekpere maka enyemaka Jehova. N’ikpeazụ, achọtara m ọrụ ọzọ nke na-eme ka m nwee ike ilekọta nwunye m na nwa m nwoke, bụ́ Sandro.” Taa, Francis na-eje ozi dị ka okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ.
Nkasi Obi Site n’Akwụkwọ Nsọ
Rose na George anọwo n’alụmdi na nwunye obi ụtọ ruo afọ isii mgbe nke nwoke ahụ nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ. Nwanyị ahụ enwetaghị nkasi obi ọ bụla n’okwu onye ụkọchukwu ahụ nke bụ na Chineke akpọrọwo George n’ihi na Chineke na-ekwo ekworo n’ihi ịhụnanya nwanyị ahụ hụrụ di ya. Rose dara mbà n’obi nke ukwuu nke na o chere echiche banyere igbusị ụmụ ha atọ, wee gbuzie onwe ya.
Ma lee nnọọ oké mgbanwe Rose mere mgbe otu onye agbata obi ya bụ Onyeàmà aha ya bụ Helen malitere iduziri ya ọmụmụ Bible! N’oge na-adịghị anya, Rose nwere nkasi obi site n’ozizi Akwụkwọ nsọ ahụ nke mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) N’otu mgbe ahụ, Peter, bụ́ onye nlekọta ọzọ na-ejegharị ejegharị, nyekwara ya agbamume. O ritere uru nke ukwuu site n’okwu ya ndị metụtara mbilite n’ọnwụ. N’ịbụ onye olileanya nke a kpaliri. Rose sonyeere Helen n’ịgba àmà ihu ọha, ha abụọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ ndị nkwusa Alaeze oge nile.
Agbamume Iji Na-anụ Ọkụ n’Obi
Joe si n’ezinụlọ buru ibu, n’ihi na o nwere ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị iri na abụọ. N’ịbụ onye onye nlekọta na-ejegharị ejegharị gbara ume, o ji ịnụ ọkụ n’obi gbaara ọtụtụ ndị ikwu ya àmà. Ọ sịrị, “Ná mmalite, ezinụlọ m maara na ezi uche dị n’ihe m na-akọwara ha site na Bible. Ma mgbe ha hụrụ na mmasị m nwere n’ịghọ Onyeàmà na-abawanye ụba, ha gbanwere uche ha, ha nile wee malite imegide m—karịsịa nna m.” Omume ha ọ̀ bịanyụrụ ịnụ ọkụ n’obi Joe?
Ọ dịghị ma ọlị! Dị ka ihe atụ, mgbe nwa nke otu n’ime ụmụnne ya ndị nwanyị na-arịa ọrịa wee chọọ ịnwụ, Joe gbaara nwanne ya nwanyị ahụ àmà, na-agwa ya okwu banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. Ugbu a, nwanne ya nwanyị ahụ bụ Onyeàmà Jehova nke meworo baptism. Ọzọ, otu n’ime ụmụnne Joe ndị nwoke na ezinụlọ ya gosiri mmasị n’eziokwu ahụ. Mgbe ahụ, nwanne ya nwoke nke tọsịrị ha nile na ezinụlọ ya weere ọnọdụ ha n’akụkụ Alaeze Chineke. Ka ọ dị ugbu a, iwe nna Joe na-ewe na-arịwanye elu. Mgbe nwanne nwanyị Joe nke kasị obere malitekwara ịmụ Bible, nna ha chụpụrụ Joe n’ụlọ. N’alaghị azụ, Joe jiri ohere ọ bụla o nwere mee ihe ije leta ndị ikwu ya, na-ekwukwa okwu banyere ozi nke Bible. Ma nna ya ji iwe meghachi omume, wee si: “Jee ka gị na onye ụkọchukwu kwurịta okwu. Ọ maara Bible nke oma!” Joe kwuru na ọ ga-amasị ya ime otú ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ga-eso ya jee. Olee otú njem nleta ahụ si gaa?
Joe na-akọ, sị, “Anyị mere ndokwa ụbọchị na oge anyị ga-eje, ma onye ụkọchukwu ahụ chọrọ ịmata isiokwu nke ọ ga-akwadebe, na-akọwa na ebe ọ bụ na ya hapụrụ ụlọ akwụkwọ ọzụzụ ndị ụkọchukwu afọ asaa gara aga, na ọ ga-adị ya mkpa ime nnyocha ụfọdụ. . . . Ma mgbe otu izu gasịrị, otu ọnwa, ọbụna ọnwa abụọ, onye ụkọchukwu ahụ agwabeghịkwa anyị mgbe anyị ga-abịa. Mgbe nna m hụtara nke a, ọ gbanwere uche ya banyere chọọchị ahụ ma jiri nke nta nke nta ghọta na ihe m mụtaworo site na Bible bụ eziokwu.” Nna Joe mesirị nara eziokwu ahụ, na-eme ka o ruo 29, bụ́ ngụkọta nke ndị ezinụlọ ya ndị na-ekere okè n’ozi Jehova.
Ndụmọdụ nke Na-enye Aka Eweta Ngọzi
N’ikwusi okwu ike banyere onye nlekọta ọzọ na-ejegharị ejegharị, otu onye ọsụ ụzọ lụworo nwunye nke aha ya bụ Ignatio na-akọwa, sị: “Paul na nwunye ya bịara nọnyere anyị. Ha nyeere anyị abụọ aka ma ná mmekọrịta alụmdi na nwunye anyị ma n’ozi ubi. Mgbe nile, ọ na-emesi mkpa ikwusa ozi ọma dị ike.”
Ignatio na-echeta ihe mere mgbe Paul sooro ndị okenye ọgbakọ na ndị ohu na-eje ozi nwee nzukọ na mgbe ikpeazụ ọ bịara ileta ha. Ignatio kọrọ, sị, “Mgbe m kwuru na agaje m ịhapụ ije ozi ọma n’ụtụtụ ahụ iji wee kwadebe ihe omume m nwere ná nzukọ, Paul kwuru na ya ga-apụ jee ozi ubi dị ka e si mee ndokwa ya ọbụna ma a si na m pụghị iso ya jee. Mgbe o kwuru nke ahụ, ekpebiri m ijekwa. Lee nnọọ ka Jehova si gọzie mkpebi m! N’ụtụtụ ahụ, amalitere m otu ọmụmụ Bible, sitekwa na ya, e nwere mmadụ isii nọ n’eziokwu ugbu a.”—Tụlee 3 Jọn 4.
Mgbarịta Ume
Mgbe ọ bụla onye okenye na-ejegharị ejegharị bịara ileta Ndịàmà bi na Malta, ha na-anabata ya nke ọma, ọ na-agụsikwa ha agụụ ike irite uru site n’okwu agbamume na ndụmọdụ ya. (Tụlee 3 Jọn 5-8.) N’ihi nke a, ọtụtụ ndị Malta na-eweresi ọnọdụ ha ike n’akụkụ Jehova Chineke na Alaeze ya. N’ọgwụgwụ afọ ije ozi 1989, 389 n’ime ndị agwaetiti nke a na-ele ọbịa anya nke oma emewo otú ahụ. N’ịbụ ndị a haziri ugbu a gaa n’ọgbakọ ise ndị na-enwe ọganihu, (anọ dị na Malta, otu dịkwa n’agwaetiti dị nso nke Gozo), ha na-eji anya ike na-ekwusa ozi ọma ahụ.
Ndị nlekọta nile na-ejegharị ejegharị ndị e zijeworo Malta n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga enwewo mmetụta yiri nke Pọl, onye gwara ndị Kraịst bụ ndị Rom, sị: “Ịhụ unu anya na-agụsi m ike, ka m wee mee ka unu keta onyinye amara ụfọdụ nke mmụọ nsọ, ka e wee mee ka unu guzosie ike.” N’ezie nleta ba arụpụtawo ‘mgbarịta ume.’ (Ndị Rom 1: 11, 12) Ọzọkwa, ọrụ nkwusa Alaeze nke Ndịàmà Jehova na-ewetara ndị Malta ahụ na-ele ndị ọbịa anya nke ọma ngọzi ime mmụọ bara ụba.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
GOZO
COMINO
MALTA
Valletta
Mediterranean Sea
8 km
5 mi