Ọ̀ Dị Anyị Mkpa n’Ezie Inweta Ndị Mbụ Ahụ?
IHE dị ka 3,500 afọ gara aga, otu agadi nwoke bi n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ mere ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme nke ụwa ruo n’oge ya. Ihe odide ahụ, nke mesịrị mejupụta akwụkwọ ise dị ogologo, aghaghị ịbụworị ihe were oké mgbalị. Nwoke ahụ agbawo ihe karịrị 80 afọ mgbe ọ malitere ime ihe ndekọ ya. Ma ya ma mba o si na ya adịghị nke bi n’otu ebe kama ha na-awagharị site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ n’ime Ọzara Saịnaị. Otú ọ dị, ihe agadi nwoke ahụ dere mesịrị ghọọ akụkụ nke ihe odide kasị mkpa e nweworo n’ụwa.
Nwoke ahụ bụ Moses, onye Chineke nyere ihe ùgwù nke iduru mba Israel pụọ n’ịbụ ohu n’ala Ijipt. Taa, a maara akwụkwọ ise ahụ o dere dị ka Pentateuch, bụ́ akụkụ mbụ nke Bible Nsọ. Mmụọ nsọ ma ọ bụ ike ọrụ nke Chineke duziri Moses. Ya mere, ọbụna taa, anyị pụrụ inweta abamuru onwe onye dị ukwuu site n’ịgụ ihe odide ya. Ma mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ajụ, sị: ‘Ànyị pụrụ inwe obi ike n’ezie site n’okwu Moses na nke ndị ọzọ so dee Bible? Ànyị nwere ihe odide ndị mbụ ha dere n’onwe ha? Ma ọ bụghị otú ahụ, gịnị mere ha? Oleekwa otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ihe ndị dị n’ime Bible bụ n’ezie ihe mbụ ndị dere ha dere?’
Ihe Ndị E Ji Dee Ha
E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na ihe ndị dị n’ime Bible agbanwebeghị kemgbe e dere ha nke mbụ. Ọ bụ eziokwu na anyị enweghị ihe odide mbụ nke ndị ahụ so dee Bible. Ma anyị ekwesịghị nnọọ ịtụ anya na anyị ga-enwe ihe odide ndị mbụ ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi ụdị ihe ndị e ji dee ha, otu omenala oge ochie nke ndị Juu, na akụkọ ihe mere eme nke oge ndị dịworo eri mgbe e dere ha.
Nke mbụ, biko tụlee ihe banyere ihe ndị e ji dee ha. E nwere ihe ụfọdụ ka dịnụ, bụ́ ndị e dere n’oge a na-achịkọta akwụkwọ dị iche iche nke Bible. Ma ihe ka ọtụtụ ná ndị a bụ ndị e dere n’iberibe ụrọ na nkume, bụ́ ndị pụrụ ịdịru ogologo oge. Otú ọ dị, o yiri ka ihe ndị mbụ e ji dee Bible bụ ihe ndị pụrụ imebi ngwa ngwa karị. Dị ka ihe atụ, Eze Jehoiakim suru ụfọdụ n’ihe ndị onye ahụ so dee Bible, bụ́ Jeremaịa dere ọkụ. (Jeremaịa 36:21-31) Ọ garaghị adịworị mfe ibibi iberibe nkume ma ọ bụ ụrọ n’ụzọ dị otú ahụ.
Ya mere, olee ụdị ihe e ji ede ihe ndị dere Bible ji mee ihe? Ọ dị mma, “[E ziri] Moses ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt,” ihe a kasịkwa jiri na-ede ihe n’Ijipt bụ akwụkwọ papyrus (Ọrụ 7:22) N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na Moses ji ihe nke a na-emebi ngwa ngwa wee dee ihe. Ihe ọzọ a na-ejikwa ede ihe n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ bụ akpụkpọ anụ—leather ma ọ bụ vellum. Ma eleghị anya, Jeremaịa ji leather dee ihe. Ma leather ma papyrus ga-ereworị ọkụ mgbe Eze Jehoiakim tụnyere akwụkwọ mpịakọta Jeremaịa n’ọkụ.
N’eziokwu, n’Ijipt ebe e nwere okpomọkụ, ọtụtụ ihe odide ndị e ji papyrus dee anọwo ọtụtụ puku afọ. Ma nke ahụ bụ ihe pụrụ iche. Dị ka ọ na-adịkarị, ma papyrus ma leather na-emebisị ngwa ngwa. Onyeọkà mmụta bụ Oscar Paret kwuru, sị: “Ụdị ihe abụọ ndị a e ji ede ihe nọ n’otu ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ize ndụ site ná mmiri dị n’ikuku, site n’ịma èbù, sitekwa n’ụdị ikpuru dị iche iche. Anyị maara site n’ahụmahụ anyị na-enwe kwa ụbọcbị otú ọ na-esi adị mfe akwụkwọ, na ọbụna akpụkpọ anụ siri ike imebisị mgbe ọ dị ebe ikuku na-efesa ya ma ọ bụ n’ime ụlọ nke na-eme mmiri mmiri.”
N’Israel oge ochie, bụ́ ebe a nọ dee ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ Bible ndị ahụ, ọnọdụ ihu eluigwe adịchaghị mma maka ichebe ihe odide ochie. N’ihi ya, ma eleghị anya, ihe ka ọtụtụ n’ihe odide ndị mbụ nke Bible ga-emebisịworị ogologo oge gara aga. Ọbụna ma a sị na ha emebighị, e nwere otu omenala oge ochie nke ndị Juu nke ga-emeworị ka ọ bụrụ ihe siri ike ha ịdịgide ruo oge anyị a. Gịnị bụ omenala ahụ?
Ili Ihe Odide n’Ala
Na 1896, otu onyeọkà mmụta nke na-eme mwagharị n’ime otu ụlọ genizah nke dị na Cairo chọpụtara 90,000 ihe odide oge ochie ndị wetara oké mgbanwe n’ihe ọmụmụ nke akụkọ ihe mere eme nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Gịnị bụ genizah? Gịnịkwa ka nke a nwere ime n’ihe banyere ihe odide ndị mbụ nke Bible?
Genizah bụ otu ọnụ ụlọ ebe ndị Juu nke oge gboo na-edebe ihe odide ndị maliteworo ịdọkasị n’ihi ijikarị ha eme ihe. Onyeọkà mmụta bụ Paul E. Kable dere, sị: “Ndị Juu na-edebebu ụdị ihe nile e dere ede na ndị e biri ebi n’ime ọnụ ụlọ ndị dị otú ahụ, bú ndị na-adịkarị n’ime ma ọ bụ n’ebe dị nso n’ụlọ nzukọ ha; e bughị n’uche idebe ha ebe ahụ dị ka à ga-asị na e debere ha n’ebe ndebe ihe ndekọ mgbe ochie, kama ha ga-adịgide n’ebe ahụ n’enweghị onye bitụrụ ha aka ruo ogologo oge ụfọdụ. Ndị Juu na-atụ egwu ka a ghara imerụ ihe odide ndị dị otú ahụ, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nwere aha Chineke n’ime ha, site n’iji ha eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Ya mere ihe ndị dị otú ahụ e dere ede—nakwa mgbe e mesịrị ndị e bikwara ebi—bụ ndị a na-ewere site n’oge ruo n’oge jee n’ala e doro nsọ ma lie ha; ihe ndị ahụ na-esi otú ahụ laa n’iyi. Ọ bụ site n’ihe ndabara efu ka e ji chefuo Geniza ahụ dị na Cairo, e wee gharakwa ime ihe ndị dị n’ime ya otu ihe ahụ e mere ihe ndị dị na Geniza ndị ọzọ.”—The Cairo Geniza, peji 4.
Gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị ihe odide mbụ nke Bible nke dịgidere ruo mgbe omenala nke a bilitere? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe odide ahụ ga-amaliteworị ịdọkasị n’ihi iji ya eme ihe ruo ogologo oge, a gaara eliwokwarị ya eli.
Ihe Ndị Mere n’Akụkọ Ihe Mere Eme
N’ịtụle ihe pụrụ imeworị ihe odide ndị mbụ nke Bible, ihe ikpeazụ e kwesịrị icheta bụ akụkọ ihe mere eme nke ọgba aghara nke e nwere n’ala ndị ahụ a kọrọ akụkọ ha na Bible. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere akwụkwọ ndị ahụ agadi nwoke ahụ bụ Moses dere. A gwara anyị, sị: “O ruo, mgbe Moses debisịrị okwu nile nke iwu a n’akwụkwọ, ruo mgbe e dezuru ha, na Moses nyere ndị Livai, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Jehova, iwu, sị, Were akwụkwọ iwu a, tinye ya n’akụkụ igbe ọgbụgba ndụ Jehova, bụ́ Chineke unu.”—Deuterọnọmi 31:24-26.
Igbe ọgbụgba ndụ ahụ bụ igbe dị nsọ nke sere onyinyo ọnụnọ Chineke n’etiti ndị Israel. E buuru ya gaa n’Ala Nkwa ahụ (ya na ihe ndị ahụ Moses dere), bụ́ ebe e debere ya n’ebe dị iche iche. Ruo ogologo oge ụfọdụ, ndị Filistia buuru ya. Mgbe e mesịrị, eze Israel bụ Devid weghachiri Igbe ahu na Jerusalem, e mesịakwa dọba ya n’ụlọ nsọ ahụ nke Eze Solomọn wuru n’ebe ahụ. Ma Eze Ehaz wuru ebe ịchụaja nke ndị na-ekpere arụsị n’ime ụlọ nsọ ahụ ma mesịa mechie ya. Eze Manase ji ikpere arụsị mejupụta ya.
N’oge a nile, gịnị mere igbe ọgbụgba ndụ ahụ nakwa ihe ndị ahụ Moses dere? Anyị amaghị, ma, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ha furu efu. N’oge Eze Josaịa, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ hụrụ “akwụkwọ iwu ahụ” na mberede, nke pụrụ ịbụworị akwụkwọ ahụ nke Moses dere n’onwe ya. (2 Ndị Eze 22:8) Eze ahụ amaghị akụkụ dị ukwuu n’ihe dị na ya tupu mgbe ahụ, ọgụgụ ya wetakwara oké ntụteghachi nke ime mmụọ.—2 Ndị Eze 22:11-23:3.
Mgbe ọnwụ Josaịa gasịrị, ndị Juda dabakwara n’ekwesịghị ntụkwasị obi ọzọ, e mesịakwa chịkọrọ ha laa Babilọn. E bibiri ụlọ nsọ ahụ, e bukọrọkwara ihe nile bara uru dị na ya gaa Babilọn. E nweghị ihe ndekọ ọ bụla banyere ihe mere Igbe ahụ n’oge ahụ ma ọ bụkwanụ ihe odide ahụ bara uru nke a chọtara n’oge Josaịa. Otú ọ dị, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, mgbe a na-agba ọtụtụ ndị Juu ndị lọghachiworo n’ala nke aka ha ume iwughachi Jerusalem ma guzobeghachi ofufe dị ọcha, onye nchụaja bụ Ezra na ndị ọzọ gụpụtaara ha ihe n’ihu ọha site ‘n’akwụkwọ iwu Moses.’ (Nehemaịa 8:1-8) Ya mere, e nwere ndepụta ndị ọzọ nke ihe odide ndị mbụ ahụ. Olee ebe ha sitere?
Idepụta Okwu Chineke
Moses buru amụma banyere oge mgbe onyeeze ga na-achị Israel, wee dee iwu nke a pụrụ iche: “Mgbe ọ na-anọkwasị n’ocheeze nke alaeze ya, na ọ ga-edepụtara onwe ya iwu a n’akwụkwọ, site n’akwụkwọ ahụ nke dị n’ihu ndị nchụaja, bụ́ ndị Livaị.” (Deuterọnọmi 17:18) Ya bụ na a gaje ime ndepụta ụfọdụ nke Akwụkwọ nsọ.
Idepụta Akwụkwọ nsọ mesịrị ghọọ ọrụ e ji mara ndị mmadụ n’Israel. N’eziokwu, Abụ Ọma 45:1 [NW] na-asị “Ka ire m bụrụ mkpịsị akwụkwọ nke onyeọkà n’idepụta ihe.” A kpọtụrụ aha ndị odeakwụkwọ dị ka Shefan na Zedọk. Ma onye a kasị mara amara ná ndị ndepụta ihe nke oge ochie bụ Ezra, onye nwekwara ihe odide Bible ndị mbụ o dere n’onwe ya. (Ezra 7:6; Nehemaịa 13:13; Jeremaịa 36:10) Ọbụna mgbe a nọ na-ede akụkụ ndị ikpeazụ nke Bible, a nọ na-edepụta akwụkwọ ndị ahụ e dezuworo edezu, na-ekesakwa ha.
Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’elu ala, e nwere ndepụta dị iche iche nke Akwụkwọ nsọ ndị Hibru (Jenesis ruo Malakaị), ọ bụghị nanị na Jerusalem, kamakwa ihe àmà gosiri na ha dịkwa n’ụlọ nzukọ ndị dị na Galili. (Luk 4: 16, 17) Ee, n’ebe dị anya, bụ́ Beria nke dị na Masedọnia, ndị Juu ndị nwere ezi uche nwere ike ‘inyocha Akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị’! (Ọrụ 17:11) Taa, e nwere ihe dị ka 1,700 ndepụta ihe odide nke akwụkwọ Bible dị iche iche ndị e dere tupu a mụọ Kraịst nakwa ihe dị ka 4,600 nke ndị ndị na-eso ụzọ ya chịkọtara (Matiu ruo Mkpughe).
Ndepụta ndị ahụ hà ziri ezi? Ee, ha ziri nnọọ ezi. Ndị ọkà n’idepụta Akwụkwọ nsọ Hibru (ndị a na-akpọ Sopherim) na-elezi anya nke ukwuu iji zere ndehie ihe. Iji lezie ihe odide ha anya nke ọma, ha gụrụ mkpụrụ okwu ole na ọbụna mkpụrụ akwụkwọ ole dị n’ihe odide nke ọ bụla ha na-edepụta. Ya mere, Jisọs, Pọl onyeozi, na ndị ọzọ, ndị hotakarịrị okwu site n’ihe ndị so dee Bible n’oge ochie dere, enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere izi ezi nke ndepụta ndị ha ji mee ihe.—Luk 4:16-21; Ọrụ 17:1-3.
Ọ bụ eziokwu na ndị odeakwụkwọ bụ ndị Juu na ndị Kraịst na-edepụta ihe mgbe oge ụfọdụ gasịrị abụghị ndị na-apụghị imehie emehie. Ndehie ihe ụfọdụ batara, ma ọtụtụ n’ime ndepụta ndị ahụ ka dị adị na-enyere anyị aka ịchọpụta ndehie ihe ndị ahụ. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ee, ndị ndepụta ihe dị iche iche mere ndehie ihe dị iche iche. Ya mere, site n’iji ihe odide nke ndị ndepụta ihe dị iche iche tụnyere ibe ha, anyị pụrụ ịchọpụta ọtụtụ n’ime ndehie ihe ndị ha mere.
Ihe Mere Anyị Pụrụ Iji Nwee Obi Ike
Na 1947 e mere nchọpụta mberede nke akwụkwọ mpịakọta oge ochie ụfọdụ n’ime ọgba nkume ndị dị nso Osimiri Nnú ahụ. Akwụkwọ mpịakọta ndị a gosịri otú ndepụta nke Akwụkwọ nsọ siworo bụrụ nke e meziri emezi. Otu n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ bụ ndepụta nke akwụkwọ Bible bụ Aịsaịa nke ji ihe dị ka otu puku afọ buru ihe odide ọ bụla ọzọ e nwere tupu mgbe ahụ ụzọ. Ma ntụle e mere gosiri na nanị ndịrịta iche e nwere n’etiti akwụkwọ mpịakọta Osimiri Nnú ahụ na ihe odide ndị katụ ọhụrụ bụ n’ihe ndị dị ka nhazi okwu na ụtọ asụsụ. Isi ihe dị n’ihe odide ahụ agbanwebeghị n’ihe karịrị otu puku afọ nke ndepụtaghachi! N’ihe banyere ihe odide nke Akwụkwọ nsọ Hibru, onyeọkà mmụta bụ William Henry Green pụrụ ikwu n’ihi nke a, sị: “A pụrụ nnọọ ikwu n’enweghị ihe ize ndụ ọ bụla na ọ dịghị ihe odide oge ochie ọ bụla ọzọ e depụtaworo n’ụzọ ziri ezi dị ka nke a.” E kwuwokwa okwu ndị yiri nke a banyere izi ezi nke ndepụta nke Akwụkwọ nsọ Grik nke ndị Kraịst.
N’eziokwu, ọ ga-abụ ihe oké mkpali ịhụ ihe odide ndị ahụ Moses ma ọ bụ Aịsaịa ji aka ha dee. Ma ọ dịghị anyị mkpa n’ezie inweta ndị mbụ ahụ. Ihe dị mkpa abụghị akwụkwọ ahụ n’onwe ha, kama ọ bụ ihe dị n’ime ha. N’ụzọ ọrụ ebube, n’agbanyeghị ngabiga nke ọtụtụ narị afọ nke ọgba aghara nakwa ọtụtụ ndepụta na ndepụtaghachi, anyị pụkwara inwe obi ike na Bible ka nwekwara ihe dị n’ihe odide mbụ oge ochie ndị ahụ. Ya mere, okwu nke a dị n’Akwụkwọ nsọ abụrụwo eziokwu: “Anụ ahụ nile dị ka ahịhịa, ebube ya nile dịkwa ka ụzarị ahịhịa. Ahịhịa akpọnwụwo, ụzarị ya adapụwokwa: ma okwu [Jehova, NW] na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Pita 1:24, 25.